Lekwasị anya na Jizọs Kraịst na Ozi ọma Ya
Mgbe anyị na-eleghara ihe ndọpụ uche niile nke ụwa anya ma lekwasị anya na Kraịst na Ozi ọma Ya, a na-ekwe anyị nkwa na ihe ga-agara anyị nke ọma.
N’afọ 1996, otu egwuregwu bọọlụ ụmụ nwoke Nigeria nwetara ọla edo n’Asọmpi Olympic nke emere na Atlanta niime United States. Dị ka agbachara bọọlụ ikpeazụ, igwe mmadụ na-enwe ọńụ wụsara n’okporo ụzọ nke obodo ọbụla; obodo ukwu a nke narị nde mmadụ 200 gbanwere ozugbo ka ọ bụrụ nnukwu emume n’elekere abụọ nke ụtụtụ! E nwere ọńụ na-efe efe, obi ụtọ, na obi ọma ka ndị mmadụ na-eri, na-abụ abụ, ma gbaa egwu. Niime oge ahụ, Nigeria dị n’otu, ma onye Nigeria ọbụla nwere afọ ojuju ịbụ onye Nigeria.
Tupu Olympics ahụ, otu a nwere ọtụtụ aka-mgba. Dị ka asọmpi bidoro, a kwụsịrị ịnye ha ego. Otu ahụ gbara bọọlụ na-enweghị ngwa niile kwesịrị ekwesị, ebe ọzụzụ niile, nri ma ọ bụ ọrụ ịsa akwá.
N’otu oge, ọ dị nkeji ole na ole ka achụpụ ha site asọmpi ahụ, mana ndị otu Nigeria merịrị megide ihe egwu ọ bụla. Oge a dị mkpa gbanwere otu ha si hụ onwe ha. Jiri nkwenye ọhụrụ a chọtara, na ịrụsi ọrụ ike n’otu n’otu na otu ndị otu na mkpebi siri ike, ha n’ịdị n’otu leghara ọtụtụ ihe ndọpụ uche anya ma wee lekwasị anya na imeri. Ihe a ha lekwasịrị anya mere ha irite ọla edo niile, ma ndị Nigeria gụọ ha “Dream Team” ahụ. A ka na-ekwu maka Dream Team a na asọmpi 1996 na egwuregwu niile Nigeria.
Ozugbo ndị otu egwuregwu bọọlụ mụtara ileghara ọtụtụ ihe ndọpụ uche chere ha anya ma ilekwasị anya n’ebumnobi ha, ha mere nke ọma karịa ihe ha chere na ọ ga-ekwe omume ma wee nweta nnukwu ọńụ. (Dịka anyị ndị ọzọ mere na Nigeria!)
N’otu aka ahụ, mgbe anyị na-eleghara ihe ndọpụ uche niile nke ụwa anya ma lekwasị anya na Kraịst na Ozi ọma Ya, a na-ekwe anyị nkwa na anyị ga-enwe ihe ịga nke ọma karịa ihe anyị nwere ike iche n’echiche ma nwee ọńụ dị ukwuu. Onyeisi Russell M. Nelson akuziwo: “Mgbe nlekwasị anya nke ndụ anyị bu n’ebe … Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya nọ, anyị nwere ike nwee mmetụta ọńụ na-agbanyeghị ihe na-eme—ma ọ bụ na-anaghị eme—niime ndụ anyị niile.”
A na m ekpe ekpere na Mmụọ Nsọ ga-enyere onye ọbụla niime anyị aka ị ńaa ntị n’oku nke Onyeisi Nelson ka anyị lekwasị anya ndụ anyị na “Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya” ka anyị wee nweta ọńụ niime Kraịst “n’agbanyeghị ihe ọ bụla na-eme—ma ọ bụ na-anaghị eme—niime ndụ anyị niile.”
Ọtụtụ akụkọ niime Akwụkwọ nke Mọmọn kọwara ndị mmadụ tụgharịrị ndụ ha site n’ilekwasị anya na Jizọs Kraịst na Ozi ọma Ya.
Tụlee Alma nke Nta. O nupụrụ isi wee buso Nzukọ nsọ ahụ agha. Nna ya, Alma, kpere ekpere ma buo ọnụ. Otu mmụọ ozi pụtara wee kpọọ Alma nke nta ka o chegharịa. N’oge ahụ, Alma malitere ịta ahụhụ “mgbu nke mkpụrụ obi a mara ikpe.” N’oge awa niile gbara ọchịchịrị, o chetara nna ya na-akụzi na Kraịst ga-abịa gbaghara mmehie niile nke ụwa. Ka uche ya jidere na echiche ya, ọ rịọrọ Chineke maka ebere. Ọńụ bụ ihe si na ya pụta, ọńụ ọ kọwara ka ọmarịcha! Ebere na ọńụ bịakwutere Alma niihi na ya na nna ya lekwasịrị anya n’ebe Onye Nzọpụta nọ.
Maka ndị nne na nna nwere ụmụ ndị kpafuworo, nwee obi ike! Kama ịnọ na-eche ihe mere mmụọ ozi anaghị abịa nyere nwa gị aka chegharịa, maara na Onyenwe anyị etinyela mmụọ ozi na-anwụ anwụ n’ụzọ ya: bishọp, onye ndu Nzukọ nsọ ọzọ, ma ọ bụ nwanne nwoke ma ọ bụ nwanne nwanyị n’eje ozi nlekọta. Ọ bụrụ na ị na-ebu ọnụ ma na-ekpe ekpere, ma ọ bụrụ na ị gaghị agbalị ịtọ oge ma ọ bụ oge njedebe maka Chineke, ma ọ bụrụ na ị ga-atụkwasị obi na Ọ na-esetịpụ aka Ya iji nye aka, mgbe ahụ—mgbe na-adịghị anya—ị ga-ahụ mmetụta Chineke na-emetụ nwa gị n’obi mgbe nwa gị họrọ ige ntị. Nke a dị otu a n’ihi na Kraịst bụ ọńụ— Kraịst bụ olile anya; Ọ bụ ya bụ nkwa ahụ “nke ihe ọma ndị ga-abịa.”6 Ya mere tụkwasị obi na Jizọs Kraịst maka nwa gị, niihi na Ọ bụ ike nke nne na nna ọ bụla ma nwatakịrị ọ bụla.
Ozugbo o nwetara ọńụ niime Kraịst, Alma nke Nta biri na ọńụ ahụ. Mana olee otu o si nọgide na-enwe ọńụ dị otu ahụ ọbụna site n’ihe isi ike na ọnwụnwa? Ọ kọwara:
“Site n’oge ahụ ọbụna tutu ruo ugbua, arụwo m ọrụ na-esepụghị aka, [ka] m weta mkpụrụ obi niile na nchegharị; ka m wee weta ha idetụ ire site n’ọn̄ụ dị ukwuu nke m detụrụ ire. …
“… Ma … Onyenwe anyị na-enye m oke ọn̄ụ dị ukwuu nʼụgwọ ọrụ m niile. …
“Ma a kwadowo m n’oge mnwale niile na nsogbu niile nke ọbụla.”
Ọńụ niime Kraịst malitere maka Alma mgbe o gosipụtara okwukwe n’ebe Ọ nọ ma tikuo maka ebere. Mgbe ahụ Alma na-egosipụta okwukwe na Kraịst site n’ịrụ ọrụ inyere ndị ọzọ aka idetụ otu ọńụ ahụ ọnụ. Ọrụ ndị a na-aga n’ihu wetara nnukwu ọńụ niime Alma ọbụna niime ọnwụnwa na nsogbu niile n’ụdị ọbụla. Ị hụrụ, “Onyenwe anyị hụrụ ịgba mbọ n’anya,” ma mbọ e lekwasịrị anya na Ya na-eweta ngọzi niile. Ọbụna ọnwụnwa siri ike nwere ike “elobara ya niime ọńụ nke Kraịst.”
Otu ọzọ niime Akwụkwọ nke Mọmọn ndị mere Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya bụrụ isi nke ndụ ha ma nweta ọńụ bụ ndị ahụ chọpụtara obodo-ukwu Helam—ebe ha nwere ike zuo ụmụ ha ma na-anụ ụtọ okpukperechi ha na-enweghị mgbochi ọbụla. Ndị ezi omume a na-ebi ndụ dị mma bụ ndị ohụ site na notu ndị na-apụnara mmadụ ihe ma n’apụ ha ikike ndị bụ isi ihe nke mmadụ iji n’ekpe okpukperechi. Mgbe ụfọdụ ihe ọjọọ na-eme ndị ezigbo mmadụ:
“Onyenwe anyị hụrụ mkpa ọ dị ịta ndị ya ahụhụ, e, ọ na-anwale ndidi ha na okwukwe ha.
“Otu o sila dị—onye ọbụla tinyere ntụkwasị-obi ya na ya onye ahụ ka a ga ebuli elu n’ụbọchị ikpeazụ. E, ma otu a ka ọ dị ndị nke a.”
Olee otu ndị a si nwee nnagide n’ọnwụnwa ha niile na ntaram ahụhụ ha? Site n’ịlekwasị anya na Kraịst na Ozi ọma Ya. Nsogbu ha niile akọwaghị ha; kama, onye ọ bụla niime ha tụgharịrị gakwuru Chineke, n’akọwara onwe ha dị ka nwa nke Chineke, nwa nke ọgbụgba ndụ, na onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst. Dị ka ha chetara ndị ha bụ ma kpọkuo Chineke, ha nwetara udo, ume, na ọńụ n’ikpeazụ niime Kraịst.
“Alma na ndị ya … wụpụtara obi ha nye [Chineke]; ma ọ matara echiche niile nke obi ha.
“Ma o wee ruo na olu nke Onye-nwe anyị bịaruru ha niime mkpagbu ha niile, na-asị: Welite isi unu niile ma nwe nkasiobi dị mma, niihi na a ma m maka ọgbụgba-ndụ ahụ nke unu meworo nye m; ma a ga m agba-ndụ mụ na ndị m ma napụta ha site n’ịbụ-oru.”
Na nzaghachi, Onyenwe anyị mere “ibu arọ niile dị mfe … n’elu ubu ha. … Ee, Onyenwe anyị mere ka ha gbasie ike ka ha wee bulie ibu-arọ ha niile n’inwere onwe, ma ha nyere onwe ha n’ọn̄ụ ma were ndidi ruo n’ọchịchọ niile nke Onyenwe anyị.” Hụba ama na Ndị nsọ ndị a kwere ka nsogbu, ahụhụ, na nnwale ha niile bụrụ ihe elobara niime ọńụ nke Kraịst! Mgbe ahụ, n’oge kwesịrị ekwesị, O gosiri Alma ụzọ maka mgbapụ, ma Alma—onye amụma nke Chineke—duuru ha gaa na nchekwa.
Ka anyị na-elekwasị Kraịst anya ma na-eso onye amụma Ya, a ga-edugakwa anyị na Kraịst na ọńụ nke ozi ọma Ya. Onyeisi Nelson kuziworo: “Ọńụ dị ike, ma ịlekwasị anya na ọńụ na-eweta ike Chineke niime ndụ anyị. Dị ka niime ihe niile, Jizọs Kraịst bụ onye ọmụmaatụ anyị kachasị, ‘onye niihi ọńụ nke edebere n’ihu ya nagidere obe ahụ’ [Ndị Hibru 12:2].”
Nne m nwụrụ n’oge na-adịbeghị anya; ọ bụ ihe ijuanya. A hụrụ nne m n’anya ma e nweghị m atụmatụ na ọ ga-anwụnarị m ugbu a. Mana site n’ọnwụ ya, mụ na ezinaụlọ m enwewo ahụmihe iru uju na ọńụ. A ma m na niihi Ya, ọ nwụbeghị—ọ dị ndụ! Ma A maara m niihi Kraịst na ntụghe niile nke nchụ-aja eweghachitere site n’aka Onye amụma Josef Smith, a ga m anonyere ya ọzọ. Iru uju nke ọnwụ mama m bụ ihe elobara niime ọńụ nke Kraịst! A na m amụta na “iche selestịal” ma “ikwe ka Chineke merie” gụnyere ịlekwasị anya n’ọńụ dị niime Kraịst.
Ọ na-akpọ nịhụn’anya, “Bịakwutenụ m, unu ndi na-adọgbu onwe unu n’ọrụ ma e bokwasịrị ibu dị arọ, ma Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.” Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.