Aka Ya dị Njikere Ịnyere Anyị Aka
Dị ka anyị na ejiri okwukwe bịarute Ya, Ọ ga-anọya mgbe nille.
Mgbe m bụ nwata, dị ka ezi na ụlọ anyị gara njem ezumike ruo na beach nke coast nke obodo amụrụ m, Chile. Obi tọrọ m ụtọ ị nọ ụbọchị ole n’ole na-ekpori ndụ oge summer ahụ mụ na ezi na ụlọ m. Ọ tọrọ mụ ụtọ nke ukwuu nihi echere m na enwetawo m n’ikpeazụ ohere isonye ma mee ihe ụmụnnem abụọ ndị tọrọ m na-emekarị na mmiri maka obi ụtọ.
Otu ụbọchị, ụmụnnem nwoke jere igwu egwu ebe ebili mmiri na-agbawa, ma ọ dịm ka etoziwom isoro ha. Dị ka m na-aga n’ebe mpaghara ahụ, A matara m na ebili mmiri ahụ dị nnukwu karịa ọtụ ọ dị site na shore ahụ. N’otu ntabianya, otu ebili mmiri bịakwutere m, we buru m na-atụghị anya ya. A hụrụ m otu ike nke eke jiri weghara m ma dọrọ m mikpuo n’ala ala omimi nke oke osimiri ahụ. Enweghi m ike ịhụ ma ọ bụ mata ebe m nọ nihi a nọ na-atụgharị m. Ozugbo ahụ m chere na njem n’ụwa nwere ike ọ bịawo na njedebe, enwetere m mmetụta aka ka ọ na-adọpụta m n’elu. N’ikpeazụ, a hụrụ m anyanwụ ma kutezie ume.
Nwanne m nwoke Claudio ahụworịị mgbalị m na-eme ka aga-asị a bụm onye toro eto ma bịa ịzọpụta m. Anọghị m ebe dị anya site na shore ahụ. Nagbanyeghi na mmiri ahụ emighi emi, amaghịzim ebe m nọ ma amataghị m na m nwere ike ị nyere onwem aka. Claudio gwara m na m kwesịrị ịkpachara anya ma, ọ bụrụ na m chọọ, ọ ga-akụziri m. Nagbanyeghi ite mmiri ole m loworo, mpako na ọchịchọ m ịbụ nwa nwoke toro eto sikwuru ike, ma ekwuru m, “Eeh.”
Claudio gwara m na ekwesịrị m iluso ebili mmiri ahụ agha. A gwara m onwe m na n’ezie a gaghịm enwete mmeri na agha ahụ megide ihe yiri ka nnukwu ahụaja nke mmiri.
Dị ka nnukwu ebili mmiri ọhụrụ na-abịa, Claudio ọsọọsọ kwuru, “Lee m anya; otu a ka esi eme ya.” Claudio gwara ọsọ gbakwuru ebilimmiri ahụ na-abịa ma munye nime ya tupu ya agbawa. Mmunye ya tọrọ m ụtọ nke ukwuu nke mere ahụghị m ebili mmiri nke na-esote. Nihi ya a dọkpuru m ọzọ niime omimi nke oke osimiri ma ike niile nke eke atụgharịa m. Ka sekọnd ole na ole gasịrị, otu aka adọrọ nke m, ma adọpụtara m ọzọ n’elu ka m kute ume. Ire ọkụ nke nganga m na na-emenyụ emenyụ.
N’oge ugbu a, nwanne m nwoke kpọkuru ka m soro ya munye. Nihi ọkpụkpọ oku ya, esooro m ya, ma anyị a munyekọta ọnụ. Ọ dịrị m nnọọ ka emeriwo m otu ịma aka kachasị. N’ezie, ọ dịghị mfe, mana emere m ya, ekele dịrị nwanne m nwoke maka enyemaka na ọmụmatụ nke o gosiri. Aka ya zọpụtara m ugboro abụọ; ọmụmatụ ya gosiri m otu eji emeri ịma aka m ma nwete mmeri n’ụbọchị ahụ.
Onyeisi Russell M. Nelson akpọkuwo anyị k’anyị chee maka selestial, ma a chọrọ m isoro ndụmọdụ ya ma tinye ya niime akụkọ nke summer m.
Ike Onye Nzọpụta megide Onye iro ahụ.
Ọbụrụ na-anyị chee selestịal, anyị ga-aghọta na nime ndụ anyị anyị ga-ezute ịma aka nke yiri ka ọ karịrị ikikere anyị imeri ha. N’oge oge ndụ anụ ahụ anyị, anyị ga-ezuterịrị mbuso agha niile nke onye iro. Dị ka ebili mmiri nke ahụ megidere m n’ụbọchị oge summer ahụ, anyị nwere ike nwee mmetụta adịghị ike ma chọọ ịtọgbọ onwe anyị nye ike ahụ ka anyị. “Ebili mmiri ọjọọ” ndị ahụ nwere ike tụgharịa anyị site n’ebe a ruo n’ebe a. Mana echefukwala onye ji ike imegide ebili mmiri ndị ahụ ma, n’ezie, imegide ihe niile. Nke ahụ bụ Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst. O nwere ike ahụ iji nyere anyị aka pụta n ọnọdụ mnwute ọbụla. Nagbanyeghi ma anyị echere na anyị nọ Ya nso, Ọ ka nwere ike isetịpụ aka rute ebe anyị nọ, otu anyị bụ.
Dị ka anyị na-erute ebe Ọ nọ jiri okwukwe, Ọ ga-anọ ebe ahụ mgbe niile, ma n’oge Ya, Ọ ga-adị njikere ma chọọ ijide aka anyị ma dọpụta anyị n’ebe nwere nchekwa.
Onye Nzọpụta na Ọmụmatụ Ije ozi nlekọta Ya
Ọ bụrụ manyị chee selestịal, anyị ga-amata na Jizọs Kraịst bụ ọmụmatụ ije ozi nlekọta na-enweghi ntụpọ. Enwere usoro edebere anyị nime akwụkwọ nsọ mgbe Ya ma ọ bụ ndị na-eso Ya setịpụra aka ha maka onye nọ na mkpa, chọrọ nzọpụta, ma ọ bụ ngọzi dị ka ha na-esetịpụ aka ha. Dị ka ọ dị na akụkọ ahụ, A maram na nwannem nwoke nọ ebe ahụ, mana ị nọ ebe ahụ maka m ezughi oke. Claudio maara na a nọ m na nsogbu, ma ọ bịara ịnye aka dọpụta m site na mmiri.
Mgbe ụfọdụ, anyị na-eche na nanị ihe dị mkpa bụ ịnọ ebe ahụ maka onye nọ na mkpa, mana ọtụtụ oge enwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmee. Ịnwe nhụnuuche dị ebighị ebi nwere ike ịnyere anyị aka nata mkpughe iji nye ndị ọzọ nọ na mkpa enyemaka dabara n’oge. Anyị nwere ike dabere n’elu odudu na mkpate mmụọ nke Mmụọ Nsọ iji mata ụdị enyemaka achọrọ, ma ọ bụ nkwado nwa oge dị ka nkasị obi mmetụta uche, ihe oriri, ma ọ bụ ịnye aka n’ọrụ kwa ụbọchị, ma ọ bụ odudu ime mmụọ iji nyere ndị ọzọ aka na njem ha iji kwado, mee, ma kwanyere ọgbụgba ndụ dị nsọ ugwu.
Onye Nzọpụta Dị njikere Ịzọpụta Anyị
Mgbe Pita, Onye Ozi nke isi, “jere ije n’elu mmiri, ị gakwuru Jizọs … ọ tua egwu; ebe ọ malitere imìkpu”; mgbe ahụ “o bee akwa, na-asị Onyenwe anyi, zọputa m.” Jizọs maara okwukwe ahụ Pita gosigodịrị iji bịakwụte Ya n’elu mmirị. Ọ makwara ụjọ nke Pịta na-atụ. Dị ka akọrọ n’akụkọ ahụ, Jizọs “ngwa ngwa … setipụrụ aka Ya, ma jide ya,” wee na-ekwu okwu ndịa: “O Onye okwukwe nta, niihi gini ka i ji nwe obi abuọ?” Okwu ya abụghị iji bara Pita mba kama ọ bụ ịchetara ya na Ya, Mezaya ahụ, nọnyere ya na ndị na-eso ụzọ.
Ọ bụrụ ma anyị chee selestial, anyị ga-anata akaebe ahụ niime obi anyị na Jizọs Kraịst bụ n’ezie Onye Nnapụta anyị, Onye Nkwuchite anyị na Nna, na Onye Mgbapụta anyị. Dị ka anyị na-egospụta okwukwe na Ya, Ọ ga-azọpụta anyị site n’ọnọdụ anyị dara ada, karịa ịma aka anyị niile, adịghị ike niile, na mkpa niile nke ndụ nwa oge a ma nye anyị onyinye ahụ kachasị, nke bụ ndụ ebighị ebi.
Onye Nzọpụta Anaghị Esepụ aka Maka Anyị
Nwanne m nwoke esepụghị aka maka mụ n’ụbọchị ahụ mana ọ gara niihu ka m nwe ike mụta otu m ga-esi eme ya n’aka m. Ọ gara niihu, ọbụna ma nke ahụ ọ ga-ewe ịzọpụta m ugboro abụọ. Ọ gara niihu, ọbụna na enweghim ike ịmete ya na mbụ. Ọ gara niihu ka m nwe ike megide ịma aka ahụ ma nwete mmeri. Ọ bụrụ n’anyị chee selestịal, anyị ga-abịa mata na Onye Nzọpụta anyị ga-anọ ebe ahụ ugboro ole achọrọ ka enye anyị enyemaka anyị chọrọ iji mụta, gbanwee, megide, nọgide, ma merie ihe ọbụla ga-ewete ańụrị ziri ezi na dị ebighị ebi na ndụ anyị.
Aka nke Onye Nzọpụta
Akwụkwọ nsọ mere ka akara na mkpa aka nke Nzọpụta dịrị ebighi ebi. Na aja mmehie Ya, akpọgidere Ya n’obe site na-ikpọba ọtụtụ ntụ n’aka Ya. Mgbe Mbilite n’ọnwụ Ya gasịrị, Ọ bịakwutere ndị na-eso Ya jiri anụ ahụ zuru oke, mana apa nke aka Ya nọgidere dị ka ihe ncheta nke aja Ya na-adịgide. Aka Ya ga-anọ ebe ahụ maka anyị oge niile, ọbụnadị m’anyị anaghị ahụ ya na mbụ, nihi Nna nke Eluigwe họrọ Ya ka ọ bụrụ Onye Nzọpụta anyị, Onye Mgbapụta nke mmadụ niile.
Ọ bụrụ ma m chee selestịal, A mara m na anaghị ahapụ anyị anọrọ nanị anyị na ndụ a. Dị ka anyị na-ezute ịma aka na mnwale, Nna anyị nke Eluigwe mara ikike anyị ma mara n’anyị nwere ike ibuli ya ma ọ bụ megide ihe isiike anyị niile. Anyị kwesịrị ịme oke anyị na tụgharịa n’ebe Ọ nọ na okwukwe. Ọkpara Ọ Hụrụ Naanya, Jizọs Kraịst, bụ onye nnapụta ma ọ ga-anọ ebe ahụ mgbe niile. N’aha Ya, aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.