Ọgbakọ Zuru ọha
Na-achọta Azịza niile nye Ajụjụ niile nke Ime mmụọ
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


Na-achọta Azịza niile nye Ajụjụ niile nke Ime mmụọ

Ajụjụ anyị niile si n’obi nwere ike wetere Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ohere niile iji nyere anyị aka too.

Ama m na nke a ga-abịa dị ka ihe ịtụnaanya, mana etoruwo m nke ọma icheta mgbe akuziiri anyị ihe n’ụlọ akwụkwọ na enwere planet itolu dị niime sola sistem anyị. Otu niime planet ndị ahụ, Pluto, ka enyere aha ya site n’aka Venetia Burney nke Oxford, England, gbara afọ 11, mgbe achọpụtachara ya na 1930. Ma ruo 1992, ekwenyere na Pluto bụ ihe kacha dị anya niime sola sistem anyị. N’oge nke a, ana achọtakarị papier mâché ụdị agbataobi nke planet anyị niime klas na sayensị fair niile, nke ọbụla negosi ọnọdụ nke Pluto n’ókèala ama ama. Ọtụtụ ọkachamara sayensị kwere na a gafee ọnụ ebe ahụ, sola sistem nke dị n’ezi juputara n’oghere na-enweghị ihe dị niime ya.

Kosiladị, ajụjụ na-adịgide adịgide fọdụụrụ n’etiti obodo nke sayensị gbasara nsipụta ụdị comet kpọmkwem nke ndị mmụta mbara igwe sooro mgbe niile. Ma ajụjụ ahụ nọgidere ruo ọtụtụ iri afọ tupu nchọpụta nke mpaghara akụkụ ọzọ dị anya nke sola sistem anyị. Site na mmata ihe ahụ belatara ebelata ha nwere, ọka mmụta sayensị jiiri ọtụtụ iri afọ ndị ahụ tinyere aka imepụta ọganiihu teknụzụ ndị dị iriba ama ndị mere ka enwee mmụta na nnyocha dị niihu. Ọganiihu ha n’ikpeazụ hazigharịrị mpaghara nke planet anyị ma rọpụta idozigharị Pluto na mpaghara oghere ọhụrụ nke a ma sola sistem anyị enwee planet asatọ.

Otu isi ọka mmụta sayensị planet na onyeisi nnyopụta maka ozi Horizon Ọhụrụ niile enyere ọrụ nke nnyochagharị Pluto nso nwere ikwu nke a banyere nhụmiihe nke a: “Anyị chere na anyị ghọtara ọdịdị ala nke sola sistem anyị. Anyị amaghị. Anyị chere na anyị ghọtara ọnụ ọgụgụ planet ndị dị niime sola sistem anyị. Ma anyị dara ya ada.”

Ihe pụtara ìhè nye m gbasara oge agụgụala nke nnyocha oghere nke a bụ ụfọdụ ihe ndị yiri na isi ndịiche dị netiti nchụso nke mbụrụ banyere mgbasa horizon nke sayensị na njem nke na anyị, dị ka ụmụ Chineke, na-ahọrọ ịchọ azịza niile nye ajụjụ ime mmụọ anyị niile. Kpọm kwem, kedụ otu anyị ga-esi enye azịza maka mbelata niile nke nghọta ime mmụọ anyị ma kwadoo onwe anyị maka ọgbọ nke na-esote maka uto nke onwe—ma olee ebe anyị ga-eleba anya maka enyemaka.

Ahịrị n’elu Ahịrị

Ịjụ ajụjụ niile na ịchọgharị maka mpụtara bụ akụkụ nke nhụmiihe ndụ pụrụ ịnwụ anwụ eke na nke a na-emekarị. Mgbe ụfọdụ, na-ejighị azịza ndị zuru oke nwere ike ịkpọta anyị ebe nghọta anyị kwụsịrị, ma mmachi ndị ahụ nwere ike dịrị ka ihe nkụda mmụọ ma ọ bụ ihe ijuanya. N’ụzọ dị ịtụnaanya, atụmatụ obi ụtọ nke Nna nke Eluigwe maka anyị niile ka e mere iji nyere anyị aka gaaniihu agbanyeghị mmachi anyị niile ma mepụta ihe ndị anyị na-enweghị ike imepụta nonwe anyị, ọbụna na-enweghị mmata ihe nke ihe niile zuru oke. Atụmatụ nke Chineke dị obi ebere nye mmachi niile nke ịbụ mmadụ anyị; na-ewetere anyị Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, ịbụ Onye Ọzụzụ atụrụ Ọma anyị; ma na-akpate mmụọ anyị iji ohere nhọrọ anyị wee họrọ Ya.

Okenye Dieter F. Uchtdorf akuziwo na “ịjụ ajụjụ abụghị akara nke adịghị ike,” ma kama “ọ bụ ihe na-edute uto.” Ikwu okwu kpọmkwem nye mgbalị nke onwe anyị dị ka ndị na-achọ eziokwu, onye amụma anyị, Onyeisi Russell M. Nelson, akuziwo na anyị garịrị enwe “ọchịchọ miri emi” ma “rịọ n’obi ziri ezi na ezi nzube, na-enwe okwukwe niime [Jizọs] Kraịst.” Ọ gawo niihu kuzie na “‘ezi nzube’ pụtara na mmadụ n’ezie chekubere isoro odudu sinachi enyere.”

Mgbalị nke onwe anyị itolite n’amamiihe nwere ike duba anyị inyocha ajụjụ anyị niile, dị mgbagwoju anya ma ọ bụ otu ọzọ, site n’anya nke ihe mkpatara na ihe mmetụta, na-achọpụta ma na-amata nsoro niile na emesịa na-emepụta nkọwa ga-ahazi nghọta anyị ma mejuputa oghere ndị echere nọ na mmata ihe. Mgbe anyị tulere ọchịchọ anyị nke mmata ihe nke ime mmụọ, kosiladị, usoro echiche ndị a nwere ike inye aka mgbe ụfọdụ mana n’onwe ha nwere ike bụrụ ihe na-ezughị oke dị ka anyị na-ele ịmata ihe niile banyere Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, ozi ọma Ha, Nzukọ nsọ Ha, na atụmatụ Ha maka anyị niile.

Ụzọ nke Chineke Nna na Ọkpara Ya si enye anyị amamiihe Ha na-ebute ụzọ akpọku ike nke Mmụọ Nsọ ịbụrụ onye nkuzi nke onwe anyị dị ka anyị na-edebe Jizọs Kraịst netiti ndụ anyị na niime ọchịchọ anyị kwesịrị ntụkwasị obi maka azịza Ha niile na mpụtara Ha niile. Ha na-akpọku anyị ịchọpụta eziokwu site n’oge aranyere iji mụọ akwụkwọ nsọ dị nsọ na iji chọọ maka eziokwu ụbọchị ikpeazụ ekpughere maka ụbọchị anyị na oge anyị, enyere site n’aka ndị amụma na ndị ozi oge ugbu a. Ha na-arịọsi anyị ike itinye oge mgbe niile, oge ife ofufe niime ụlọ nke Onyenwe anyị na anyị igbu ikpere nala n’ekpere “iji nwete ozi sitere n’igwe.” Nkwa Jizọs kwere ndị ahụ nọ anọ ịnụrụ Okwu Chukwu Ya n’elu Ugwu bụ eziokwu nye anyị n’ụbọchị anyị dị ka ọ dị n’oge ije ozi Ya n’elu ụwa: “Rịọ, ma aga enye gị ya; chọọ, ma ị ga-achọta; kụọ aka, ma a ga-emeghere gị ya.” Onye Nzọpụta anyị na-ekwe nkwa na “Nna gị nke nọ n’eluigwe na-enye ihe niile dị mma nye ha ndị rịọrọ ya.”

Usoro nkuzi nke Onyenwe anyị bụ “ahịrị n’elu ahịrị, usoro n’elu usoro.” E nwere ike na-achọ n’aka anyị “ichere Onyenwe anyị” n’oghere dị na-agbata ahịrị nke nghọta anyị ugbu a na nke ọzọ na-esote a ka ga-enye. Oghere nke a dị nsọ nwere ike bụrụ ebe ọzụzụ ime mmụọ anyị kachasị nwere ike ime—ebe anyị nwere ike “inwe ndidi” ọchịchọ anyị si n’obi ma megharịa ume anyị ọhụrụ ịganiihu na-edebe nkwa niile dị nsọ anyị na Chineke meworo site n’ọgbụgba ndụ.

Mmekọrịta ọgbụgba ndụ anyị na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst na-agbara mmeri ịbụ amala niile alaeze nke Chineke. Ma ịbụ onye obibi niime ya na-achọ anyị ịhazi ndụ anyị nye ụkpụrụ niile sinachi ma na-etinye mgbalị iji tolite niime mmụọ.

Nrube isi

Otu ụkpụrụ bụ isi akuziri gburugburu Akwụkwọ nke Mọmọn bụ mgbe ụmụ Chineke họọrọ igosi nrube isi ma debe ọgbụgba ndụ ha, ha natara odudu na ntuziaka ime mmụọ na-aganiihu. Onyenwe anyị agwawo anyị na site na nrube isi na nrụsi ọrụ, ike anyị nwere ike rite mmata ihe na ọgụgụ isi. Iwu niile na iwu nsọ niile nke Chineke ka a na-emeghị ịbụ ihe mkpọji ụkwụ niime ndụ anyị mana ụzọ ama siri ike nye mkpughe nke onwe na agụmakwụkwọ ime mmụọ. Onyeisi Nelson akuziwo eziokwu ahụ dị oke mkpa na “mkpughe sitere n’aka Chineke na-adakọta mgbe niile ya na iwu ebighị ebi Ya” ma gaaniihu na “ọ naghị emegide ozizi Ya ma ọlị.” Nrube isi gị si n’obi nye iwu niile nke Chineke, agbanyeghị enweghị mmata ihe zuru oke nke ebumnoobi Ya, n’edebe gị niime otu ndị amụma Ya. Mosis 5 na-akuziri anyị banyere otu mmekọrịta kpọmkwem mere n’etiti Adam na onye mmụọ ozi nke Onyenwe anyị.

Mgbe Onyenwe anyị nyesịrị Adam na Iv “iwu nsọ niile, na ha ga-efe Onyenwe anyị Chineke ha ofufe, na ha ga-enye ụmụ mbụ niile nke igwe ewu na atụrụ ha, ka ha bụrụ ihe onyinye nye Onyenwe anyị,” na Adam dịịrị nrube isi nye iwu nsọ niile nke Onyenwe anyị.” Anyị gara niihu na-agụ na “mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị otu mmụọ ozi nke Onyenwe anyị wee pụtakwute Adam, na-asi: Gịnị mere iji na-achụ aja niile nye Onyenwe anyị? Ma Adam wee sị ya: Amataghị m, ewezuga na Onyenwe anyị nyere m iwu ka m mee nke a.

Nrube isi nke Adam butere nghọta ya ụzọ ma kwadoro ya ịnata mmata ihe dị nsọ na o sonyere niime ihe akara nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. Nrube isi anyị dị umeala ga, dịkwa ka, meghee ụzọ maka nghọta ime mmụọ anyị nke ụzọ nke Chineke na ebumnoobi Ya dị nsọ maka onye ọbụla niime anyị. Ruo imelite nrube is anyị na-akpọta anyị nso nso nye Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, niihi na nrube isi nye iwu Ya niile na iwu nsọ Ya niile n’ụzọ dị irè bụ ịgakwuru Ya.

Na mgbakwunye, ikwesị ntụkwasị obi anyị nye mmata ihe na amamiihe anyị keteworo rịị site na nkwesị ntụkwasị obi nye ụkpụrụ niile nke ozi ọma na ọgbụgba ndụ niile dị nsọ bụ nkwado dị mkpa maka njikere anyị ịnata ma bụrụ ndị nlekọta nke ozi niile sitere n’aka Mmụọ Nsọ.

Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst bụ nsipụta nke eziokwu niile ma na-ekekọrịta amamiihe Ha na mesapụ aka. Ọzọkwa, ịghọta na anyị enweghị mmata nke onwe na-adabereghị na Chineke nwere ike nyere anyị aka mara onye anyị ga-agbakwuru na ebe anyị ga-atụkwasị obi anyị n’ezie.

Ntụkwasị obi Miri emi

Nkọwapụta na Agba Ochie banyere Naaman, onye ndu otu ndị agha onye agwọrọ ọrịa ekpenta site n’aka onye amụma Elisha, bụ nke kachasị dị m mmasị. Akụkọ ahụ gosipụtara otu okwukwe siri ike nke otu “nwa agbọghọ nta” si gbanwee ụzọ ndụ nke otu nwoke ma, nye ndị niile kwere ekwe, kpughere nrute nke ebere nke Chineke nye ndị ahụ tụkwasịrị obi na Ya na onye amụma Ya. Agbanyeghị akpọghị aha ya, nwa agbọghọ nta nke a nyekwara aka ime ka nghọta anyị gaaniihu. Ma nkwenye nke Naaman n’ama ya kpatere mmụọ ya iwega arịrịọ ya maka ọgwụgwọ ruo naka nwa odibo nke Chineke ahọpụtara.

Azịza nke Naaman nye iwu niile nke onye amụma Elisha ịsacha niime osimiri Jodan na mbụ dịịrị obi abụọ ma na-ewe iwe. Mana ọkpụkpọ oku maka ya ịdị nrube isi nye ndụmọdụ nke onye amụma meghere ụzọ maka ọgwụgwọ ya na nghọta ya dị egwu na Chineke dị adị n’ezie.

Anyị nwere ike chọpụta na ụfọdụ arịrịọ ime mmụọ anyị nwere azịza ezi uche bara uru ma nwere ike gaghị enye anyị obi erughị ala dị mma. Ma ọ bụ, dị ka Naaman, anyị nwere ike chọta na mkpa ndị ọzọ na-ama aka karịa ma nwere ike bute mmetụta siri ike ma dị mgbagwoju anya niime anyị. Ma ọ bụ, yiri nkọwa nchịkọta ndị mbu ụzọ ndị mmụta mbara igwe banyere sola sistem anyị, niime nnyocha anyị maka eziokwu ime mmụọ, anyị nwere ike nwete ntapịa na-ezuchaghị oke ọ bụrụ ma anyị dabere naanị na nghọta nke onwe anyị belatara ebelata, nsonazụ dị mwute na nke ebughị n’uche nke nwere ike idufu anyị site n’ụzọ ọgbụgba ndụ. Ma ọzọkwa, ụfọdụ ajụjụ nwere ike nọgide tutu ruo Chineke, onye “ji ike niile” na “amamiihe niile, na nghọta niile,” onye “na-aghọta ihe niile” site na ebere Ya, na-ewete nghọta site na nkwenye anyị n’aha Ya.

Otu ịdọ aka na ntị dị ịrịba ama sitere na nkọwapụta nke Naaman bụ na iguzogide nrube isi nye iwu niile na iwu nsọ niile nke Chineke nwere ike gbatịa ma ọ bụ gbuo oge uto anyị. Agọziri anyị agọzi inwe Jizọs Kraịst dị ka Onyeisi Ọgwọ ọrịa anyị. Nrube isi anyị nye iwu niile na iwu nsọ niile nke Chineke nwere ike meghee ụzọ maka Onye Nzọpụta anyị iwete nghọta na ọgwụgwọ Ọ maara na anyị chọrọ, dị ka otu atụmatụ ọgwụ ọgwụgwọ Ya maka anyị siri dị.

Okenye Richard G. Scott kuziri na “ndụ nke a bụ nhụmiihe ntụkwasị obi miri emi—ntụkwasị obi niime Jizọs Kraịst, ntụkwasị obi niime nkuzi Ya niile, ntụkwasị obi n’ike anyị dị ka Mmụọ Nsọ si duo irube isi nye nkuzi ndị ahụ maka obi ụtọ ugbu a na maka ịdị adị ebighị ebi kacha enwe obi ụtọ, nwere nzube. Ịtụkwasị obi pụtara iji obi anyị niile erube isi na-amaghị nsọtụ site na mmalite (lee Ilu. 3:5-7). Maka ịmịpụta mkpụrụ, ntụkwasị obi gị niime Onyenwe anyị ga-adịrịrị ike ma dị nnakwere karịa obisike gị na mmetụta na nhụmiihe nke onwe gị.”

Okenye Scott garaniihu: “Inwe okwukwe bụ ịtụkwasị obi na Onyenwe anyị maara ihe O ji gị na-eme nakwa na Ọ pụrụ imepụta ya maka ọdịmma ebighị ebi gị ọbụnadị na i nweghị ike ịghọta otu Ọ pụrụ isi mee ya nnọọ.”

Ama Mmechi

Ezigbo ndị enyi, ana m agba ama na ajụjụ anyị niile si n’obi nwere ike wetere Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ohere niile iji nyere anyị aka too. Mbọ nke onwe m nye ịchọ azịza niile sitere n’aka Onyenwe anyị nye ajụjụ niile nke ime mmụọ nke onwe m—nke gara aga na nke nọ ugbu a—ekwewo m iji oghere dị n’etiti ahịrị niile nke nghọta m na nke Chineke inwe nrube isi nye Ya na ikwesị ntụkwasị obi nye mmata ihe ime mmụọ nke m nwere ugbu a.

Ana m agba ama na idebe ntụkwasị obi gị niime Nna nke Eluigwe na ndị amụma Ya, ndị O ziteworo, ga-enyere gị aka ibulite site niime mmụọ ma gaaniihu chuwe ihu na horizon nke Chineke gbasara agbasa. Ebe nleru anya gị ga-agbanwe niihi na ị ga-agbanwe. Chineke maara na ka ị gbagoro elu karịa, ka inwere ike ịhụ ebe dị anya. Onye Nzọpụta anyị na-akpọku gị ime nrigoro ahụ. Site n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.