Ụmụ Ndị Nwoke na Ụmụ Ndị Nwanyị nke Chineke
Anyị kwere n’ezie na anyị niile bụ ezigbo ụmụ Chineke, ma niihi nke ahụ, anyị nwere ike mmepụta ịdịrị ka Ya.
Taa aga m achọ ikwu okwu maka otu niime eziokwu ozi ọma kachasị juputara n’ọńụ, dị ebube, ma dị ike ndị nke Chineke kpugheworo. N’otu aka ahụ kwa, ọ bụ nụzọ ọzọ otu ihe mere e jiworo katọọ anyị. Nhụmiihe m nwetere afọ ole ma ole gara aga mikpukwuru nke ukwuu ekele m maka eziokwu ozi ọma nke a.
Dị ka onye nnọchite anya nke Nzukọ nsọ, akpọwo m oku n’ọgbakọ okpukperechi ebe a mara ọkwa na site mgbe ahụ gaaniihu na ha ga-anabata dị ka ihe dị mma baptizim niile e mere site n’aka ihe gaara abụ nzukọ nsọ Ndị Kristian ndị ọzọ niile, ọbụrụraa na-emere emume nsọ ahụ jiri mmiri na n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke Mmụọ Nsọ. Emesịa akọwara ya na iwu nke a adabaghị na baptizim ndị e mere site n’aka Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a.
Mgbe ọgbakọ ahụ gasịrị enwetere m ohere ikwu banyere ebumnuuche niile maka ngụpụ ahụ mụ na onye ndu ịma ọkwa dị n’aka. Anyị kparịtara ụka dị ịtụnaanya na nke nwere uche.
Na nkenke, ọ kọwaara m na ngụpụ ahụ bụ ihe gbasara otu nkwenye anyị banyere Chukwu, nke otu ndị Kristian ndị ọzọ na-akpọ Atọ niime otu. Egosiputara m ekele m maka ya iwere oge kọwaara m nkwenye ya niile na iwu nke nzukọ nsọ ya. Na ngwụcha mkparịta ụka anyị, anyị makuru ma mesịa si gaa n’udo.
Dị ka m mesịrị tulegharịa mkparịta ụka anyị, ihe onye ndu nke a kwuru banyere Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a aghọtaghị ihe ọ kpọrọ “ihe omimi nke Atọ niime otu” nọgidere m n’obi. Gịnị ka ọ na-ekwu maka ya? N’ezie, o nwere ihe jikọrọ ya na ya nghọta nke ọdịdị Chineke. Anyị kwere na Chineke Nna “bụ onye ebuliri elu” nwere ahụ dị ebube “nke anụ ahụ na ọkpụkpụ dị ka enwere ike imetụ aka dị ka nke mmadụ; [na] Ọkpara ahụ kwa” Otu ọ dị, mgbe ọbụla anyị kwuru okwu banyere ọdịdị nke Chineke, n’ụzọ ụfọdụ, ka ọ dị anyị nakwa ekwu banyere ọdịdị nke anyị.
Ma nke a bụ eziokwu ọbụghị naanị niihi anyị niile ka e kere nụdị [Ya], dị ka oyiyi [Ya],” mana niihi na kwa, dị ka onye dere abụ ọma dekọtara, Chineke kwuru, “Unu bụ chi; ma unu niile bụ ụmụ nke onye kachasị elu.” Nke a bụ maka any ozizi dị oke ọnụ ahịa eweghachitere niihi ọbịbịa nke Mweghachite. Na nchịkọta, ọ bụghị ihe karịrị ma ọ bụ ihe dị nta karịa ihe ndị mgbasa ozi ọma anyị na-akuzi dị ka ihe ọmụmụ nke mbụ, nkeji edemede mbụ, ahịrị mbụ: “Chineke bụ Nna anyị nke Eluigwe ma anyị bụ ụmụ Ya.”
Ugbu a, i nwere ike kwuo “Mana ọtụtụ ndị mmadụ kwere na anyị bụ ụmụ nke Chineke.” Ee, nke ahụ bụ eziokwu, mana nghọta ha nwere ike dịrịtụ iche site na nsonazụ nke mpụtara ya miri emi karịa nke anyị na-ama ọkwa ya. Maka Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a, nkuzi nke a abụghị ihe atụ. Kama, anyị kwere n’ezie na anyị niile bụ n’ezie ụmụ Chineke. Ọ bụ “Nna nke mmụọ [anyị],” ma niihi nke ahụ, anyị nwere ike mmepụta iji dịrịzie ka Ya, nke yiri ihe ga-ara ahụ nkweta nye ụfọdụ.
Ugbu a o ruwo ihe karịrị afọ 200 kemgbe Ọhụ nke Mbụ meghere ọnụ ụzọ niile nke Mweghachite. N’oge ahụ, Joseph Smith dị nta chọrọ odudu site n’eluigwe ịmara nzukọ nsọ nke ọ ga-esonye. Site na mkpughe ọ natara n’ụbọchị ahụ, na niime mkpughe niile enyere ya, Onye amụma Joseph Smith natara mmata ihe banyere ọdịdị nke Chineke na mmekọrịta anyị nye Ya dị ka ụmụ Ya.
Niihi nke ahụ, anyị mụtakwuru ebe o doro anya na Nna anyị nke Eluigwe akuziwo ozizi nke a dị oke ọnụ ahịa site na mmalite. Kwe ka m rụtụ aka nkọwapụta abụọ site n’akwụkwọ nsọ iji gosipụta nke a.
I nwere ike cheta nkuzi niile nke Chineke nye Moses dị ka edekọrọ niime Pel dị Oke Ọnụ ahịa.
Anyị na-agụ na “Chineke gwara Moses, na-asị: Lee, a bụ m Onyenwe Chineke Pụrụ Ime Ihe niile, ma Enweghị ọgwụgwụ bụ aha m.” N’ụzọ ọzọ, Moses, A chọrọ ka ị mara onye m bụ. Emesịa Ya agbakwunye, “Ma, lee, ị bụ nwa m nwoke Emesị a o kwuru, “Ma e nwere m ọrụ maka gị, Moses, nwa m nwoke; ma gị nọ n’oyiyi nke Onye A Mụrụ Naanị Ya nke m.” Ma emesịa n’ikpeazụ, O mechiri jiri nke a, “Ma ugbu a, lee, otu ihe nke a ka m na-egosi gị, Moses, nwa m nwoke.”
Ọ pụtara na Chineke kpebiri ikuziri Moses ọbụnadị otu mmụta: “Ị bụ nwa m,” nke O kwugharịrị ọbụna ugboro atọ. O nwedịghị ike ịkpọ aha nke Moses na-aụghị ịgbakwunye ngwa ngwa na ọ bụ nwa Ya nwoke.
Kosiladị, mgbe a hapụrụ Moses naanị ya, ọ dara mba niihi na ọ nọghịkwa niihu nke Chineke. Nke ahụ bụ mgbe Setan bịara ịnwa ya ọnwụnwa. I nwere ike ịhụ nsoro n’ebe a? Ihe mbụ o kwuru bụ, “Moses, nwa nke mmadụfee mụ ofufe.”
Niime ọnọdụ nke a, arịrịọ nke Setan ife ya ofufe nwere ike bụrụ naanị ihe mbupu anya. Otu ọnwụnwa dị ịrịba ama nye Moses noge ahụ nke adịghị ike bụ inwe mgbagwoju anya ma kwere na ya bụ naanị “nwa nke mmadụ,” kama nwa nke Chineke.
“Ma O wee ruo na Moses lekwasịrị Setan anya ma sị: Onye ka ị bụ? Niihi na lee, a bụ nwa nwoke nke Chineke, n’oyiyi nke Onye Ọ Mụrụ Naanị ya.” Ịdaba nke ọma, Moses enweghị mgbagwoju anya ma ọ hapụghị onwe ya ka ebupu ya uche. Ọ mụtaworịị ihe mmụta nke onye ọ bụ n’ezie.
Nkọwapụta nke sotere ka a hụrụ niime Matiu 4. Ndị mmụta akpọwo nke a “ọnwụnwa atọ nke Jizọs,” dị ka nnọọ anwara Onyenwe anyị ọnwụnwa naanị ugboro atọ, nke n’eziokwu ọ bụghị ihe ọ bụ.
Narị kwuru narị gbomgbom mmiri akwụkwọ ka ejiworo ji kọwaa mpụtara na ọdịnaya nke ọnwụnwa ndị a. Dị ka anyị maara, isi okwu ahụ malitere site n’ịkọwa na Jizọs abanyewo niime ọzara, “ma mgbe o buworo ọnụ ụbọchị iri anọ na abalị iri anọ, agụụ mesịrị na-agụ ya.”
Ọnwụnwa mbụ nke Setan doro anya na o nwere naanị ihe ime mgbe ahụ iji metazie mkpa anụ ahụ niile nke Onyenwe anyị. “Nyee iwu na okwute ndị a ga-aghọ achịcha,” ọ nwara Onye Nzọpụta.
Ịdọ akpịrị nke abụọ nwere ike bụrụ na o nwere ime ihe ịnwa Chineke ọnwụnwa: “Tụdata onwe gị ala: niihi na edewo ya, Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu gbasara gị.”
N’ikpeazụ, ọnwụnwa nke atọ nke Setan rụtụrụ aka na ọchịchọ niile na ebube nke ụwa. Mgbe egosiwororịị Jizọs “alaeze niile nkw ụwa, … [Setan] sịrị ya, Ihe ndị a niile ka m ga-enye gị, ma ọ bụrụ na ị ga-ada n’ala ma fee m ofufe.”
N’eziokwu, ọnwụnwa nke Setan kachasị nwere ike bụrụ na o nwere obere ihe ime ya na mkpasu iwe atọ ndị ahụ kpọmkwem na ọzọ ime ya na ịnwa Jizọs Kraịst ọnwụnwa iji jụgharịa ọdịdị sinachi Ya. Opekempe ugboro abụọ, ịdọ akpịrị ahụ ka ebubo aka mgba sitere n’aka Setan butere ụzọ: “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara nke Chineke”—ọ bụrụ na i kwere ya n’ezie, mgbe ahụ mee nke a ma ọ bụ nke ọzọ.
Biko mata ihe meworo ozugbo tupu Jizọs abanye niime ọzara ibu ọnụ na ikpe ekpere: anyị na-achọta nkọwapụta baptizim nke Kraịst. Ma mgbe Ọ pụtaworo site na mmiri, enwere “olu sitere n’eluigwe daa, na-asị, Onye a bụ Ọkpara m hụrụ naanya, niime onye M nwere ezi mmasị.”
Anyị ọ na-ahụ njikọ ahụ. Anyị ọ nwere ike ịmata adịmadị ebe a?
Ọ naghị atụ naanya na mgbe ọbụla akuziiri anyị banyere ọdịdị anyị na akaraka anyị sinachi, onye iro nke ezi omume niile na-anwa anyị ịjụgharị gbasara ha.
Otu ịdịiche mkpebi anyị niile ga-adị ọ bụrụ ma anyị maara n’ezie onye anyị bụ n’ezie.
Anyị bi niime ụwa na-ama aka, ụwa nke ọgbaghara na-abawanye, ebe ndị nwere ezi agwa na-agba mbọ opekempe kwusie ike ugwu ịbụ mmadụ, ebe anyị sonyere na nzukọ nsọ ma nabata ozi ọma nke na-ebuli ebumnuuche anyị ma na-akpọku anyị niime nsọ ahụ.
Iwu nsọ nke Jizọs ị “zu oke, ọbụna dị ka Nna [anyị] nke dị n’eluigwe si zuo oke” bụ ntụgharị uche doro anya nke atụmaanya Ya dị elu na ohere ebighị ebi niile. Ugbu a, ọ dịghị nke ọbụla niime nke a ga-eme na ntabi anya. N’ọnụ nke Onyeisi Jeffrey R. Holland, ọ ga-eme “n’ikpeazụ.” Mana nkwa ahụ bụ na ọ bụrụ anyị “bịakwute Kraịst,” anyị “ga-ezu oke niime ya.” Nke ahụ na-achọ ọtụtụ ọrụ—ọ bụghị nnọọ ọrụ ọbụla, mana ọrụ sinachi. Ọrụ Ya!
Ugbu a, ozi ọma ahụ bụ na ọ bụ kpọmkwem Nna anyị nke Eluigwe onye kwuworo, “Niihi na lee, nke a bụ ọrụ m na ebube m—iweta na mmezu anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi nke mmadụ.”
Oku nke Onyeisi Rusell M. Nelson “iche selestịal” na-egosi ihe ncheta dị ịtụnaanya nke ọdịdị anyị, nsipụta anyị, na ebe anyị pụrụ ịgaru nke sinachi. Anyị pụrụ inwete selestịal naanị site n’aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.
Elemaanya nke ahụ bụ ihe mere Setan ji tọọ Jizọs akpịrị jiri nnọọ otu ụdị ọnwụnwa site na mmalite ruo na ngwụcha nke ije ozi nke ndụ Ya. Matiu dekọtara na mgbe akpọgidere Jizọs n’obe, ndị ahụ gafere n’akụkụ katọrọ ya, … na-asị, … Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara nke Chineke, rịdata site n’obe ahụ.” Otuto dịrị Chineke na Ọ ńaghị nti mana kama nyere ụzọ maka anyị iji nata ngọzi niile nke selestịal.
Ka anyị na-echeta, mgbe niile na enwere nnukwu ọnụ ahịa maka obi ụtọ anyị.
Ana m agba ama site n’isoro Onye ozi Pọl na “Mmụọ ahụ n’onwe ya na mmụọ anyị na-agba akaebe, na anyị bụ ụmụ nke Chineke: ma ọ bụrụ ụmụ, mgbe ahụ ndị nketa; ndị nketa nke Chineke, na ndị otu nketa na Kraịst; ọ bụrụ otu ahụ anyị na-eso ya ata ahụhụ, ka anyị wee dịkọrịta ebube.” Site n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.