Ọgbakọ Zuru ọha
Jiri Obi Gị Niile Chọọ Ya
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


Jiri Obi Gị Niile Chọọ Ya

Ọ bụrụ na Jizọs Kraịst chọrọ oge dị jụụ iji kwuoro Chineke okwu ma nata mgba ume site n’aka Ya, ọ ga-abụ amamiihe maka anyị imekwa otu ahụ.

Afọ ole na ole gara aga, mụ na nwunye m jere ozi dị ka ndị ndu mgbasa ozi na Tokyo Japan. N’oge otu nleta na mishọn site n’aka mgbe ahụ ọ bụ Okenye Russell M. Nelson, otu niime ndị mgbasa ozi ọma jụrụ ya otu kacha mma iji zaghachi mgbe mmadụ gwara ha na ha agaghị ege ha ntị niihi ha ji ọtụtụ ihe n’aka. N’ichetụ ntakịrị, Okenye Nelson kwuru: “Aga m ajụ ọ bụ na ha anaghị eri nri ehihie ahụ nihi ha ji ọtụtụ ihe n’aka n’ụbọchị; ma mgbe ahụ kuziere ha na ha nwere anụ ahụ na mmụọ, ma otu ahụkwa anụ ahụ ha ga-esi anwụ ma ọ bụrụ na ọ nwetaghị ọzụzụ, otu ahụkwa ka mmụọ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ nataghị ọzụzụ site n’okwu dị ọma nke Chineke.

Ọ bụ ihe ndọrọ mmasị ị mata na mkpụrụokwu asụsụ Japan maka “iji ọtụtụ ihe n’aka,” isogashii, nwere mkpụrụ edemede nwere akara abụọ (). Nke nọ n’aka ekpe pụtara “obi” ma ọ bụ “mmụọ” ma nke nọ n’aka nri pụtara “ọnwụ”—na-atụ aro ikekwe, dị ka Onyeisi Nelson Kuziri, na iji ọtụtụ ihe n’aka ma ghara ịzụ mmụọ anyị nwere ike ịduru anyị anwụọ nime mmụọ.

Onyenwe anyị maara—niime ụwa nke a na-gba ọsọ ọsọ, nke jupụtara na ọtụtụ ndọpụ uche na ọgbaghara—na ịwepụtara Ya oge zuru oke ga-abụ otu niime ihe ịma aka n’ụbọchị anyị. Mgbe ọ na-ekwu site na onye amụma Aịzaya, O kwuru okwu ndụmọdụ na nke ịdọ aka na ntị ndịa, nke e nwere ike ịtụnyere ụwa ọgbaghara nke anyị bi niime ya:

“Niime nlaghachi na izu ike ka a ga-azọputa unu; ma niime inọ jụụ na niime obisiike ka ume unu ga-adi: ma unu ekweghị.

“Mana unu siri, Mba; n’ihi n’elu ịnyịnya ka anyị ga-anọkwasi wee gbalaga; n’ihi nke a unu agbalaga: na, Anụ di ngwa ngwa ka anyi ga-anọkwasi; n’ihi nke a ka ndi na-achu unu ga-adi ngwa ngwa.”

N’okwu ọnụ dị iche, na-agbanyeghị na nzọpụta anyị dabeere n’elu nlaghachi ruo ebe Ọ nọ mgbe ụfọdụ ma izu ike site na nchekasị nke ụwa, anyị anaghị. Ma na-agbanyeghi na obisiike anyi ga-abịa site n’ume ewulitere n’oge ndị dị jụụ mgbe anyị nọdụrụ ala anyị na Onyenwe anyị na ntulegharị uche na mkpọla uche azụ, anya anaghị. Gịnị kpatara nke a? Nihi anyị sịrị, “Mba, anyị ji ọtụtụ ihe ndị ọzọ n’aka—wee gbalaga n’elu ịnyịnya anyị, ma ekwuo otu ahụ. Nihi nke a, anyị ga-agate aka ma gatekwuo aka n’ebe Chineke nọ; anyị ga-esi ọnwụ ịga ọsọ ọsọ ọsọ ọsọ, ma ka anyị na-aga ọsọ ọsọ, ka Setan na-agakwu ọsọ ọsọ na-ịchụso anyị.

Ikekwe ọ bụ ya kpatara Onyeisi Nelson jiri na-arịọ anyị ugboro ugboro ka anyị wepụtara Onyenwe anyị oge nime ndụ anyị—”ụbọchị ọbụla na ụbọchị niile.” Ọ na-echetara anyị na “oge dị jụụ bụ oge dị nsọ—oge nke ga-arọpụta mkpughe nke onwe ma kụnye udo.” Mana iji nụrụ olu ahụ dị jụụ nke Onyenwe anyị, ọ nyere ndụmọdụ, “gị onwe gị ga-adịrịrị jụụ.”

Ị dị jụụ, kosiladị, na-achọ karịa naanị ịwepụtara Onyenwe anyị oge—ọ na-achọ ịhapụ obi abụọ na echiche ụjọọ anyị niile ma debechaa obi na uche anyị na Ya. Okenye David A. Bednar kuziri, “Ndụmọdụ ahụ Onyenwe anyị nyere sị ‘dere duu’ pụtara ihe dị mkpa karịa naanị ekwughị okwu ma ọ bụ emegharịghị ahụ.” “Idere duu,” ọ tụrụ arọ, “nwere ike ịbụ ụzọ eji echetara anyị ka anyị lekwasị anya na Onye Nzọpụta esepụghị aka.”

Ị nọ jụụ bụ omume nke okwukwe ma ọ na-achọ mgbalị. Nkuzi niile banyere Okwukwe kwuru, “Mgbe mmadụ jiri okwukwe na-arụ ọrụ ọ na-arụ ọrụ jiri ume nke ụbụrụ isi.” Onyeisi Nelson kwupụtara: “Ebe nlekwasi anya anyị ga-esịrịrị ike niime Onye nzọpụta na ozi ọma Ya. Ọ bụ ihe na-ara ụbụrụ isi ahụ ịgbalị ilekwasị Ya anya n’uche niile. Mana mgbe anyị mere, obi abụọ anyị na ụjọ niile agbafụọ.” Mgbe ọ na-ekwu maka mkpa ọ dị ịlekwasị anya n’uche anyị, Onyeisi David O. McKay kwuru: “Echere m na anyị na-etinye obere uche n’ebe uru dị nime ntụgharị uche, nke bụ otu ụkpụrụ nke nraranye. … Ntụgharị uche bụ otu niime … ụzọ kacha dị nsọ site na ya anyị na-agafe banye n’ihu Onyenwe anyị.”

Enwere otu mkpụrụokwu na asụsụ Japan, muina nghọta nke m, kọwara nke ọma ihe ọ pụtara ị nọ jụụ. Ọ nwere mkpụrụ akara abụọ (無為). Nke nọ aka ekpe pụtara “enweghi” ma ọ bụ “enweghi ihe ọbụla,” ma nke ahụ nọ n’aka nri pụtara “ị me.” Etikọta ha ọnụ ha pụtara “anaghị-eme.” Ewere ya otu ahụ ọ dị, enwere ike ịtụgharị okwu ahụ n’ụzọ na-ezighị ezi ka ọ bụrụ “emeghi ihe ọbụla” n’otu ụzọ ahụ enwere ike itụgharị “ị dere jụụ” n’ụzọ na-ezighi ezi dị ka ọ bụ “ekwughị okwu ma ọ bụ emegharịghị ahụ.” Kosiladị, dị ka nkebiokwu “idere jụụ,” ọ nwere nkọwa kacha dị elu; maka m ọ bụ ihe ncheta ijiri nwayọọ bie ndụ nwere nnukwu ọmụma ihe nke ime mmụọ.

Mgbe m na-eje ozi N’otu Ndịịisi Mpaghara Ashịa North mụ na Okenye Takashi Wada, A mụtara m na nwunye ya, Nwanne nwanyị Naomi Wada, bụ ọka mmụta na-ide mkpụrụ akara asụsụ Japan. A jụrụ m Nwanne nwanyị Wada ma ọ nwere ike ịsere m mkpụrụ akara asụsụ Japan maka mkpụrụokwu mui. Ọ bụ ebumnobi m ị kowe akara ahụ n’ahụ mgbidi m dị ka ihe ncheta i dere jụụ ma ịlekwasị anya na Onye Nzọpụta. Ọ tụrụ m naanya na ọ kweghị mgbe ahụ ị mere mụ arịrịọ nke a dị ka ọ dị mfe.

N’ụbọchị nke na-esote, mgbe ọ matara na enwere ike aghọtaghịm ihe mere nwunye ya jiri gbutu oge, Okenye Wada kọwara na ịde akara ndị ahụ na-ewe mgbalị dị ukwuu. Ọ gaadị mkpa na nwunye ya ga-atule uche banyere ụkpụrụ ahụ ya na akara ndị ahụ tutu ya aghọta ihe ọ pụtara nime ime mkpụrụ obi ya ma ka ọ nwee ike nye echiche ndịa si n’obi ngosipụta pụrụiche dị ka o na-eji mkpịsị osise ya na-ese ha. Ihere mere mụ na ejiri m nkịtị rịọ ya ka ọ mee ihe ga-ewere ọtụtụ oge ya. A rịọrọ m ya ka ọ sịrị m ya ndo maka amaghị ihe nke m ma ka ọ gwa ya na ana m eweghachi arịrịọ m.

Akara asụsụ Japan n’ebe ụlọ ọrụ Bishọp Budge.

Ị nwere ike iche n’echiche ịtụnaanya na obi ekele m mgbe oge m na-ahapụ Japan, Nwanne nwanyị Wada, na-agwaghị ya agwa, nyere m onyinye ederede mara mma nke mkpụrụ akara asụsụ Japan maka okwu ahụ mui Ugbu a ekowere ya n’ahụ mgbidi nke ụlọ ọrụ m, na-echetaram m ị dere jụụ ma chọọ Onyenwe anyị ụbọchị niile jiri obi m niile, ike m niile, uche m niile, na ume m niile. Site n’omume nke a na-echeghi maka onwe, ọ depụtara nkọwa nke mui, ma ọ bụ idere jụụ, karịa otu okwu ọbụla nwere ike ịmee. Kama na-ejighi uche ya niile see mkpụrụ akara ndị ahụ, ọ rụrụ ọrụ osise caligraphy ya jiri ebumnobi juru eju na nke nwere ezi uche.

N’otu aka ahụ, Chineke chọrọ ka anyị were oge anyị na Ya nwere jiri otu ụdị nraranye ahụ si n’obi. Mgbe anyị mere otu a, ofufe anyị ga-abụrụ ngosipụta ịhụnaanya anyị maka Ya.

Ọ chọrọ ka anyị na Ya kwuo okwu. N’otu oge, mgbe m kpesiworo ekpere mbido n’otu ọgbakọ anyị na ndị NdịIsi Mbụ, Onyeisi Nelson chigharịrị ebe m nọ ma kwuo, “Mgbe ị nọ na-ekpe ekpere, e chere m otu ọ ga-esi amasị Chineke mgbe anyị wepụtara oge site nime ihe niile anyị na-eme iji nakwere Ya.” Ọ bụ ihe ncheta dị mfe ma dị ike maka otu ọ ga-esi abụrụ ihe nye Nna nke Eluigwe mgbe anyị kwụsịtụrụ iji kwuro Ya okwu.

Na-agbanyeghị otu Ọ siri chọọ mmasị anyị, Ọ gaghị amanye anyị ịbịakwute Ya. Nye ndị Nifaị Onyenwe anyị gwara ha sị, “Ugboro ole ka m gaararịị akpọkọta unu dị ka nnekwu ọkụkọ si na-akpọkọta ụmụ ya nile, ma unu ekweghị.” Ọ gara niihu nye ọkpụkpọ okù nke a nwere olileanya nke gbasakwara anyị taa: “Ugboro ole ka m ga-akpọkọta unu dịka nnekwu ọkụkọ si na-akpọkọta ụmụ ya nile n’okpuru nku ya nile, ọbụrụ na unu ga-echegharị ma laghachịkwute m jiri nzube nke obi juru eju.”

Ozi ọma nke Jizọs Kraịst na-enye anyị ọtụtụ ohere ịlaghachikwute Ya mgbe na mgbe. Ohere ndịa gụnyere ekpere kwa ụbọchị, ọmụmụ akwụkwọ nsọ, emume nsọ nke oriri nsọ, Ụbọchị ezumiike na ofufe tempụl. Ọ bụrụkwanụ na anyị ga-ewepụ ohere ndịa dị nsọ site na ndekọ niile n’ihe a ga-eme nke anyị ma tinye ha nime ndekọ niile nke “ihe agaghị eme” nke anyị—ọ pụtara izute ha jiri ụdị obi ahụ na nlekwasị anya ahụ Nwanne nwanyị Wada jiri see ihe osise caligraph ya?

Ị nwere ike na-eche, “enweghi m oge maka nke ahụ.” Mụ onwe m echewokwa otu ahụ mgbe ụfọdụ. Mana ka m tụọrọ unu arọ na ihe aga achọ n’aka anyị abụchaghị karịa oge mana mmata ihe nke na nlekwasị anya na Chineke n’oge niile ahụ anyị wepụtaworịị maka Ya.

N’ọmụmatụ, mgbe a na-ekpe ekpere, ọ bụrụkwanụ na anyị tinye obere oge na-ekwu okwu ma tinye nnukwu oge na-anọnyere Chineke; ma mgbe anyị na-ekwu okwu, eme ya jiri ngosiputa obi ekele na ịhụnaanya karịrị akarị?

Onyeisi Nelson enyewo ndụmọdụ na anyị ekwesighi naanị ịgụ akwụkwọ nsọ kama anyị kwesịrị ịnụ ụtọ ha. Kedụ ndịiche ọ ga-eme ọ bụrụ ma anyị ga-aka anụ ụtọ ha karịa ịgụ ha agụ?

Ọ bụrụ kwanụ na anyị ga aka akwado uche anyị iri oriri nsọ ma jiri obi ụtọ tulee ngọzị niile nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst n’oge emume nsọ nke a?

N’ụbọchị Sabat, nke na asụsụ Hibru pụtara “izu ike,” ọ bụrụ kwanụ na anyị ga-ezu ike site na nchegbu niile nke ụwa ma wepụta oge ịnọdụ jụụ n’ala anyị na Onyenwe anyị iji gosi nrara anyị nye Ya?

N’oge ofufe anyị nke tempụl, ọ bụrụkwanụ, n’anyị ga-aka etinye mgbalị azụrụ azụ iji tinyecha uche anyị ma ọ bụ nọtụ ogologo oge niime ịmeụlọ selestịal n’ọnọdụ ntule uche dị jụụ?

Mgbe nlekwasị anya anyị anọchaghị na-ịme eme kama na-ịgba ume nye njikọ ọgbụgba ndụ anyị na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst karịa, A na m agba ama na oge dị nsọ ndịa ka a ga-amụba, ma anyị ga-anata odudu ahụ achọrọ nime ndụ nke onwe anyị. Anyị, dị ka Martha nime akụkọ dị na Luk, na-adịkarị “mkpachapụ anya ma na-echegbu banyere ọtụtụ ihe.” Kosiladị, dị ka anyị na-ekwuru Onyenwe anyị ụbọchị ọbụla, Ọ ga-enyere anyị aka ịmata nke ahụ kacha dị mkpa.

Ọbụnadị Onye Nzọpụta wepụtara oge site na-ije ozi Ya iji dere duu. Akwụkwọ nsọ juputara na ọmụmaatụ oge Onyenwe anyị bara n’ebe nọ naanị ya, ebe ugwu ukwu, alaịkpa, ọzara ma ọ bụ “ebe dịtụ anya”—ịkpere Nna ekpere. Ọ bụrụ na Jizọs Kraịst chọrọ oge dị jụụ iji kwuoro Chineke okwu ma nata mgbam ume site n’aka Ya, ọ ga-abụ amamiihe maka anyị imekwa otu ahụ.

Dị ka anyị na-etinye obi na uche anyị na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ma gee ntị nye olu nta ahụ dị jụụ nke Mmụọ Nsọ, anyị ga-enwe nnukwu ido anya banyere ihe kacha dị mkpa, wulite ọmịiko miri emi, ma chọta izuike na ume niime Ya. Na mmegiderịta onwe ya, inyere Chineke aka n’ọrụ Ya nke nzọpụta na mbuli elu nwere ike chọọ ka anyị jiri nwayọọ. Ịnọ mgbe niile na ngagharị nwere ike na-agbakwunye ọgbaghara ahụ dị niime ndụ anyị ma pụnara anyị udo ahụ anyị na-achọ.

Ana m agba ama na dị ka anyị na-alaghachikwute Onyenwe anyị mgbe na mgbe jiri ebuumnuche juru eju nke obi, anyị ga-ejiri ịdị jụụna obisiike bịa mara Ya ma nwee mmetụta ịhụnaanya agwụghị agwụ nke O gbara ndụ igosi anyị.

Onyenwe anyị kwere nkwa:

“Bịaruo nụ m nso ma aga M abịaru unu nso; jiri nrụsị ọrụ ike chọọ m ma unu ga-achọta m.”

“Ma unu ga-achọ m, ma chọta m, mgbe unu ga-eji obi unu niile chọọ m.”

Ana m agba ama na nke a bụ eziokwu. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Lee Ita 2:14–15.

  2. Aizaya 30:15–16; okwu doro anya ka agbakwunyere.

  3. 2 Nifaị 10:24 na-akpoku anyị kanyị mee ka uche anyị mee udo anyị na Chineke. “Re” pụtara “ọzọ,” “con” pụtara “yana,” ma “cile” bụ oche ma ọ bụ oche eze. Yamere ịreconcile uche anyị ya na nke Chineke nwere ịpụta ịnọdụ ọzọ anyị na Chineke.

  4. Lee Russell M. Nelson, “Wepụtara Onyenwe anyị Oge,” Liahona, Nov. 2021, 120.

  5. Russell M. Nelson, “Ihe Anyị Na-amụta ma Gaghị Echefu Ma ọlị,” Liahona, Me 2021, 80.

  6. Lee Russell M. Nelson, “Ihe Anyị Na-amụ ma Agaghị Echefu Ma ọlị,” 80.

  7. David A. Bednar, “Dere Duu, ma Mata Na A Bụ M Chineke,” Liahona, Me 2024, 28.

  8. Lee Ndị Hibru 11:6.

  9. Nkuzi nile nke Okwukwe (1985), 72.

  10. Russell M. Nelson, “Ịdọbata Ike nke Jizọs Kraịst nime Ndụ anyị,” Liahona,, Me 2017, 41.

  11. David O. McKay, “Imata Chineke: Ebumnuche Ndụ Kachasị,” Improvement EraJune 1967, 80.

  12. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 4:2.

  13. Lee Mosaia 7:33; Ita 2:14.

  14. “Obi nwere ezi ahụike, nke na-arụ ọrụ dị ezi mkpa maka ahụike na ọdịmma nke onye ọ bụla n’ime anyị. Otú ọ dị, ihe m mụtara dị ka odibo na onye akaebe nke Jizọs Kraịst bụ na obi nke nwere ezi ahụike bụ nanị ọkara nke ihe ịma aka anyị. Ana m eji iwu ahụ kpọrọ ihe nke sị ka anyị jiri obi anyị dum hụ Chineke naanya, n’ihi na ịhụ Ya n’anya bụ ihe na-eme ka anyị na-anụ ọkụ n’obi.” (Russell M. Nelson, Isiokwu nke Okwu ahụ: Ihe Ibi Ndụ Afọ 100 Kụziiri M [2023], 8; okwu doro anya ka agbakwụnyere).

  15. Lee Abụ ọma 14:2; Mkpughe 3:20.

  16. 3 Nifaị 10:5; okwu doro anya ka agbakwụnyere.

  17. Okenye Dale G. Renlund kụziri: “Ịgbanwe omume anyị na ịlaghachi na ụzọ ‘ziri ezi’ bụ akụkụ nke nchegharị, ma ọ bụ naanị akụkụ. Ezi nchegharị na-agụnyekwa ịtụgharị obi na uche anyị gakwuru Chineke na ịjụ mmehie kpam kpam” (“Nchegharị: Otu Nhọrọ Dị Ańụrị,” Liahona, Nov. 2016, 121; okwu doro anya ka agbakwụnyere).

  18. 3 Nifaị 10:6; okwu doro anya ka agbakwụnyere.

  19. Okenye Neal A. Maxwell kụziri, “Mbawanye nnyefechasị abụchaghị ihe a na-achọsi ike maka ọtụtụ awa nke ọrụ Nzukọ nsọ ka ọ bụ maka ịmatakwu onye ọrụ nke a bụ n’ezie!” (“Dozienụ Nke a niime Obi Unu,” Ensign, Nọv. 1992, 67).

  20. Na-ikwu okwu banyere otu ekpere ya siworo malite ka oge na-aga, Desmond Tutu kwuru, sị: “Echere m na [m] na-agbalị ito eto nanị na ị nọ n’ebe ahụ. Dị ka mgbe ị na-anọdụ ala n’ihu ọkụ n’oge winta—ị nọ naanị n’ihu ọkụ ahụ. Ọ dịghị mkpa inwe amamihe ma ọ bụ ihe ọbụla. Ọkụ ahụ na-ekpo gị ọkụ” (“Desmond Tutu, Na-ekwusi ike na E Mere Anyị Maka ịdị mma’” [NPR interview by Renee Montagne, Mar. 11, 2010], npr.org).

  21. Lee Russell M. Nelson, “Chee Selestịal!,” Liahona, Nọv. 2023, 117–19.

  22. Lee Russell M. Nelson, “Ibi Ndụ Site N’ọdudu nke Akwụkwọ nsọ,” Liahona, Jan. 2001, 19–22; lee kwa Russell M. Nelson,, “Aziza ahụ Mgbe niile Bụ Jizọs Kraịst,” Liahona, Me 2023, 127–28.

  23. Lee 3 Nịfaị 17:3. Onyeisi David O. McKay kwupụtara:

    “Ekwenyere m na oge dị mkpirikpi nke ijikwa oriri nsọ bụ otu n’ime ohere kachasị mma anyị nwere maka ntụgharị uche dị otu ahụ, ma ọ dịghịkwa ihe ọ bụla n’ime oge ahụ dị nsọ nke ga-adọpụ uche anyị n’ebumnobi nke emume nsọ ahụ. …

    “A na m arịọsi ike ka e jiri nkwanye ugwu gbachitere emume-nsọ nke a n’usoro zuru oke; ka onye ọ bụla nke na-abịa n’ụlọ Chineke wee tụgharịa uche na ya ma jiri nwayọọ na ekpere kwupụta ekele maka ịdị mma Chineke. … Ka awa oriri nsọ ahụ bụrụ otu nhụmịhe nke ụbọchị nke onye na-efe ofufe na-agbalị ma ọ dịkarịa ala ịghọta n’ime onwe ya na ọ ga-ekwe omume ka ya na Chineke ya kparịta ụka” (“Imata Chineke: Ebumnuche Ndụ Kachasị,” Improvement Era, June 1967, 80–81).

  24. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ nile 59:10.

  25. “Mgbe ọbụla ị jiri rekọmendị tempụl gị, obi dị nchegharị, na uche na-achọ mmụta bịa nime ụlọ ọmụmụ ihe nke Onyenwe anyị, ga-akụziri gị ihe” (Russell M. Nelson, “Tempụl na Ntọala Ime Mmụọ nke Gị,” Liahona, Nov. 2021).

  26. “Ọ ga-ejide gị naka ma duru gị nime ndụ nke onwe gị ma ọ bụrụ ị ga-ewepụtara Ya oge na ndụ gị—ụbọchị ọbụla na nke niile” (Russell M. Nelson, “Wepụtara Onyenwe anyị Oge,” 121).

  27. Lee Luk 10:40–42.

  28. 3 Nifaị 19:19; lee kwa Ntụgharị Josef Smit, Matthew 4:1 (nime Matiu 4:1, hụbaama dị n’ụkwụ a); Matiu 5:1; 14:13, 23; Mak 1:35; 6:46; Luk 5:16; 6:12.

  29. Lee 3 Nifaị 21:29.

  30. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:63.

  31. Jeremaya 29:13; lee kwa Abụ Akwa 3:25.