Ọgbakọ Zuru ọha
Ndụ anụ ahụ Na-arụ ọrụ!
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


Ndụ anụ ahụ Na-arụ ọrụ!

Na-agbanyeghị ihe aka mgba niile anyi na-ezute, Nna anyị nke Eluigwe dị ịhụnaanya echepụtawo atụmatụ nke ańụrị ụdị nke na-emeghị anyị ịda ada.

Ihe were ọtụtụ afọ e nyere m ọrụ inye nkuzi n’ebe obibi otu agadi nwanne nwanyị nọ na ngalaba ukwu m. Ndụ adịrịghị ya mfe. O nwere nsogbu ahụ ike dị iche iche ma nwewo ihe mgbu oge ndụ ya niile nke ihe kpatara ya bụ ihe ọghọm o nwere na mbara egwuregwu. Ọ gbara alụkwaghị m mgbe ọ gbara afọ 32 nwee ụmụ anọ ịzụ ma lekọta, ọ lụgharịrị di mgbe ọ gbara afọ 50. Di ya nke abụọ nwụrụ mgbe ọ dị afọ 66, ma nwanne nwanyị nke a biri ndụ gbakwunyere 26 dị ka nwanyị isimkpe.

Na-agbanyeghị ihe aka mgba ndị juputara na ndụ ya, o kwesịrị ntụkwasị obi na ọgbụgba ndụ niile ya ruo ọgwụgwụ. Nwanne nwanyị nke a bụụrụ onye onye ọrụ usoro ọmụmụ dị uchu, onye na-aga tempụl, na onye nchikọta na odee agụgụala ezi na ụlọ niile. Na-agbanyeghị na o nwere ọtụtụ nnwale siri ike, ma na-ajụghị ajụjụ mgbe ụfọdụ o nwere mwute na ahụ owu, o nwere ihu ọcha na ụdị mmadụ nwere amara ma na-enye obi ụtọ.

Ọnwa itolu mgbe ọ nwụchara, otu niime ụmụ ya ndị nwoke nwetara nhụmiihe dị ịrịba ama na tempụl. Ọ mụtara site nʼike nke Mmụọ Nsọ na nne ya nwere ozi maka ya. Ya na ya kparịtara ụka, ọ bụghị site n’ọhụ ma ọ bụ okwu ndị a na-anụ anụ. Ozi nke a na-enweghị mgbagha na-esote gbatara nuche nke nwa ya nwoke site n’aka nne ya: “A chọrọ m ka ịmata na ndụ anụ ahụ na-arụ ọrụ, ma a chọrọ m ka ịmata na aghọtara m ugbua ihe mere ihe niile ji mee [niime ndụ m] n’ụzọ o siri mee—ma ha niile dị mma.”

Ozi nke a kacha dị ịrịba ama mgbe mmadụ tulere ọnọdụ ya na ihe isi ike niile nwanne nwanyị nke a nagidere ma merie.

Ụmụnne nwoke na Ụmụnne nwanyị, ndụ anụ ahụ na-arụ ọrụ! Ọ bụ ihe emebere ka ọ rụọ ọrụ! Na-agbanyeghị ihe aka mgba niile, obi mgbu niile, na ihe isi ike niile anyị niile na-ezute, Nna anyị nke Eluigwe dị ịhụnaanya, maara ihe, ma zuo oke emebewo atụmatụ nke ańụrị ụdị nke na-emeghị anyị ịda ada. Atụmatụ Ya na-ewetere anyị ụzọ anyị ga-esi emeri ọdịda niile nke ndụ ịnwụ anwụ. Onyenwe anyị ekwuwo, “Nke a bụ ọrụ m na ebube m—iweta na mmezu anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi nke mmadụ.”

Otu osila dị, ọ bụrụ na anyị ga-abụ ndị ga-eketa uru “ọrụ na … ebube,” nke Onyenwe anyị ọbụna “anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi,” anyị ahaghị ịtụanya inwe ọzụzụ na inwe nkuzi, na ịgafe ọkụ nke onye ọnụnụ ọkụ—mgbe ụfọdụ karịsịa ka ike anyị ha. Na izere kpam kpam nsogbu niile, ihe aka mgba niile, na ihe isi ike niile nke ụwa nke a ga-abụ ịgbanarị usoro ahụ dị mkpa n’ezie ga-eme ka ndụ anụ ahụ rụọ ọrụ.

Ma ya mere o kwesịghị ịtụ anyị naanya mgbe ihe ike niile dakwasịrị anyị. Anyị ga-ezute ọnọdụ niile ga-anwale anyị na ndị mmadụ ndị ga-enyere anyị aka ịrụ ọrụ afọ ọma na ndidi ziri ezi. Mana anyị kwesịrị ịnagide n’okpuru ihe isi ike anyị ma cheta, dị ka onyenwe anyị kwuru:

“Ma onye ọbụla nke tọgbọrọ ndụ ya niime ụzọ m, niihi aha m, ga-achọta ya ọzọ, ọbụna ndụ ebighị ebi.

“Ya mere, ụjọ ndị iro unu atụla unu, [ma ọ bụ nsogbu unu niile, ihe aka mgba niile unu, ma ọ bụ nnwale niile nke ndụ nke a], niihi na etiwo m iwu …, ka Onyenwe anyị kwuru, na aga m anwale unu niime ihe niile, ma ọ bụ na unu ga-edebe ọgbụgba ndụ m … ka e wee hụta unu ka ndị tozuru oke.”

Mgbe anyị nwere mmetụta mgbagwoju anya ma ọ bụ nchekasị gbasara nsogbu anyị niile ma ọ bụ chee na anyị nwere ike na-anata karịa ka anyị nwere ike ịnata n’ihe isi ike niile nke ndụ, anyị nwere ike icheta ihe Onyenwe anyị gwara ụmụ Israel:

“Ma unu ga-echeta ụzọ niile nke Chineke Onyenwe unu si duo unu n’afọ iri anọ ndị a niime alaịkpa, iji mee ka unu dị umeala, ma nwalee unu, iji mata ihe [bụ ihe] dị n’obi unu, ma ọ bụ na unu [ga] edobe iwu nsọ ya niile, ma ọ bụ mba.”

Dị ka Lehi si kuziere nwa ya Jekọb ihe:

“Ị tawo ahụhụ mkpagbu niile na nnukwu mwute. … Otu osila dị, … [Chineke] ga-edo mkpagbu gị niile nsọ maka uru gị. … Ya mere, ama m na a gbapụtawo gị, niihi ezi omume nke Onye Mgbapụta gị.”

Maka na ndụ nke a bụ ebe nnwale ma “urukpuru ọchịchịrị nke nsogbu ko n’ofe isi anyị ma na-eyi udo anyị egwu mbibi,” ọ bụ ihe inye aka icheta ndụmọdụ nke a na nkwa a hụrụ niime Mozaya 23 gbasara ihe aka mgba niile nke ndụ: “Na-agbanyeghị—onye ọbụla ọ bụ tụkwasịrị obi ya niime [Onyenwe anyị] onye ahụkwa ka a ga-ebuli elu n’ụbọchị ikpeazụ.”

Dị ka onye ntoroọbịa, mụ nwa n’onwe m nwere nhụmiihe nnukwu mgbu nke uche na ihere nke bịara niihi omume na-ezighị ezi nke ndị ọzọ, nke n’ọtụtụ afọ metụtara uru m bara na echiche nke ntozu oke m niihu Onyenwe anyị. Otu osiladị, ana m agba aka ebe nke onwe m na Onyenwe anyị nwere ike ịkwadosi anyị ike ma bulie anyị elu niime ọnọdụ ihe isi ike niile a kpọkuru anyị inwe nhụmiihe na ya n’oge njem anyị na ndagwurugwu nke anya mmiri nke a.

Anyị maara nke ọma banyere nhụmiihe nke Pọl:

“Ma n’ụjọ ka aghara ibuli m elu karịa otu o kwesịrị site n’uju nke mkpughe niile, [m nataworo] e tinyere ogwu niime anụ ahụ m, onye ozi nke Ekwensu na-eti m aka, n’ụjọ ka aghara ibuli m elu karịa otu o kwesịrị.

“Maka ihe nke a arịọrọ m Onyenwe anyị arịrịọ ugboro atọ, ka o si na-ebe m nọ pụọ.

“Ma ọ sịrị m: Amara m ezuworo gị: niihi na ume m ka e mere ka o zuo oke niime adịghị ike. Ya mere n’obi kachasị dị ụtọ ọbụna ka m ga-eji nye otuto niime adịghị ike m niile, ka ike nke Kraịst wee dakwasị m.”

Anyị amaghị ihe “ogwu niime anụ ahụ” nke Pọl bụụrụ. Ọ họọrọghị ịkọwa ma ọ bụ ọrịa nke anụ ahụ, nke echiche ma ọ bụ adịghị ike nke uche, ma ọ bụ ọnwụnwa. Mana ọ dịghị mkpa anyị imata nkọwada ahụ ịmata na ọ gbara mbọ ma rịọ Onyenwe anyị maka enyem aka ma na, na-ikpeazụ, ume na ike nke Onyenwe anyị bụ ihe ndị nyeere ya aka gabiga ya.

Dị ka ọ dịịrị Pọl, ọ bụ site na enyem aka nke Onyenwe anyị ka m mesịrị nweta mgbam ume nke uche na nke ime mmụọ, ma n’ikpeazụ chọpụta ka ọtụtụ afọ gasịrị na m bụrịị onye bara uru ma tozuo oke banyere ngọzi niile nke ozi ọma. Onye Nzọpụta nyeere m aka imeri mmetụta nke ezughị oke m na ime ka mgbaghara sị n’obi rute onye ahụ mejọrọ. N’ikpeazụ a ghọtara m na Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta bụ onyinye nke onwe m enyere m ma na Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya hụrụ m naanya n’ụzọ zuruoke. Niihi Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta, ndụ anụ ahụ na-arụ ọrụ.

Ebe emesịrị n’ikpeazụ nye m ngọzi ịmata otu Onye Nzọpụta siri napụta m ma guzogide m n’oge nhụmiihe ndị ahụ niile, a ghọtara m n’ụzọ doro anya na ọnọdụ na-adịghị ka esi chọọ nke oge ntolite m bụ njem na nhụmiihe nke onwe m mkpebi nke si na ya na ihe pụtara n’ikpeazụ enweghị ike abụ ihe eji atụnyere ndị ahụ na-atawo ahụhụ ma na-aganiihu ata ahụhụ sitere na omume na-ezighị ezi nke ndị ọzọ.

A matara m na nhụmiihe niile nke ndụ—ma mma ma njọ—nwere ike ikuziri anyị ihe ọmụmụ ndị dị mkpa. Amaara m ugbua ma na-agba ama na ndụ anụ ahụ na-arụ ọrụ! Ana m atụanya na dị ka ihe niile si na nhụmiihe nke ndụ m pụta—ma mma ma njọ—e nwere m ọmịiko maka ndị aka ha dị ọcha ndị nwere nsogbu niihi omume nke ndị ọzọ na ọmịiko maka ndị a na-emegbu emegbu.

Ana m atụanya n’ezie na dị ka ihe niile si na nhụmiihe nke ndụ m pụta—ma mma ma njọ—e nwere m obi ọma karịa n’ebe ndị ọzọ nọ, na-emeso ndị ọzọ omume dị ka Onye Nzọpụta ga-eme, ma nwee nghọta dị ukwuu karịa maka onye mmehie ma na enwere m nguzosi ike n’ezi ihe zuru oke. Mgbe anyị na-abịa adabere na amara nke Onye Nzọpụta ma dobe ọgbụgba ndụ anyị niile,anyị nwere ike bụrụ ndị eji amaatụ nke ogologo uru nke Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta.

Aga m akọwapụta ọmụmaatụ nke ikpeazụ nke bụ na ndụ anụ ahụ na-arụ ọrụ.

Daada na nne nke Okenye Hales.

Daada na nne Okenye Hales, Lois VandenBosch, na nne ya, Klea VandenBosch.

Njem nke ndụ anụ ahụ adịrịghị nne m mfe. Ọ nataghị nturu ugo ọbụla ma ọ bụ oke nsọpụrụ nke ndị ụwa ma nweghị ohere ịgụ akwụkwọ karịa ogo ụlọ akwụkwọ dị elu. O butere ọrịa polio dị ka nwata, nke butere ihe mgbu na enweghị obi ụtọ n’ụkwụ aka ekpa ya oge ndụ ya niile. Dị ka dimkpa, o nwetara ọtụtụ nhụmiihe rara ahụ na aka mgba nke anụ ahụ na ọnọdụ niile gbasara ego mana o kwesịrị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya niile ma ọ hụrụ Onyenwe anyị naanya.

Mgbe nne m gbara afọ 55, nwanne m nwanyị nke tọrọ m nwụrụ, hapụ obere nwa nwanyị nọ ọnwa asatọ, nwa nwanne m nwanyị, ọ bụrụ nwa na-enweghị nne. Niihi ihe dị iche iche, n’ikpeazụ nne m hụtara onwe ya ịzụlite nwa nwanne m nwanyị ruo afọ 17 dịniihu, ọtụtụ mgbe n’okpuru ọnọdụ ndị ihe isi ike ha doro anya. Otu ọ dị, na-agbanyeghị nhụmiihe ndị a niile, o jiri obi ụtọ ma na-enweghị nkwagide jeere ezi na ụlọ ya, ndị agbataobi, na ndị otù ngalaba ukwu ya ozi ma jee ozi dị ka onye ọrụ emume nsọ niime tempụl ọtụtụ afọ. N’afọ ndị ikpeazụ nke ndụ ya, nne m tara ahụhụ site n’otu ụdị ọrịa nchefu ihe, ọtụtụ mgbe ihe na-agbagwoju ya anya, ma ebusa ya n’ụlọ ọrụ na-enye nlekọta. Na mwute, naanị ya nọọrọ mgbe ọ nwụrụ mgbe na-atụghị anya.

Mgbe ọnwa ole ma ole ọnwụ ya gasịrị, a rọrọ m nrọ nke m na-enweghị ike ichefu. Niime nrọ m, a nọdụrụ m ọdụ niime ụlọ ọrụ m n’Isi Ụlọ ọrụ Nzukọ nsọ. Nne m batara n’ụlọ ọrụ ahụ. A matara m na o si n’ala mmụọ bịa. Aga m echeta mgbe niile mmetụta ndị m nwere. O nweghị ihe ọbụla o kwuru, mana ọ mukere mma nke ime mmụọ nke m na-enwetatụbeghị nhụmiihe ya mbụ na nke rara m ahụ ịkọwa.

Ụcha ihu na ọdịdị ya dịịrị ịtụnaanya n’ezie! Echetara m ịsị ya, “Mama, ị mara mma nke ukwuu!,” na-arụtụ aka na ike nke ime mmụọ na mma ya. O kelere m—ọzọ na-ekwughị okwu. Ịhụnaanya o nwere n’ebe m nọ metụtara m, ma a maara m mgbe ahụ na obi dị ya ụtọ ma agwọwo ya site na nchekasị niile na ihe aka mgba niile nke ndụ ya n’ụwa ma na-echesị ike “mbilite n’ọnwụ dị ebube.” A maara m na maka Mama, ndụ anụ ahụ na-arụ ọrụ—ma na ọ na-arụ ọrụ maka anyị, kwa.

Ọrụ na otuto nke Chineke bụ iwete na mmezu anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi nke mmadụ. Nhụmiihe niile nke ndụ anụ ahụ bụcha akụkụ njem nke na-ekwe anyị ito eto ma gaaniihu chewe ihu na ndụ anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi ahụ. Eziteghị anyị ebe a ịda ada mana irite uru na atụmatụ nke Chineke nwere maka anyị.

Dị ka Eze Benjamin kuziri: “Ma nke ka nke, aga m achọ ka unu tụgharịa uche na ngọzi na ọnọdụ an̄ụrị nke ndị ahụ na-edebe iwu nsọ niile nke Chineke. Niihi na lee, agọziri ha n’ihe niile ma n’ihe nke anụ ahụ ma ihe nke mmụọ; ma ọ bụrụ na ha anọgide n’okwukwe ruo ọgwụgwụ a ga-anabata ha niime eluigwe, nke mere na ha na Chineke ga-ebi n’ọnọdụ an̄ụrị na-enweghị ọgwụgwụ.” Ya mere, ndụ anụ ahụ na-arụ ọrụ!

Ana m agba ama na dị ka anyị na-anata emume nsọ niile nke ozi ọma, banye na ọgbụgba ndụ niile anyị na Chineke ma mesịa dobe ọgbụgba ndụ ndị ahụ, chegharịa, jeere ndị ọzọ ozi, ma nagide ruo ọgwụgwụ, anyị nwekwara ike nwee mmasi obi ike na ntụkwasị obi zuruoke niime Onyenwe anyị na ndụ anụ ahụ na-arụ ọrụ! Ana m agba ama banyere Jizọs Kraịst ma na ọdịniihu anyị dị ebube anyị na Nna nke Eluigwe ka e mere ka okwe omume site na amara na Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta. N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.