Ọgbakọ Zuru ọha
Ịtụkwasị obi na Nna anyị
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


10:20

Ịtụkwasị obi na Nna anyị

Chineke tụkwasịrị anyị obi na anyị ga-eme ọtụtụ mkpebi obi dị mkpa ma niime ihe niile Ọ na-agwa anyị ka anyị tụkwasi obi na Ya.

Na Jun 1, 1843, Addison Pratt hapụrụ Nauvoo, Illinois, iga kwusaa ozi ọma n’agwaetiti niile nke Hawaii, wee hapụ nwunye ya Louisa Barnes Pratt, ka ọ lekọta ezi na ụlọ ya dị nta.

Na Nauvoo ka mkpagbu na-abawanye, nke manyere Ndị nsọ ịhapụ, ma emesịa na Winter Quarters dị ka ha na-akwado njem ruo na Ndagwurugwu Salt Lake, Louisa na-atule n’obi ma ọ ga-eme njem ahụ. Ọ gaara a dịrị mfe ịnọ ma ịchere ka Addison laghachi karịa ime njem naanị ya.

N’oge abụọ ahụ, ọ chọrọ odudu site n’aka onye amụma, Brigham Young, onye gbara ya ume ka ọ gaa. Na-agbanyeghị nnukwu ihe isiike na obi abụọ ya, ọ mere njem ahụ n’udo oge nke ọbụla.

Na mbụ, Louisa enweteghị ọñụ n’ime njem ahụ. Kosiladị, n’oge na-adịghị anya ọ bidoro nabatawa ahihia ndu ndu nke ala ahụ, okoko osisi ọhịa nke nwere ọtụtụ agba, na ala kpọrọ nkụ dị n’akụkụ ikpere osimiri ahụ. “Obi mwute nọgidere uche m jiri nnọ nwayọọ nwayọọ pụọ,” ka ọ dere, “ma enweghị nwanyị obi ụtọ karịrị mụ n’etiti igwe ndị njem ahụ.”

Akụkọ Louisa kpaliri obi m n’ụzọ miri emi. Enwere m ọjịja maka njikere ya ịwepụ mmasị niile nke onwe ya, ikikere ya ịtụkwasị obi na Chineke, na otu itinye okwukwe n’ọrụ si nyere ya aka hụ ọnọdụ ahụ n’ụzọ dị iche.

Ọ chetaworo m na anyị nwere Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya, onye na-elekọta anyị n’ebe ọbụla anyị nọ, ma na anyị nwere ike ịtụkwasị obi na Ya karịa onye ọbụla ma ọ bụ ihe ọbụla ọzọ.

Nsipụta nke Eziokwu

Chineke tụkwasịrị anyị obi na anyị ga-eme ọtụtụ mkpebi obi dị mkpa, ma niime ihe niile Ọ na-agwa anyị ka anyị tụkwasi obi na Ya. Nke kacha raa ahụ mgbe echiche anyị ma ọ bụ echiche ọha dị iche site na uche Ya maka ụmụ Ya.

Ụfọdụ na-atụ arọ na anyị kwesịrị ịdegharị akara niile ejiri mara ihe ziri ezi na ihe na-ezighi ezi nihi na ha na-ekwu na eziokwu bụ ọdịbe ndị, eziokwu bụ nkọwa onye nyere, ma ọ bụ na obi Chineke sara mbara na Ọ chọchaghị ịma banyere ihe anyị na-eme.

Dị ka anyị na-achọ ịmata ma nabata uche nke Chineke, ọ ga-enye aka ịcheta na okè ahụ dị n’etiti ezi ihe na ajọ ihe abụghị ọrụ anyị ịkọwa. Chineke edebewo okè ndịa N’onwe Ya, nke dabeere n’elu eziokwu niile dị ebighị ebi maka uru na ngọzi anyị.

Ọchịchọ ahụ ịgbanwe eziokwu ebighị ebi nke Chineke nwere ogologo agụgụala. Ọ malitere tupu ụwa ebido, mgbe Ekwensu nụpụrụ isi megide atụmatụ Chineke, wee na-achọ ibibi ohere nhọrọ nke mmadụ nihi ọdịmma nke onwe ya. Na-isoro usoro nke a, ndị mmadụ dị ka Sherem, Nehor, na Korihor esiwo agụgọ na okwukwe bụ nzuzu, mkpughe enweghị isi, ma ihe ọbụla anyị chọrọ ime ziri ezi. Na mwute, ọtụtụ mgbe, njehie ndịa pụrụ site n’eziokwu nke Chineke ebutewo nnukwu iri uju.

Na-agbanyeghị na ụfọdụ ihe dabeere n’elu ọnọdụ, ọ bụghị ihe niile na-eme otu a. Onyeisi Russell M. Nelson akuziwo oge niile na eziokwu nzọpụta niile nke Chineke bụ ọkwucha ọgwụ, ha nọọrọ onwe ha, ma Chineke N’onwe Ya na akọwa ha.

Nhọrọ Anyị

Onye anyị họọrọ ịtụkwasị obi na ya bụ otu niime mkpebi obi kachasị na ndụ a. Eze Benjamin kuziiri ndị ya sị, “Kwere na Chineke; kwere na ọ nọ … ; kwere na o nwere amamiihe niile … ; kwere na mmadụ anaghị aghọta ihe niile nke Onyenwe anyị nwere ike ịghọta.”

Ọ bụ ihe ọma, anyị nwere akwụkwọ nsọ na odudu sitere na ndị amụma dị ndụ inyere anyị aka ghọta eziokwu nke Chineke. Ọ bụrụ na enwere mkpa ọ dị inye nkọwa karịa ihe achọrọ, Chineke na-arọpụta ya site n’aka ndị amụma Ya. Ma Ọ ga-aza ekpere obi ọcha niile site na Mmụọ Nsọ dị ka anyị na-achọ ịghọta eziokwu niile nke anyị aghọtachaghị uju ya ugbu a.

Okenye Neil L. Andersen nwere oge ọ kuziri na ọ kwesịghị ịtụ anyị naanya ma “ọ bụrụ mgbe ụfọdụ na echiche nke onwe [anyị] adabachaghị n’isi mbụ ya na nkuzi niile nke Onye amụma nke Onyenwe anyị. Enwere ọtụtụ oge nke mmụta,” o kwuru, “nke obi umeala, mgbe anyị ga-esekpuru ala na-ikpere anyị n’ekpere. Anyị na-eje ije n’okwukwe, wee tụkwasị obi na Chineke, wee mata na dị ka oge na-aga anyị ga-anatakwu nkọwa ime mmụọ sitere na Nna anyị nke Eluigwe.”

N’oge niile, ọ ga-enye aka icheta nkuzi nke Alma na Chineke na-enye okwu Ya dị ka otu ntinye obi na mgbalị nke anyị tinyere niime ya sịrị dị. Ọ bụrụ na anyị gee ntị nye okwu Chineke, anyị ga-anata karịa; ọ bụrụ na anyị kpọchie ntị nye ndụmọdụ Ya, anyi ga-anata ntakịrị na ntakịrị tutu ruo na anyị enweghị kpam kpam. Ntufu mmata ihe nke a apụtaghị na eziokwu ahụ ezighị ezi; kama ọ na-egosi na anyị atụfuwo ikikere ahụ iji ghọta ya.

Lekwasị Onye Nzọpụta anya

Na Capernaum, Onye Nzọpụta kuziri banyere njirimara na ozi Ya. Ọtụtụ ndị mmadụ hụtara okwu ya dị ka ihe siri ike ịnụ, nke mere ha jiri tụgharịa azụ ha ma “ghara isoro ya [jee] ije.”

Gịnị kpatara ha jiri pụọ?

Niihi ha enweghi mmasị n’ihe O kwuru. Ya mere, nihi ntụkwasị obi na echiche ha, ha pụrụ, wee gọnarịa onwe ha ngọzi niile nke gaara abịara ha asị na ha nọgidere.

Ọ dị mfe maka mpako anyị ịbịa n’etiti anyị na eziokwu ebighị ebi. Mgbe anyị aghọtaghị, anyị nwere ike cheretụ, hapụ ka mmetụta anyị niile gbada, ma emesịa họrọ otu anyị si emeso. Onye Nzọpụta gwara anyị “lekwasịnụ [Ya] anya n’echiche ọbụla; enwela obi abụọ, atụla egwu.” Mgbe anyị lekwasịrị anya n’Onye Nzọpụta, okwukwe anyị ga-amalite imeri nchegbu anyị.

Dị ka Onyeisi Dieter F. Uchtdorf gbara anyị ume ka anyị: “Biko, buru ụzọ nwee obi abụọ banyere obi abụọ gị tupu gị enwee obi abụọ banyere okwukwe gị. Anyi agaghi ma ọlị ekwe ka obi abụọ jigide anyị dị ka ndị mkpọrọ ma wezuga anyị site na ihụnaanya, udo na onyinye ndị sinachi na-abia site na-inwe okwukwe na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.”

Ngọzị n’abịara Ndị ahụ Ga-anọgide

Dị ka ndị na-eso ụzọ ahụ si n’ebe Onye Nzọpụta pụọ n’ụbọchị ahụ, mgbe ahụ Ọ jụrụ ndị Iri na Abụọ: “Unu gakwa ahapụ m?”

Pita zara:

“Onyenwe anyị, onye ka anyị ga-agakwuru? gị ji okwu niile nke ndụ ebighị ebi.

“Ma anyị kwenyere ma mara n’ezi ya na gị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara nke Chineke dị ndụ.”

Ugbua, Ndị ozi ahụ biiri n’otu ụdị ụwa ahụ ma ha zutere otu ụdị nrụgide ọha ahụ na-echegbu ndị na-eso ụzọ ahụ pụrụ apụ. Kosiladị, n’oge nke a, ha họọrọ okwukwe ha ma tụkwasị obi na Chineke, ya mere wee chekwaa ngọzi niile ahụ Chineke na-enye ndị ahụ nọgidere.

Ikekwe gị, dị ka mụ, mgbe ụfọdụ na-ahụta onwe anyị n’akụkụ abụọ nke mkpebi obi nke a. Mgbe ọ rara anyị ahụ ịghọta ma ọ bụ makọọ uche nke Chineke, ọ na-akasị obi ịcheta na Ọ hụrụ anyị naanya otu ahụ anyị dị, ebe ọbụla anyị nọ. Ma Ọ kwadoworo anyị ihe ka mma. Ọ bụrụ na anyị bịarute Ya, Ọ ga-enyere anyị aka.

Na-agbanyeghị na mgbe anyị na-erute Ya nso nwere ike ịra ahụ, otu ahụ Onye Nzọpụta gwara nna ahụ chọrọ ọgwụgwọ maka nwa ya nwoke “ihe niile ga-ekwe omume nye ndị ahụ kwere ekwe,” N’oge niile nke ndọlị anyị, anyị nwakwa nwere ike iti mkpu sị, “Nyere ekweghi ekwe [anyị] aka.”

Irara Uche Anyị Nyefee na nke Ya

Okenye Neal A. Maxwell kuziri, “nrara uche anyị nyefee bụ n’ezie otu ihe nke onwe pụrụ iche anyị kwesịrị idebe n’elu ebe nchụaja nke Chineke” Ọ bụ ihe kpatara ọ ji anụ Eze Benjamin ọkụ n’obi ka ndị ya dịrị “dị ka nwata, na-adanye, dị nwayọ, dị umeala, nwee ndidi, juputa n’ịhụnaanya, dị na njikere ịdanye n’ihe niile nke Onyenwe anyị hụworo na o kwesịrị ịdakwasị ya, ọbụna dị ka nwatakịrị na adanyere nna ya.”

Dị ka mgbe niile, Onye Nzọpụta na-egosi anyị ọmụmatụ ahụ zuru oke. Jiri obi dị arọ, ma na-amata ọrụ mgbu nke Ọ nwere ịrụ, Ọ raara uche ya nyefee na uche nke Nna Ya, wee mezuo ozi nzọpụta Ya ma meghee nkwa ebighị ebi ahụ ekwere mụ na gị.

Nhọrọ ahụ irara uche anyị nyefee na Chineke bụ omume okwukwe nke no n’etiti obi nke ndụ anyị dị ka onye na-eso ụzọ. Na ịme nhọrọ ahụ, anyị na-achọpụta na ohere nhọrọ ahụ adịghị ebelata; kama, a na-abawanye ya ma kwụọ ụgwọ ya site na ọnụnọ nke Mmụọ Nsọ, onye na-ewete ebumnuche, ọńụ, udo, na olile anya nke anyị nwere ike ịchọta n’ebe ọzọ.

Ọtụtụ ọnwa gara aga, otu onyeisi stek na mụ jere leta otu nwanne nwanyị na nwa ya toro eto ndị stek ya. Kemgbe ọtụtụ afọ ọ pụrụ na Nzukọ nsọ, na-akpagharị n’ụzọ ndị siri ike ma enweghi enyi, ọ lọghachiri. N’oge nleta anyị, anyị jụrụ ya ihe kpatara ọ jiri bịaghachi azụ.

“Emebisịrị mụ ndụ m,” ka o kwuru, “ma A maara m ebe m kwesịrị ị nọ.”

Mgbe ahụ A jụrụ m ya ihe ọ mụtara na njem ya.

Jiri mmetụta uche, ọ kesaara anyị na ọ mụtara na ọ dị mkpa ị bịa nzukọ nsọ ọtụtụ mgbe iji tọghapụ onwe ya na agwa nke ịghara ịbịa ma na ọ dị mkpa ịnọgide tutu ruo mgbe ebe ahụ bụ ebe ọ chọrọ ị nọ. Nlọghachi ya adịghị mfe, mana dị ka ọ tinyere okwukwe niime atụmatụ nke Nna, ọ nwere mmetụta ka Mmụọ ahụ na-alọghachi.

Ma mgbe ahụ ọ gbakwụnyere, “A mụtawo m nye onwe m na Chineke dị mma ma na ụzọ Ya kacha nke m dị mma.”

Ana m agba aka ebe nke Chineke, Nna Ebighị ebi anyị, onye hụrụ anyị naanya; maka Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, onye zọpụtara anyị. Ha mara maka mgbu na ihe ịma aka anyị niile. Ha agaghị ahapụ anyị ma ọlị ma ha mara nke ọma otu esi enyere anyị aka. Anyị nwere ike inwe obi ụtọ dị ka anyị na-atụkwasị obi na Ha karịa ndị ọzọ ma ọ bụ n’ihe ọbụla ọzọ. N’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.