Ọgbakọ Zuru ọha
Onye nke Chineke Kacha Hụ Naanya
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


10:31

Onye nke Chineke Kacha Hụ Naanya

Ijupụta n’ịhụnanya Chineke na-echekwa anyị n’oke ifufe nke ndụ mana ọ na-emekwa ka oge obi ụtọ nwekwuo obi ụtọ karịa.

Tupu ma amalite, a ga m agwa unu na ụmụ m abụọ atụbọọla dị ka ha na-ekwu okwu n’ikpo okwu, ma enwebeghi mgbe m nwetere njiko mụ na ha karịa n’oge nke a. Enwere ọtụtụ ihe m bụ n’uche karịa trapdoor.

Ezi na ụlọ anyị nwere ụmụaka isii, ndị mgbe ụfọdụ na-ama onwe ha njakịrị na ha bụ nwa nke akacha hụ naanya. Onye ọbụla niime ha nwere ihe kpatara ha jiri bụrụ nke ahụrụ naanya karịa. Ịhụnaanya anyị maka ụmụ anyị nke ọbụla enweghi ntupọ ma nwee ojuju afọ ma zuo oke. Anyị enweghi ike ịhụ onye ọbụla niime ha naanya karịa nke ọzọ—ịhụnaanya anyị mara mma ma na-amụba amụba mgbe a mụrụ nwa nke ọbụla niime ha. A na m akacha amata maka ịhụnaanya Nna m nke Eluigwe nwere maka mu site na ịhụnaanya ahụ m nwere maka ụmụ m.

Dị ka ha na-esi agụgọ nwa akacha hụ naanya, enwere ike ichewo na ezi na ụlọ anyị enwetụbeghi ime ụlọ a na-edozighi edozi mbụ. Echiche ntụpọ dị nime mmekọrịta dị n’etiti nne na nna na nwa na-ebelata site na-ilekwasị anya na ịhụnanya.

Ọ na-eru otu oge, ikekwe nihi na ahụwo m na anyị ga-ezute ọgbaghara ezị na ụlọ, a ga m ekwu ihe dị otua “Ngwanụ o, ike unu agwụwo m, mana a gaghịm ama ọkwa ya; ụnụ maara onye nke bụ onye m kacha hụ naanya,” Ebumnuche m bụ na nke ọbụla niime ụmụ isii ahụ ga-enwete mmeri ma ezee ịlụ agha—opekampe tutu ruo oge ọzọ!

Niime Ozi ọma ya, Jọn kọwara onwe ya dị ka “onye na-eso ụzọ onye nke Jizọs hụrụ naanya,” dị ka a ga-asị na nhazị nke ahụ pụrụ nnọọ iche. Ọ na-amasị m iche na nke a bụ nihi na Jọn nwere mmetụta na Jizọs hụrụ ya naanya n’ụzọ zuru oke. Nefi kwukwara ụdị echiche dị otu ahụ mgbe ọ dere, “A na m enwe an̄ụrị na Jizọs m. N’ezie, Onye Nzọpụta abughị nke Nefi karịa otu Ọ jiri bụrụ nke Jọn, ma nagbanyeghi ọ bụ ụdị mmekọrịta nke onwe Nefi nwere ya na Jizọs “ya” mere o jiri kọwa ya n’ụzọ ahụ dị nro.

Ọ bụna ọbụghị ihe dị ịtụnanya na enwere ọtụtụ oge mgbe anyị na-enwe oke mmetụta na a na-ahụ anyị ma hụ anyị naanya? Nefi na-akpọ Ya Jizọs nke “ya” ma anyị nwekwara ike ime otu a. Ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta anyị bụ nke “ịhụnaanya nke kachasị elu, nwee ugwu ma sie ike,” ma Ọ na-enye ya tutu ruo mgbe anyị “jupụtara.” Ịhụnaanya nke si n’igwe adịghị akọ akọ, ma anyị n’otu n’otu bụ onye akacha hụ naanya. Ịhụnaanya Chineke bụ ebe, dị ka okirikiri niile nke ihe osise Venn, anyị niile na-ejikọta. Nagbanyeghi akụkụ anyị ọbụla nke dị ka ọ dị iche, ịhụnaanya Ya bụ ebe anyị na-achọta ịdị n’otu.

Ọ bụ ihe na-agbagwoju anya na iwu nsọ ahụ kachasị bụ ịhụ Chineke na ndị gbara anyị gburu gburu naanya? Mgbe m na-ahụ ndị mmadụ ka ha na-egosikọrịta onwe ha ịhụnaanya ahụ yiri nke Kraịst, ọ na-adị m ka ịhụnaanya ahụ ọ jupụtara karịa ịhụnaanya nke onwe ha; ọ bụ ịhụnaanya nke nwekwara ihe nsinigwe niime ya. Mgbe anyị hụkọrịtara onwe anyị naanya n’ụzọ dị otu a, n’ụzọ zuru oke ma juo ejuo dị ka anyị nwere ike, eluigwe na-esonye kwa.

Ya mere ọ bụrụ na onye anyị na-elekọta dị nnọ ka ọ nọ ebe dị anya n’ebe ịhụnaanya si n’igwe nọ, anyị nwere ike isoro nsoro nke a—site na-ime ihe ndị ahụ na-akpọta anyị nso n’ebe Chineke nọ ma na-eme ihe ndị na-akpọta anyị nso n’ebe ha nọ—oku nke ịbịakwute Kraịst ọnụ apụghị ikwu.

Ọ ga-amasị m ịnọdụ ọdụ mụ na unu ma jụọ unu ọnọdụ nke na-akpata unu ji enwete mmetụta ịhụnaanya nke Chineke. Kedụ amaokwu nke akwụkwọ nsọ, kedụ omume nke ije ozi ọ bụ? Kedụ ebe ị ga-anọ? Kedu egwu ọ bụ? Kedụ ọgbakọ enyi ọ bụ? Ọgbakọ zuru ọha bụ ebe bara ụba iji mụta banyere ijikọta anyị na ịhụnaanya nke eluigwe.

Mana ikekwe ị na-eche na ị nọ ebe dị anya n’ebe ịhụnaanya nke Chineke nọ. Ma eleghị anya, enwere ọtụtụ ụda olu nke nkụda mmụọ na ọchịchịrị nke na-emetụta echiche gị, ozi ndị na-agwa gị na gịnwa merụkwara ahụ ma nwe mgbagwoju anya, nwe adịghị ike, ma leghara anya, ma ọ bụ dị ezigbo iche itozu oke irite ịhụnaanya nke eluigwe n’ụzọ dị irè. Ọ bụrụ na ị nụ echiche ndịa, biko nụrụ nke a: olu ndị ahụ ezighi ezi nnọọ. Anyị nwere ike iji obisike leghara mmebi anya n’ụzọ ọ bụla na-eme ka anyị ghara iru eru n’ịhụnanya nke eluigwe—oge ọbụla anyị na-agụ abụ ahụ na-echetara anyị na Onye Nzọpụta anyị dị ịhụnaanya ma na-enweghi ntupọ họọrọ ka “echichie, gbajie, [ma] dọkasịa ya maka anyị.” oge ọbụla anyị na-eri achịcha agbajiri agbaji. N’ezie Jizọs wepụrụ ihere niile site na ndị etiwara etiwa. Site na ntipịa Ya, Ọ ghọrọ onye zuru oke, ma Ọ pụrụ ime k’anyị zuo oke nagbanyeghi ntipịa anyị. Ọ bụ onye agbajiri agbaji, nọrọ naanị ya, dọkasịa, ma echichie—ma anyị nwekwara ike ị nwe ụdị mmetụta dị otu a—mana ekewaghị anyị site na ịhụnaanya nke Chineke. “Ndị mmadụ agbajiri agbaji; ịhụnaanya zuru oke,” ka agụrụ niime egwu ahụ.

Ị nwere ike ịma otu ihe nzuzo banyere onwe gị nke na-eme ka ị dịrị ka ahụghị gị naanya. Nagbanyeghi eziokwu ịmaara banyere onye ị bụ, ọ bụghị eziokwu gị iche na ị kwesịrị idobe onwe gị ebe dị anya site n’ebe ịhụnaanya Chineke nọ. Mgbe ụfọdụ anyị na-emegide ma ghara ịnwe ndidi n’ebe onwe anyị nọ n’ụzọ ndị anyị enweghi ike itule n’uche maka ọnye ọzọ. Enwere ọtụtụ ihe anyị ga-eme na ndụ a, mana ikpọ onwe asị na inwe ihere site na-ikpe ọmụma nke onwe esonyeghị nime ndekọ ahụ. Nagbanyeghị ụdị mmejọ anyị chere anyị nwere, ogweaka Ya adịghị mkpụ mkpụ. Mba. Ogologo ha zuru oke mgbe niile iji “[rute] ebe anyị nọ” ma bakọọ ọnye ọbụla niime anyị.

Mgbe anyị enwetaghị mmetụta ekpom ọkụ nke ịhụnaanya si nigwe, ọ pụbeghi. Okwu niile nke Chineke bụ na “ugwu ukwu niile ga-ewezuga onwe ha, ma ugwu nta niile ka a ga-ewepụ; mana obi ọma [Ya] agaghị ewezuga onwe ya site nihu [anyị]” Nihi ya, iji doo anya, echiche ahụ na Chineke akwụsiwo ịdị ịhụnaanya kwesịrị ị nọ n’ala ala ndekọ nke nkọwa niile na ndụ na anyị agaghị erute ya nso tutu ruo mgbe ugwu ukwu niile hapụworo ma ugwu nta niile pụworo!

Enwere m ezi mmasị maka ihe iriba ama nke ugwu niile ị bụ ihe akaebe nke idi irè nke ịhụnaanya Chineke. Ihe ọdịmara nke a dị ike dụbara onwe ha niime ndekọta niile nke ndị ahụ na-aga n’elu ugwu ukwu ịnata mkpughe ma nkọwa nke Aịzaya banyere “ugwu ukwu nke ụlọ Onyenwe anyị” ị bụ nke “ehiwere n’elu nke ugwu ukwu niile.” Ụlọ nke Onyenwe anyị bụ ebe obibi nke ọgbụgba ndụ anyị kachasị dị oke ọnụ ahịa ma bụrụ ebe mgbaba maka anyị niile ịlaghachi azụ ma rikpuo nime ime n’ebe ihe aka ebe maka ịhụnaanya Nna nwere maka anyị. Eritewokwa m uru dị nime nkasị obi na-abịara mkpụrụ obi m mgbe m kpuchisiri onwe m ike karịa nime ọgbụgba ndụ baptizim nke m ma chọta onye na-eri uju ọnwụ ma ọ bụ nwee mnwute nihi ndakpọ olileanya ma m na-agbalị ịnyere ha aka jidesie ma hụ ka mmetụta ha siri dị. Enwere ụzọ ndị anyị nwere iji akacha arikpunye onwe anyị niime ịhụnaanya ọgbụgba ndụ kacha dị oke ọnụ ahịa, hesed?

Yamere ọ bụrụ na ịhụnaanya Chineke anaghị ahapụ anyị, gịnị kpatara anyị anaghị enwe mmetụta ya mgbe niile? Iji kụtụ gị aka n’obi: Amaghị M. Mana ịbụ onye a hụrụ n’anya n’ezie n’ezie abụghị otu ụdị ihe dị ka ịnwe mmetụta ịhụnaanya, ma enwere m echiche ole na ole nwere ike inyere gị aka ka ị na-agbaso azịza gị nye ajụjụ ahụ.

Ikekwe ị na-agba mgba nye iru uju, ịda mba n’obi, ịrara onwe nye, owu ọmụma, ndakpọ olileanya, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ dị ike ga-eme ka ịghara inwe mmetụta ịhụnanya Chineke n’ebe ị nọ. Ọ bụrụ otu a, ihe ndịa nwere ike ịme ka ikikere anyị daa mba k’anyị ghara ịnwe mmetụta anyị kwesịrị ịnwe. Maka otu oge ọbụlagodi, ikekwe ị gaghị enwe ike enwe mmetụta ịhụnaanya Ya, ma mgbe ahụ ọmụma ihe gazi ezu. Mana ana m eche ma ị nwere ike ịme nlele—jiri ndidi—jiri ụzọ dị iche iche nke igosipụta na ịnata ihunaanya sinigwe. Ị nwere ike ịlaghachi azụ site na ihe ọ bụla dị gị n’ihu ma ikekwe jee nzọụkwụ ọzọ na nke ọzọ tutu ruo mgbe ị ga-ahụ mbara ala sara mbara, obosara na obosara otu ọ dị ọ bụrụ na ọ dị mkpa ruo mgbe ị bidoro nnọọ “chee echiche selestịal” n’ihi na ị na-ele kpakpando niile anya ma na-echeta. ụwa na-enweghị ọnụ ọgụgụ na site na ha Onye Okike ha?

Abụ nnụnụ, inwe mmetụta anyanwụ ma ọ bụ ikuku ma ọ bụ mmiri ozuzo n’akpụkpọ ahụ m, ma n’oge ndị ahụ mgbe ọdịdị mere ka uche m chọpụta ịdị egwu Chineke—nke ọ bụla nwere okè na-inye m njikọ mụ na eluigwe. Ikekwe nkasị obi nke ndị enyi kwesịrị ntụkwasị obi ga-enye aka. Ikekwe egwu? Ma ọbụ ije ozi? Idebewo ndekọihe ma ọ bụ jonal banyere oge ndị ahụ mgbe njikọ gị na Chineke nwere doro gị anya karịa? Ikekwe ịnwere ike kpọkuo ndị ahụ ịtụkwasịrị obi ka ha kesaara gị nsipụta nke njikọ igwe ha dị ka ị na-achọ enyemaka na nghọta

A na m eche, ọ bụrụ na Jizọs ga-ahọrọ ebe gị na ya ga-ezute, ebe nzuzo nke ị ga-enwe ike lekwasị anya naanị n’ebe Ọ nọ, Ọ ga-enwe ike họrọ ebe ahụ pụrụ iche nke nhụjuanya nke onwe gị, ebe ahụ ịdebere mkpa ahụ kachasị dịrị gị oke mkpa, ebe ọ dighi onye ọzọ na-aga? Ebe ahụ ị na-enwe owu ọmụma nke ukwuu nke na ị ga-anọrịrị naanị gị mana ị nọghịcha kwa ya, ebe ikekwe naanị Ya erutewo na njem mana n’ezie ọ kwadobeworịị izute gị ebe ahụ mgbe gị onwe gị ga-abịarute? Ọ bụrụ na ị na-eche Ya ka ọ bịa, ọ ga-abụ na ọ nọ nnọọ ebe ahụ ma dị gị nso iru aka?

Ọ bụrụ na ị na enwe mmetụta njupụta ịhụnaanya n’oge ndụ gị nke a, biko gbalịa jidesie ya ike dị ka otu myọ si ejide mmiri. Gbasasịa ya ebe ọ bụla ị na-aga. Otu niime ọrụ ebube nke ọrụ nke nhazi eluigwe bụ mgbe anyị na-agbalị ịkesa ịhụnaanya nke Jizọs, anyị na-ahụta ka a na-ejupụta onwe anyị n’ụzọ dịtụ iche nke ụkpụrụ ahụ kwuru na “onye ọbụla tufuru ndụ ya nihi m ga ahụ ya“

Ijupụta n’ịhụnanya Chineke na-echekwa anyị n’oke ifufe nke ndụ mana ọ na-emekwa ka oge obi ụtọ nwekwuo obi ụtọ karịa—ụbọchị ọṅụ anyị, mgbe anwụ na-acha na mbara igwe, ọbụna ka a na-eme ka ọ chakee site na anwụ dị niime mkpụrụ obi niile anyị.

K’anyị bụrụ ndị “gbara mgbọrọgwụ ma kwudesie ike” niime Jizọs anyị ma niime ịhụnaanya Ya. K’anyị chọọ maka ma chekwaa nhụmiihe niile nke mmetụta ịhụnaanya na ike Ya niime ndụ anyị. Ọńụ nke ozi ọma nke a dịịrị onye niile: ọbụghị nanị maka ndị nwere obi ụtọ, ọbụghị nanị maka ndị nwere mnwute. Ọ bụ ebumnuche anyị, ọ bụghị onyinye nke ọnọdụ nile anyị. Anyị nwere ezi ihe kpatara ya iji “n̄ụrịa ma jupụta n’ịhụnanya n’ebe Chineke na mmadụ nile nọ.” K’anyị jupụta na ya. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Jọn 21:20; lee kwa Jọn 13:23; 19:26; 20:2; 21:7.

  2. 2 Nifaị 33:6; okwu ido anya ka agbakwunyere.

  3. Ọkọwaokwu Baịbụl, “Afọ ọma.”

  4. N’ebe Ala Nsọ ahụ: Matiu 14:15–20. Ma n’ebe Americas: 3 Nifaị 27:16.

  5. Lee Matiu 22:35–40.

  6. Lee 1 Jọn 4:12.

  7. Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa: Ihe odudu maka Ime Nhọrọ niile na-agwa anyị kanyị “nyere [ndị ọzọ] aka nwee mmetụta ịhụnaanya Chineke site na [anyị].” ([2022], 12).

  8. “Jizọs nke Nazareth, Onye Nzopụta na Eze,” Abụ, no. 181; ; lee kwa Aịzaya 53:5; Matiu 26:26.

  9. Onyeisi Russell M. Nelson kọwara na: “Nwantịtị oge tupu mkpọgbu n’obe [nke Onye Nzọpụta], O kwuru na ‘n’ụbọchị nke atọ a ga-eme ka M zuo oke’ (Luk 13:32; okwu ido anya ka agbakwụnyere]. Chee maka nke ahụ! Onyenwe anyị na-emeghi mmehie, na-enweghi mperi—onye tozuworịị oke dị ka nlere anya nke anụ ahụ—kwupụtara ogo ntozu oke ya nke ka ga adị nobịa niihu. Ntozu oke Ya dị ebighị ebi ga-esote mbilite n’ọnwụ ya ma nnata nke ‘ike niile … dị nelu igwe na nelu ụwa’ [Matiu 28:18; lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:2–23]” (“Itozu Oke Na-eche,” Ensign, Nov. 1995, 87). Onye amụma Moronaị kpọkuru onye niile sị “bịakwutenụ Kraịst, ma zuonụ oke niime ya, ma wezuga onwe unu site niihe niile na-egosị na-amaghị Chineke; ma ọ bụrụ na unu ga-ewezuga onwe unu site niihe niile na-egosị na-amaghị Chineke, ma hụ Chineke naanya jiri ike unu, echiche na ume unu niile, mgbe ahụ ka amara ya zuru oke nye unu, nke mere na site na-amara ya unu ga-enwe ike zuo oke niime Kraịst.” (Moroni 10:32).

  10. “Onye Nzọpụta nke Mkpụrụ obi M,” 2024 Youth Album, ChurchofJesusChrist.org.

  11. Lee Aịzaya 59:1.

  12. “Kedụ Ebe M Ga-enwete Udo?i,” Abụ, no. 129.

  13. Aịzaya 54:10.

  14. N’ọmụmatụ, Nifaị (lee 1 Nifaị 17:7), Mozis (lee Ọpụpụ 19:3), ndị na-eso ụzọ iri n’otu ahụ (lee Matiu 28:16), ma Onye Nzọpụta ahụ (lee Matiu 14:23); lee kwa Abụ ọma 24:3.

  15. Aịzaya 2:2; leekwa amaokwu 3. Ihe nnọchianya nke a na-eme ka m tụlekwuo ebumnuche nke Onyenwe anyị na-inye ụmụ Ya ọtụtụ narị tempụl maka ụmụ Ya n’ebe nsọtụ niile nke n’ụwa.

  16. Nhụmihe nke m na-agba akaebe banyere eziokwu dị niime nkwa nke Onyeisi Nelson na ebe kachasị nwee nchekwa ndụ bụ niime ọgbụgbandụ gị niile nke tempụl. (lee “Tempụl Ahụ na Ntọala nke Ime mmụọ Gị,” Liahona, Nov. 2021, 96)

  17. Onyeisi Nelson emesiwo anyị obi ike:

    “Oge a nọ niime tempụl ga-enyere gị aka ka ị chee maka selestial ma nwete ọhụ nke onye ị bụ n’ezie, onye ị nwere ike ịbụ, ma ụdị ndụ ịnwere ike ịnwe ruo mgbe niile ebighi ebi. Ofufe tempụl kwa mgbe ga-amụba ụzọ isi ahụta onwe gị ma ọtu isi bata nime atụmatụ magburu onwe ya nke Chineke. A na m ekwe gị nkwa ahụ. …

    “… Enweghị ihe ga-akacha eme ka mmụọ unu dajụọ n’oge niile nke mgbu. Enweghi ihe ga-akaemepe eluigwe niile. Enweghi! (“Ñụrịa ọñụ nime Onyinye nke Ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja,” Liahona, May 2024, 121, 122).

  18. Lee Mozaya 18:8-10, 13. “Ọgbụgba ndụ nke baptizim bụ ihe akaebe nke ọha nye Nna nke Eluigwe banyere mkpebi atọ akpọrọ aha: ijere Chineke ozi, idebe iwu nsọ Ya niile, ma ịdịnjikere ịwekwasị aha nke Jizọs Kraịst. Akụkụ ndị ọzọ ndị a na-agbakwụnyere ọgbụgba ndụ baptizim—nanyị ga e ‘bukọrịta ibu otu onye n’ibe ya,’ ‘n’eso ndị n’eru uju eru uju,’ ma ‘nye nkasi obi ndị nọ na mkpa nkasi obi’ [Mozaya 18:8–9]—bụ mkpụrụ osisi nke ịme ọgbụgba ndụ ahụ karịa ịbụ akụkụ nke ọgbụgba ndụ ahụ nezie. Akụkụ ndịa agbakwụnyere dị mkpa niihi na ha bụ ihe mkpụrụ obi atọghatara atọghata kwesịrị ịme na nkịtị” (Dale G. Renlund, “Njikọ anyị na Chineke nke Sikwuru ike na Dị Nso site na Ọtụtụ Ọgbụgba ndụ” [Brigham Young University–Idaho devotional, Mar. 5, 2024], speeches.byu.edu).

  19. Lee Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Dị ebighị ebi,” Liahona, Oct. 2022, 4–11.

  20. Lee Russell M. Nelson “Chee Selestịal!,” Liahona, Nov. 2023, 117, 118.

  21. Matiu 16:25.

  22. Ndi Efesọs 3:17.

  23. Lee 2 Nephi 2:25; Russell M. Nelson, “Ọńụ na Ịnya ndụ nke Ime Mmụọ,” Liahona, Nov. 2016.

  24. Mozaya 2:4.

  25. Lee Moronaị 7:48.