Ọgbakọ Zuru ọha
Nye Mgbọrọgwụ ndị ahụ Ọzụzụ, ma Alaka ndị ahụ Ga-eto
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


Nye Mgbọrọgwụ ndị ahụ Ọzụzụ, ma Alaka ndị ahụ Ga-eto

Alaka niile nke ama unu ga-adọrọ ume site na mmikpu okwukwe unu na Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya Ọ Hụrụ naanya.

Otu Ụlọ ụka Ochie n’obodo Zwickau

Afọ nke 2024 bụ nnọọ afọ ihe ịrịba ama nye m. Ọ na-egosi afọ 75 kemgbe emerem baptizim ma nabata m ịbụ onye otù nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a na Zwickau, Germany.

Ịbụ onye otù m niime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst bụ ihe dị oke ọnụ ahia nye m. Ị bụ onye agụkọrọ ọnụ mụ na ndị ọgbụgba ndụ Chineke, mụ na unu, ụmụnnem ndị nwoke na nwanyị, bụ otu niime ihe ugwu kachasị na ndụ m.

Mgbe m na-eche banyere njem nke ịbụ onye otù, uche m mgbe ụfọdụ na-alaghachi azu niime obodo ochie na Zwickau, ebe m nwere mbụniisi pụrụiche maka ije ọgbako oriri nsọ niile nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst dị ka nwata. Ọ bụ ebe ahụ ebe mkpụrụ nke ama m natara ọzụzụ nke isimbụ ya.

Ụlọ ụka ahụ nwere otu ọgan nke na-eji ikuku akpọ. Ụbọchị Sọnde ọbụla, a na-ekenye otu nwa okoroọbịa ọrụ ịkwa lever ahụ aka gbago elu ma gbada ka bellows ahụ mee ka ọgan ahụ kpọọ. Mgbe ụfọdụ enwetere m nnukwu ọhere a nke isonye n’ọrụ a dị mkpa.

Mgbe ndị igwe ụka na-abụ ọmalicha abụ anyị, ana m akwa ya jiri ike m niile ka ọgan ahụ ghara ịnyụ niihi ikuku agwuwo. Site n’oche ebe ahụ a na-akwa bellow ahụ, ana m ahụ ihe osise akanyere na mpio na-akụwa akụwa, otu bụ Jizọs Kraịst Onye Nzọpụta ma nke ọzọ bụ Joseph Smith n’ebe Ọdọ Osisi Dị Nsọ.

A ka m na-echeta mmetụta ndị ahụ dị nsọ m nwetere dị ka m na-ele mpio ahụ na-achake niihi anwụ mgbe m na-ege ama niile nke ndị nsọ ma dị ka ha na-agụ abụ nke Zayọn.

N’ebe ahụ dị nsọ, Mmụọ nke Chineke gbara m aka ebe n’uche m ma n’obi m na ọ bụ eziokwu: Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta nke ụwa. Nke a bụ Nzukọ nsọ Ya. Onye amụma Joseph Smith hụrụ Chineke Nna na Okpara Ya, Jizọs Kraịst ma nụ olu Ha.

Na mbido afọ nke a, mgbe m gara ọrụ na Europe, enwetere m ohere ịlaghachi na Zwickau. Na mwute, ụlọ ụka ochie ahụ anọghịzi ebe ahụ. A kụtụrụ ya ọtụtụ afọ gara aga iji nye ohere maka owuwu nnukwu ụlọ ebe ndị mmadụ bi.

Kedụ Ihe dị Ebighị ebi, ma Kedụ Ihe Na-adịghị?

Ka m kwuo eziokwu na ọ bụ ihe mwute ịmata na ọmalịcha ụlọ ahụ nke oge nwata m bụzi ihe ebuniisi. Ọ bụụrụ ụlọ dị nsọ nye m. Mana ọ ka bụkwa naanị ụlọ.

N’ụzọ dị iche, aka ebe ime mmụọ m nwetere site na Mmụọ Nsọ ọtụtụ afọ ndị ahụ gara aga agafebeghi. N’eziokwu, o towo sie ike. Ihe ndị m mụtara na ntoroọbịa m banyere ụkpụrụ ntọala nke ozi ọma Jizọs Kraịst abụrụwo ntọala dị ike nkem ogologo ndụ m niile. Ọgbụgba ndụ njikọta nke m hiwere mụ na Nna m nke Eluigwe na Ọkpara Ọ Hụrụ naanya anọgideworo m—gafee mgbe a akụdara ụlọ ụka Zwickau ma mpio ahụ na-akụwa akụwa efuo.

“Eluigwe na ụwa ga-agafe,” ka Jizọs kwuru, “mana okwuọnụ m agaghị agafe.”

“Niihi na ugwu ukwu niile ga-apụ ma a ga-ewepụ ugwu nta niile, mana obiọma m agaghị esị n’ebe ị nọ pụọ, ọ bụghị ma ọgbụgba ndụ nke udo m aga ewepụ ya, ka Onyenwe nwe anyị kwuru.”

Otu niime ihe dị mkpa anyị nwere ike ị mụta na ndụ a bụ ihe ndịiche dị n’etiti ihe dị ebighị ebi na ihe na-adịghị. Ozugbo anyị ghọtara nke a, ihe niile agbanwee—mmekọrịta anyị, nhọrọ niile anyị na-eme, ụzọ anyị si emeso ndị mmadụ.

Ịmata ihe dị ebighị ebi na ihe na-adịghị bụ ntụghe eji azulite ama nke Jizọs Kraịst na Nzukọ nsọ Ya.

Echekwala na Alaka bụzi Mgbọrọgwụ

Ozi ọma Jizọs Kraịst eweghachitere, dị ka otu Onye amụma Joseph Smith kuziri, na “anabata onye niile, ma ihe niile ndị bụ eziokwu.” Mana nke ahụ apụtaghị na eziokwu niile nwere otu ụdị uru. Ụfọdụ eziokwi bụ isi, dị mkpa, nọrọ na mgbọrọgwụ nke okwukwe anyị. Ndị ọzọ bụ mgbakwụnye ma ọ bụ alaka—ha bara uru, mana naanị mgbe ejikọtara ha nye ndị ahụ kacha mkpa.

Onye amụma Joseph Smith kwukwara sị, “Isi ukpuru niile nke okpukperechi anyị bụ ama nke Ndị Ozi na Ndị amụma gbasara Jizọs Kraịst, na Ọ nwụrụ, elie ya, ma bilite ọzọ n’ụbọchị nke atọ, ma rigooro n’eluigwe; ma ihe ndị ọzọ niile nke metụtara okpukperechi anyị bụ naanị ihe ndị agbakwụnyere niime ya”

Nke a pụtara na, Jịzọs Kraịst na aja mgbaghara mmehie Ya bụ mgbọrọgwụ nke ama anyị. Ihe ndị ọzọ bụ alaka.

Nke a apụtaghị ikwu na alaka abaghị uru. Alaka dịịrị osisi mkpa. Mana dị ka otu Onye Nzọpụta gwara ndị na-eso ụzọ Ya, “Alaka enweghi ike ịmị mkpụrụ n’onwe ya, ma ọ bụrụ na ọ nọgịdeghị na vaịn.” Ma enweghi njikọ anyị na Onye Nzọpụta, ma nwete ọzụzụ ahụ a na-ahụ na mgbọrọgwụ, alaka ga-akpọnwụ ma nwụọ.

Abịa na ịnye ama anyị na Jizọs Kraịst ọzụzụ, ana m eche ma anyị mgbe ụfọdụ anyị a na-eche na alaka buzi mgbọrọgwụ. Nke a bụ njehie nke Jizọs hụtara niime Ndị Farisii nke ụbọchị Ya. Ha tinyere uche n’ụzọ gafere oke niime umu ururu ihe nke iwu nke mere ha jiri hapụ ihe Onye Nzọpụta kpọrọ “ihe ndị kacha dị mkpa”—ụkpụrụ ntọala dị ka “ikpe ziri ezi na ebere na okwukwe.”

Ọ bụrụ na ịchọrọ inye osisi ọzụzụ, a naghị akwọsa mmiri na alaka. Ị ga-agba mgbọrọgwụ ahụ mmiri. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ịchọrọ ka alaka nke ama gị too ma mịa mkpụrụ, nye mgbọrọgwụ ahụ ọzụzụ. Ọ bụrụ na ịnwere mgbagwoju anya banyere otu ozizi ma ọ bụ omume ma ọ bụ mmewere nke agụgụala Nzụkọ nsọ, chọọ ido anya jiri okwukwe na Jizọs Kraịst. Chọọ ka ị ghọta aja ọ tụrụ maka gị, ịhụnaanya ọ nwere maka gị, uche Ya maka gị. Soro Ya n’obi dị umeala Alaka niile nke ọgbugba ama unu ga-adọrọ ume site na mmikpu okwukwe unu na Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya Ọ Hụrụ naanya.

Na ịma atụ, ọ bụrụ na ịchọrọ ama dị ike banyere Akwụkwọ nke Mọmọn, lekwasị anya n’aka ebe ya nke Jizọs Kraịst. Ịhụwo otu Akwụkwọ nke Mọmọn sị agba aka ebe maka Ya, ihe ọ na-akuzi banyere Ya, ma otu ọ si akpọku ma na-akpali gị ịbịakwute Ya.

Ọ bụrụ na-achọ inwete nhụmiihe bara uru n’oge ọgbakọ Nzukọ nsọ ma ọ bụ na tempụl, gbalịa chọọ Onye Nzọpụta niime emume nsọ ndịa ahụ dị nsọ nke anyị na-anata ebe ahụ. Chọọ Onyenwe anyị niime ụlọ nsọ Ya.

Ọ bụrụ na ike agwụwo gị ma ọ bụ ọkpụkpọ okù nke Nzukọ nsọ ejuwo gị isi, gbalịa lekwasịgharịa anya na ije ozi gị na Jizọs Kraịst. Mee ya ka ọ bụrụ ihe ngosipụta ịhụnaanya i nwere maka Ya.

Nye mgbọrọgwụ ndị ahụ ọzụzụ, ma alaka ndị ahụ ga-eto. Ma dị ka oge na-aga, ha ga-amị mkpụrụ.

Gbaa mgbọrọgwu ma Wulite Elu niime Ya

Okwukwe dị ike niime Jizọs Kraịst anaghị eme ozugbo ozugbo. Mba, niime ụwa nke anụ ahụ nke a, ọ bụ ogwu na ahịhịa mmerụ ahụ nke obi abụọ na-eto ozugbo ozugbo. Osisi okwukwe nke ahụ nwere ezi ahụike chọrọ mgbalị akpachara anya mee. Ma otu akụkụ dị mkpa nke mgbalị ahụ bụ ịhụ na anyị gbara mgbọrọgwụ dị ike na Kraịst.

Na ịma atụ: Na mbụ, enwere ike dọta mmasị anyị na ozi ọma nke Onye Nzọpụta na Nzukọ nsọ niihi omume ọma ndị otù na otu Bishọp dị obi ebere mesoro anyị ma ọ bụ otu ụlọ ụka jiri dịrị ụcha. Ọnọdụ ndịa dị mkpa n’ezie izulite ha na Nzukọ nsọ.

Na-agbanyeghi, ọ bụrụ na mgbọrọgwụ nke ama anyị emikpughị ime ma ọlị karịa otu ahụ, kedụ ihe ga-eme mgbe anyị gara ngalaba ukwu ọzọ nke na-enwechaghị ụlọ mara mma, nwere ndị otù na-adịchaghị eme enyi, ma ọ bụ bishọp ekwuo otu ihe were anyị iwe?

Ịma atụ ọzọ: O yighị ihe ezi uche dị na ya inwe olile anya na ọ bụrụ n’anyị dobe iwu nsọ ma mee nrachi na tempụl, a ga-agọzi anyị jiri nnukwu ezi na ụlọ ụmụaka nwere obi ụtọ, maara ihe, na-erube isi, ndị ha niile nọgidere nkọ na Nzukọ nsọ, jee mishọn, bụọ abụ na otù ndị kwaya ngalaba ukwu, ma họpụta onwe ha isoro hicha ụlọ ụka ụtụtụ Satọde ọbụla?

Enwere m olile anya na anyị niile ga-ahụ ihe ndịa nime ndụ anyị niile. Mana ọ bụrụkwanụ na nke a emeghi? Anyị ọ ga-anọrọ na nkedo nye Onye Nzọpụta na-agbanyeghi ọnọdụ ọbụla—wee tụkwasị obi na Ya na n’oge Ya?

Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ajụjụ: Ama m ọ dabeere n’elu ihe m chọrọ ka ọ mee na ndụ a? Ọ dabere n’elu omume na agwa ndị ọzọ? Ka ọ bụ na ehiwere ya n’ụzọ siri ike n’elu Jizọs Kraịst, “gbara mgbọrọgwu ma ewulite elu na Ya,” na-agbanyeghi ọnọdụ ndụ na-agbanwe agbanwe?

Omenala, Agwa niile, na Okwukwe

Akwụkwọ nke Mọmọn na-ekwu maka ndị mmadụ ndị “siri ike n’idobe emume-nso niile nke Chineke.” Mana ka emesịrị otu onye ekweghi ekwe Kọrịhọ abịa, na-akwa ozi ọma Onye Nzọpụta emo, na-akpọ ya “ihe nzuzu” na “omenala nzuzu niile nke ndị nna ha” Kọrịhọ “dufuru obi nke ọtụtụ mmadụ, na-eme ha ka ha welite isi ha niime ajọọ omume ha.” Mana ndị ọzọ ọ nweghi ike idufu, niihi maka ha, ozi ọma nke Jizọs Kraịst bụ ihe karịrị omenaala.

Okwukwe dị ike mgbe ọ nwere mgbọrọgwụ miri emi niime nhụmiihe nke onwe, mkpebi onwe nye Jizọs Kraịst, nke na-adabeghị n’elu ihe omenaala anyị bụ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ nwere ike ikwu ma ọ bụ mee.

Ama anyị ka a ga-anwa ma nwalee. Okwukwe abụghị okwukwe ma ọ bụrụ na anwaghị ya ma ọlị. Okwukwe adịghị ike ma ọ bụrụ na emegideghi ya ma ọlị. Niihi nke a obi adala gị mba ma ọ bụrụ na inwere mnwale nke okwukwe ma ọ bụ ajụjụ ndị na-enweghi azịza.

Anyị ekwesịghị ịghọtacha ihe niile tupu anyị eme ihe. Nke ahụ abụghị okwukwe. Dị ka Alma kuziri, “Okwukwe abụghị inwe mmata ihe zuru oke nke ihe niile.” Ọ bụrụ na anyị kwụsị imee ihe tutu ruo mgbe ajụjụ anyị niile nwetere azịza, anyị na-ebelata ihe ọma ahụ anyị nwere ike imezu, ma anyị na ebelata ike nke okwukwe anyị.

Okwukwe mara mma niihi ọ na anọgide ọbụna mgbe ngọzi anaghị abịa otu anyị chọrọ. Anyị enweghi ike ịhụ ọdịniihu, anyị amaghị azịza niile, mana anyị nwere ike ịtụkwasị obi na Jizọs Kraịst dị ka anyị na-aga niihu ma n’elu niihi Ọ bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị.

Okwukwe na anagide mnwale na mgbagwoju anya niile nke ndụ niihi ọ gbara mgbọrọgwụ siri ike na Kraịst ma na ozizi Ya. Jizọs Kraịst, na Nna anyị nke Eluigwe onye zitere Ya, ha abụọ bụ ndị na-enweghị mgbagha, ndị tozuru oke ndabere na ntụkwasịrị obi anyị.

Ama abụghị ihe i ga-ewu ozugbo ma ya eguzoro ruo mgbe ebighị ebi. Ọ dị nnọọ ka osisi a ga na-enye ọzụzụ mgbe niile. Ịkụnye okwu Chineke niime obi anyị bụ naanị nzọụkwụ nke mbụ ahụ. Ozugbo ama gị malitere na-eto, mgbe ahụ ka ezi ọrụ ahụ bidoro! Mgbe ahụ ka i ga “azụ ya na nnukwu mkpachapụ anya, ka o wee nweta mgbọrọgwụ, ka o wee tolite, ma wepụta mkpụrụ.” Ọ na-ewe “nnukwu nrụsị ọrụ ike” na “ndidi na okwu.” Mana nkwa nke Onyenwe anyị kwụ chịm: “Unu ga-aghọrọ ụgwọ ọrụ niile nke okwukwe unu, na mgbalị unu, na ndidi, na ogologo ntachi obi, na-echere ka osisi ahụ wepụta mkpụrụ nye unu.”

Ezi ụmụnne m nwoke na ụmụnne nwanyị, ezi ndị enyi m, enwere otu akụkụ m ka na-echeta ụlọ ụka ochie ahụ nke Zwickau ya na mpio ya na-akụwa akụwa akanyere ihe. Mana kemgbe afọ 75 gara aga, Jizọs Kraịst eduruwo m na njem ndụ n’ụzọ na-akpali akpali karịa otu m tụrụ naanya. Ọ kasịwo m obi niime mkpagbu m niile, nyere m aka mata adịghị ike m niile, gwọọ mmerụ ahụ m niile nke ime mmụọ, ma nye okwukwe m nke na-eto eto ọzụzụ.

Ọ bụ ekpere na ngọzi si m n’obi na anyị mgbe niile ga-enye mgbọrọgwụ nke okwukwe anyị nwere na Onye Nzọpụta, ozizi Ya, na niime Nzukọ nsọ Ya ọzụzụ. Nke a ka m na-agba ama n’aha dị nsọ nke Onye Mgbapụta anyị, Nna Ukwu anyị—n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Afọ nke 2024 bụkwa afọ 30 kemegbe ọkpụkpọ oku m dị ka Onye Ji Ikike Zuru ọha na afọ 25 kemgbe ezi na ụlọ m kwafetere na United States site na Germany nihi ọkpụkpọ oku ahụ. Ma ọfọrọ ntakịrị ka ọ ruo afọ 20 gara aga—n’ọnwa Oktoba 2, 2004—ka akwadoro m dị ka onye otu nke Kworum nke Ndị Iri na Abụọ ma dị ka onye aka ebe pụrụiche “nke aha nke Kraịst n’ụwa niile” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:23).

  2. Nụfọdụ ụzọ, mmetụtam banyere ụlọ ahụ dị nnọ ka ihe ndị Alma chere banyere Mmiri niile Mọmọn—ọ bụ ebe mara mma nye ha nihi “n’ebe ahụ [ha] bịara na mmata nke Onye-mgbapụta ha” (Mosiah 18:30).

  3. Matiu 24:35; lee kwa Joseph Smith—Matiu 1:35.

  4. Aịzaya 54:10; leekwa 3 Nifaị 22:10.

  5. Onye Isi Nduzi Thomas S. Mọnson kuziri otu ụdị eziokwu ahụ jiri okwu ndịa: “Ekwere m na otu niime nnukwu mmụta anyị kwesịrị ịmụta na njem nke nke nelu ụwa a bụ mmụta na-enyere anyị aka mata ndịiche dị netiti ihe dị mkpa na ihe na-adịghị. A na m arịọ ka unu ghara ị kwe ka ihe ndịa kacha mkpa gafere unu” (“Ịchọta Ọńụ niime Njem ahụ,” Liahona, Nov. 2008, 85). Notu aka ahụ, mgbe Onyeisi Russell M. Nelson na nso nso gbara anyị ume “ịche selestịal,” ọ kwuru, “Ndụ anụ ahụ bụ klaasị nke mmụta nịmụ ịhọrọ ihe ndị kachasị mkpa nke ndụ ebighị ebi” (“Chee Selestial!,” Liahona, Nov. 2023, 118).

  6. Nkụzi nke Ndị-isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ: Josef Smit (2007), 264; lee kwa Nkuzi niile nke Ndịisi nke Nzukọ nsọ: Brigham Young (1997), 16–18.

  7. Nkuzi niile: Joseph Smith, 49.

  8. Jọn 15:4.

  9. Matiu 23:23, New Revised Standard Version.

  10. Ọ dị ịtụnaanya ị mata myirịta ịrụ ụlọ dị netiti omenala ndị Emerịka oge ochie na nke ndị Akwụkwọ nke Mọmọn? Onwere ike ịbụ. Ọ na-enyeaka ị mụta site nakụkọ ndị odee na ndị ọzọ banyere ihe niile metụtara otu Josef Smit jiri tụgharịa Akwụkwọ nke Mọmọn? Ọ dị otu ahụ maka ụfọdụ. Mana enweghi otu niime ihe a sonyere niime ọgbụgba ama na anọgide na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ okwu nke Chineke. Maka nke ahụ, ị kwesịrị ịchọta Onye Nzọpụta niime ahụ niime Akwụkwọ nke Mọmọn, ka olu Ya kwuoro gị okwu. Ozugbo nke a mere, ọ gaghị adịrị gị mkpa ebe obodo ukwu Zarahemla ochie ahụ nọ ma ọ bụ ihe Urim na Thummim yiri ka ya. Ihe ndịa bụ alaka ndị enwere ike ị gbujipụ site na osisi gị ma ọ bụrụ ma achọọ, mana osiso ahụ kaga anọgide.

  11. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 84:19-20.

  12. Lee Joy D. Jones, “Maka Ya,” Liahona, Nov. 2018, 50–52.

  13. Lee Jenesis 3:18.

  14. Onyeisi Nelson kpọkuwo anyị kanyị “lekọta ọgbụgba ama [anyị] nwere banyere Jizọs Kraịst na ozi ọma. Rụọ ọrụ maka ya. Zụlite ya ka ọ wee tolite” (“Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike,” Liahona, Nov. 2022, 97).

  15. Ndị Kọlọsị 2:7.

  16. Alma 30:3.

  17. Lee Alma 30:12–16, 31.

  18. Alma 30:18.

  19. N’ụzọ na-akpali mmasị, arụmụka Korihọ bụ ihe a na-ekweghị n’etiti ndị Leman ahụ a tọghatara nso nso a, ndị Amọn (lee Alma 30:19–20ndị na-eso Kraịst na-abụghị n’ihi ọdịnala nke ndị nna ha.

    N’ụzọ dị iche, Akwụkwọ nke Mọmọn na-ekwukwa maka ọgbọ nke ndị ntorobịa kewapụrụ onwe ha na Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị nihi na “ha ekweghi n’omenala nke ndị nna ha” (see Mosiah 26:1–4) Ọ dị mma maka ezi na ụlọ ihiwe omenala nwere ezi omume. Mana ọ dịkwa mkpa ka ezi na ụlọ ghọta nke ọma ihe kpatara omenala ndị ahụ. Gịnị mere anyị ji ekpe ekpere ụtụtụ na abalị? Gịnị kpatara anyị ji enwe ọmụmụ akwụkwọ nsọ nke ezi na ụlọ? Gịnị kpatara anyị ji enwe nnọkọ mgbede n’ebe obibi izuụka ọbụla, egwuruegwu ezi na ụlọ, ma ndị ọzọ? Ọ bụrụ na ụmụ ghọta otu omenala ndịa si akpọta anyị nso ruo Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst, ọ ga aka adịrị ha mfe ị mee ya gawa niihu—ma melite ha—niime ezi na ụlọ nke onwe ha.

  20. Alma 32:21. Okwukwe siri ike nabụghị nihi ihe ọ maara mana nihi ihe ọ na-eme.

  21. See Ndị Hiburu 10:23.

  22. Alma 32:37, 41– 43.