Ọgbakọ Zuru ọha
N’eli Ngwa agha Anyị nke Nnupụ isi Anyị
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


13:11

N’eli Ngwa agha Anyị nke Nnupụ isi Anyị

Ka anyị lie—nke ukwuu, nime ime—akụkụ ọ bụla nke nnupụ isi megide Chineke na ndụ anyị niile ma dochie ya jiri obi dị njikere na uche dị njikere.

Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ dekọtara na ihe dịka afọ 90 tupu amụọ Kraịst, ụmụ ndị nwoke nke Eze Mosaia malitere ihe ga-abụ ozi ruru afọ 14 nye ndị Leman. E mewo mgbalị na-enweghị mmeta n’ọtụtụ ọgbọ iweta ndị Leman ka ha kwere na ozizi nke Kraịst. N’oge a, otu ọ dị, site na ntinye aka dị ebube nke Mmụọ Nsọ, ọtụtụ puku ndị Leman gbanwere ma ghọọ ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst.

Anyị na-agụ, “Ma dịka ọ bụ ihe mere eme na Onye-nwe na-adị ndụ, otu a ka ọtụtụ kwere na ọbụ ihe mere eme, ma-ọbụ ka ha ra bụ ndị e wetara n’ọmụma nke ezi-okwu ahụ, site n’ikwusa okwu nke Amọn na ụmụnne ya nwoke, dịka mụọ nke mkpughe na nke ibu amụma, na ike nke Chineke na-arụ ọrụ ebube nile n’ime ha—e, asị m unu, dịka Onye-nwe na-adị ndụ, ka ha ra bụ ndị Leman kwere na nkwusa okwu ha, ma agbanwere ha nye Onye-nwe anyị, enweghị mgbe ha dapụrụ ọzọ.”

Ọtụghe ahụ butere mgbanwe nọgidere nke ndị a bụ ihe ekwuru n’ime amaokwu na-abịa: “N’ihi na ha ghọrọ ndị ezi-omume; ha tọgbọrọ ngwa-ọgụ nile nke nnupụ-isi ha, nke mere na ha alụghị kwa ọgụ megide Chineke ọzọ, ọbụghị ma-ọbụ megide ụmụnne ha nwoke ọbụla.”

Ntụ aka a banyere “ngwa agha nke nnupụ isi” bụ ma nke mere eme ma bụrụkwa ihe ịma-atụ. Ọ pụtara na mma agha ha niile na ngwa agha ndị ọzọ nke agha makwa nnupụ isi ha nye Chineke na iwu Ya niile.

Eze ahụ nke ndị Leman atọghatara atọghata kwupụtara ya otu a: “Ma ugbua lee, ụmụnne m nwoke, … ebe ọ bụworo ihe nile nke anyị nwere ike ime … ichegharị site na mmehie nile anyị na ọtụtụ igbu-mmadụ nile nke anyị meworo, na ịrịọ Chineke ka o wepụ ha site n’obi anyị nile, n’ihi na o bụụrụ ihe nile anyị nwere ike ime ichegharị nke zuru-oke n’iru Chineke ka o wee bupụrụ anyị ntụpọ anyị.”

Hụba ama okwu eze ahụ—ọ bụghị naanị na mgbaghara nke mmehie ha niile, kama Chineke wepụrụkwa ntụpọ nke mmehie ndị ahụ na ọbụna ọchịchọ nke ime mmehie n’obi ha. Dị ka ị maara, kama ịlaghachi n’ọnọdụ ọ bụla nke nnupụ isi megide Chineke, ha liri mma agha ha niile. Ma ka ha na-eji obi gbanwere eli ngwa agha ha niile, ha na-elikwa ọchịchọ ha ime mmehie.

Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị ihe anyị nwere ike ime iji gbasoo ụkpụrụ a, ị “tọgbọ ngwa agha niile nke nnupụ isi [anyị,]” ihe ọ bụla ha nwere ike bụrụ, wee ghọọ “ndị chegharịrị echegharị nye Onyenwe anyị” nke na a na-ewepụ ntụpọ nke mmehie na ọchịchọ maka mmehie n’obi anyị ma ọ dịghị mgbe anyị ga-anwa ịdapụ.

Nnupụ isi nwere ike na-arụ ọrụ ma ọ bụ na-agafe agafe. Ihe ịma-atụ doro anya nke nnupụ isi bụ Lucifa, onye, n’ime ụwa tupu ndụ anụ ahụ megidere atụmatụ mgbapụta nke Nna ma kpọkọta ndị ọzọ imegidekwa ya, “ma, n’ụbọchị ahụ ọtụtụ mmadụ soya n’azụ.” O sighị ike ịghọta mmetụta nnupụ isi ya nọgidere na-enwe n’oge anyị .

Akwụkwọ nke Mọmọn wepụtara ndị atọ n’adịghị nsọ na-emegide Kraịst—Sherem, Nehọ, na Kọrịhọ—na-enye ọmụmụ ihe nke nnupụ isi megide Chineke. Isi nkuzi nke Nehọ na Kọrịhọ bụ na e nweghị mmehie; ya mere, ọ dịghị mkpa maka nchegharị, ma enweghị Onye Nzọpụta. “Onye ọbụla n’aga n’ihu dịka amamihe ya si dị, ma … na onye ọbụla na-emeri dịka ike ya ha; ma ihe ọbụla mmadụ [mere] abụghị mmebi iwu.” Onye na-emegide Kraịst na-ajụ ikikere okpukpere chi, na-akọwapụta emume nsọ na ọgbụgba ndụ niile dịka ihe omume niile “ededaworo site na ndị nchụ-aja mgbe ochie, ịpụrụ ike na ikike n’aka ha.”

William W. Phelps

Ọmụmaatụ nke ụbọchị ikpeazụ nke nnupụ isi akpachara anya mee nwere njedebe obi ụtọ karịa bụ akụkọ nke William W. Phelps. Phelps sonyere Nzukọ nsọ n’afọ 1831 ma a họpụtara ya ịbụ onye mbipụta akwụkwọ Nzukọ nsọ. O deziri ọtụtụ akwụkwọ mbụ nke Nzukọ nsọ, dee ọtụtụ ukwe, ma jee ozi dịka ode-akwụkwọ nye Josef Smith. N’ụzọ dị mwute, ọ tụgharịrị megide Nzukọ nsọ na Onye amụma, ọbụna ruo n’oke nke ịgba-ama ụgha megide Josef Smith n’ụlọ ikpe Missouri, nke nyere aka n’ịtụ Onye amụma mkpọrọ ebe ahụ.

Mgbe emechara, Phelps dere akwụkwọ nye Josef n’arịọ maka mgbaghara. “A mara m ọnọdụ m, ị maara ya, ma a chọrọ m ka azọpụta m ọbụrụ na ndị enyi m ga-enyere m aka.”

Na nzaghachị ya Onye amụma ahụ kwuru: “Ọ bụ eziokwu na anyị atawo nnukwu ahụhụ n’ihi omume gị. … Otu o sila dị, a ńụọla iko ahụ, uche nke Nna anyị nke Eluigwe ka emeworo ma anyị ka dị ndụ. Bịa, ezigbo nwanne, ebe agha agaala, n’ihi na ndị enyi na mbụ bụ enyi ọzọ n’ikpeazụ.”

Site n’ezi nchegharị, William Phelps liri “ngwa agha niile nke nnupụ isi,” ya, ma anabatara ya ọzọ na mmekọ zuru oke, ma adaghịkwa ada ọzọ.

Otu ọ dị ụdị nnupụ isi dị aghụghọ karịa bụ nnupụ isi megide Chineke, ka o sila dị , bụ nke a eji wayọ eme—ileghara uche Ya anya n’ime ndụ anyị niile. Ọtụtụ ndị na-agaghị echetụ echiche inupụ isi siri ike nwekwara ike imegide uche na okwu Chineke site na-ịgbaso ụzọ nke ha n’agbanyeghị nduzi Chineke. E chetara m egwu e mere ka amara amara ọtụtụ afọ gara aga site n’aka onye na-agụ egwu Frank Sinatra jiri ahịrị, “E mere m ya n’ụzọ m.” N’ezie na ndụ enwere ọtụtụ ohere maka mmasị onwe onye na nhọrọ nke onye ọ bụla, mana a bịa n’ihe gbasara nzọpụta na ndụ ebighị ebi, abụ isiokwu anyị kwesịrị ịbụ na, “e mere ya n’ụzọ nke Chineke,” n’ihi na n’ezie ọ dịghị ụzọ ọzọ.

Were, ihe ịma-atụ nke Onye Nzọpụta gbasara baptizim. O mere baptizim dị ka ihe ama nke iguzosi ike n’ihe nye Nna ahụ n’akwa dị ka ihe nlereanya nye anyị:

“O gosịrị ụmụ nke mmadụ na, dịka n’anụ arụ ọ na-eme onwe ya umeala n’iru Nna ya, ma gbaara Nna ya aka-ebe na ọ ga-erubere ya isi n’idebe iwu-nsọ ya nile. …

“Ma o wee gwa ụmụ nke mmadụ: Soro nụ m. Ya mere, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, anyị nwere ike iso Jizọs ma ọbụghị na anyị ga-enwe mmasị idebe iwu-nsọ nile nke Nna?”

E nweghị “ụzọ m” ọbụrụ na anyị ga-esoro ịmaatụ nke Kraịst. Ịgbalị ịchọta ụzọ dị iche nye eluigwe dị ka ihe efu nke ịrụ ọrụ n’Ụlọ Elu Bebel kama ịlekwasị anya na Kraịst na nzọpụta Ya.

Mma agha niile na ngwa ọgụ ndị ọzọ nke ndị Leman atọghatara liri bụ ngwa agha nke nnupụ isi n’ihi otu ha siri jiri ha mee ihe. Ụdị ngwa agha ndị ahụ dị n’aka ụmụ ha, bụ ndị e ji echebe ezinaụlọ na nnwere onwe, abụghị ngwa agha nke nnupụ isi megide Chineke ma ọlị. Otu ahụ ka ọ dịkwa n’ụdị ngwa-agha dị n’aka ndị Nifaị: “Ha anaghị alụ ọgụ maka ọchịchị-eze ma-ọbụ ike, kama … na-alụ ọgụ maka ebe obibi ha na ntọhapụ ha niile, ndị nwunye ha na ụmụ ha, na ihe ha nile, e, maka usoro nke okpukpe-chi na nzukọ-nsọ ha.”

N’otu aka ahụ, e nwere ihe ndị na ndụ anyị nwere ike ịbụ nnọpụiche ma ọ bụ ọbụna dị ma ma ndị e ji mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na-aghọ “ngwa agha nke nnupụ isi.” Okwu anyị, dị ka ịmaatụ, nwere ike ibuli elu ma ọ bụ weda ala. Dị ka Jemis kwuru:

“Ma ire ahụ [ọ dị ka] ọ dịghị onye ọ bụla puru ijide ya, ọ bụ ajọ ihe n’adịghị eguzosi ike, juputara na nsi.

“N’ebe ahụ ka anyị ji gozie Chineke, ọbụna Nna, ma n’ebe ahụ ka anyị ji obubu ọnụ, ndị e mere n’oyiyi nke Chineke.

“N’otu ọnụ ka ngọzi na nkọcha si apụta. Ụmụnna m, ihe ndị a ekwesịghị ịdị otu ahụ.”

E nwere ọtụtụ ihe a na-ekwu n’ihu ọha na nke onwe onye taa bụ ndị na-akpa agwa ọjọọ na nke na-adịghị mma. E nwere ọtụtụ mkparịta ụka rụrụ arụ na nke jọrọnjọ, ọbụna n’etiti ndị ntoroọbịa. Ụdị okwu a bụ “ngwa agha nke nnupụ isi” megide Chineke, “jupụtara na nsi.”

Tulee ihe ịmaatụ ọzọ nke ihe dị mma n’ezie mana nke a pụrụ ime ka ọ bụrụ nnupụ isi megide ntụziaka niile Chineke—ọrụ nke mmadụ. Mmadụ pụrụ inweta ezi afọ ojuju n’ọrụ, ọrụ-aka, ma ọ bụ ije ozi, ma anyị niile na-eritekwa uru site n’ihe ndị ji obi ha niile na ndị nwere nka n’ọtụtụ akụkụ nke ọrụ rụzuworo ma mepụta.

N’agbanyeghị, ọ ga-ekwe omume na nraranye nye ọrụ aka nwere ike ịghọ ihe kacha mkpa na ndụ mmadụ. Mgbe ahụ ihe ndị ọzọ niile ga-abụ nke abụọ, gụnye oge na akaraka ọ bụla Onye Nzọpụta ga-achọ n’aka onye ahụ. Maka ndị nwoke, na ndị nwanyị kwa, ị hapụ ohere niile ziri ezi maka alụmdi na nwunye, ịghara ịrapara na ibuli di ma ọ bụ nwunye, ịghara ịzụ ụmụ nke mmadụ, ma ọ bụ ọbụna ịkpachapụrụ anya gbanarị ngọzi na oke n’ọrụ nke ịzụ nwa naanị n’ihi ọganihu ọrụ aka nwere ike ime ka ihe a rụpụtara dị mma aghọọ ụdị nke nnupụ isi.

Ihe ịmaatụ ọzọ gbasara anụ ahụ anyị. Pọl na-echetara anyị na anyị ga-enye Chineke otuto n’anụ ahụ ma na mmụọ ma na anụ ahụ nke a bụ tempụl nke Mmụọ Nsọ, “nke unu nwere site na Chineke, ma unu abụghị nke onwe unu.” Ya mere, anyị nwere mmasị ziri ezi n’iwepụta oge ilekọta anụ ahụ anyị dịka ike anyị nwere ike. Ole na ole n’ime anyị ga-eru n’ọkwa elu nke arụmọrụ anyị hụrụ na nso nso a na mmezu niile nke ndị egwuregwu Olympic na Paralympic, na ụfọdụ n’ime anyị ebidowo kawa nka, ma ọ bụ ihe Onyeisi M. Russell Ballard kpọrọ “rivets ahụ na-apụta.”

Ka o sina dị, e kwere m na ọ na-amasị Onye Okike anyị mgbe anyị na-eme ike anyị niile ilekọta onyinye ịtụnaanya Ya nke anụ ahụ. Ọ ga-abụ akara nnupụ isi mmadụ imerụ ahụ ya, ma ọ bụ metọọ ya, ma ọ bụ ghara ime ihe mmadụ nwere ike ime iji bie ndụ dị mma. N’otu oge ahụ, ihe efu na mmadụ ime ka ahụ ya, ọdịdị ya, ma ọ bụ uwe ya rie ya isi nwere ike ịbụ ụdị nnupụisi n’akụkụ nke ọzọ, na-eduga mmadụ ifee onyinye nke Chineke ofufe kama Chineke.

N’ikpeazụ, ili ngwa agha anyị niile nke nnupụ isi megide Chineke pụtara naanị ikwenye nkwalite nke Mmụọ Nsọ, wepụ ịbụ mmadụ nke anụ arụ ma ghọọ “onye nsọ site na aja mgbaghara mmehie nke Kraịst bụ Onyenwe anyị.” Ọ pụtara idebe iwu nsọ nke mbụ ahụ ka ọ bụrụ nke mbụ n’ime ndụ anyị niile. Ọ pụtara ikwe ka Chineke merie. Ọ bụrụ na ịhụnaanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na mkpebi anyị mere iji ike anyị niile, uche anyị, na ume anyị niile na-ejere Ya ozi ga-aghọ ihe nlereanya anyị ji ekpe ihe niile ikpe ma na-eme mkpebi anyị niile, anyị eliwo ngwa agha niile nke Nnupụ isi anyị. Site na amara nke Kraịst, Chineke ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile na nnupụ isi niile nke gara aga ma wepụ ntụpọ nke mmehie ndị ahụ na nnupụ isi niile site na obi anyị niile. Ka oge na-aga, Ọ ga-ewepụkwa ọchịchọ ọ bụla nke ihe ọjọọ, dị ka O mere ndị Leman ahụ atọghatara n’oge gara aga. Mgbe nke ahụ gasịrị, anyị onwe anyị kwa “[a] gaghị adapụ.”

Ili ngwa agha niile nke nnupụ isi anyị na-eduga n’ọńụ pụrụ iche. Anyị na ndị niile atọghatara na mbụ nye Onyenwe, anyị ka a ga-akpọta “ikwee [ukwe nke] ịhụnaanya mgbapụta.” Nna anyị nke Eluigwe na Ọkpara Ya, Onye Mgbapụta anyị, akwadola nkwa Ha na-enweghị ike ịgbanwe maka obi ụtọ anyị kacha site n’ịchụ-aja na ịhụn’anya dị omimi. Anyị na-ahụ ịhụnaanya Ha kwa ụbọchị. N’ezie anyị nwere ike iji ịhụnaanya na iguzosi ike n’ihe kwụghachi ụgwọ. Ka anyị lie—nime, ime ala—akụkụ ọ bụla nke nnupụ isi megide Chineke na ndụ anyị niile ma dochie ya jiri obi dị njikere na uche dị njikere. Na aha nke Jizọs Kraịst, amen.