Ọgbakọ Zuru ọha
“Abụ m Ya”
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


“Abụ m Ya”

Ịhụnanya nke Kraịst—nke pụtara ihé n’ịgụzosị ike n’ihe n’ụzọ zuru oke nye Chineke ga—adịgide ma nọgide na-adịgide.

Ọ bụ Ụbọchị izu ike, ma anyị gbakọtara na-ekwu maka Kraịst na ịkpọgide Ya n’obe. A maara m na Onye Mgbapụta m dị ndụ.

Tulee ihe nke a mere noge izuụka ikpeazụ nke ndụ ịnwụ anwụ Jizọs. Igwe mmadụ gbakọtara, tinyere ndị agha Rom ndị ji mkpara na ndị kegidere mma agha niile. Ndị ọrụ nchekwa sitere n’aka ndị isi nchụaja bụ ndị duuru ndị a ji ọwa ọkụ n’aka, igwe mmadụ ndịa agawaghị imeri otu obodo. N’abalị a, ha na-achọ naanị otu nwoke, otu nwoke ama na ọ naghị ebu ngwa ọgụ, enwetaghị ọzụzụ agha, ma ọ bụ na-alụ ọgụ anụ ahụ n’oge ọbụla na ndụ ya dum.

Ka ndị agha ahụ na-abịaru nso, Jizọs nịgbalị ichebe ndị na-eso ụzọ Ya, pụtara ma sị, “Onye ka unu na-achọ?” Ha zara, “Jizọs nke Nazareth.” Jizọs kwuru, “A bụ m ya. … Ozugbo … ka ọgwarala ha, A bụ m ya, ha laghachiri azụ, ma daa nala.”

naanya m, nke ahụ bụ otu nime ahịrị na-akpaiị akpalị niime akwụkwọ nsọ niile. Tinyere ihe ndị ọzọ, ọ na-akwa m n’ụzọ kwụ ọtọ na naanị ị nọ n’iru nke Ọkpara nke Chineke—Jehova dị ukwuu nke Agba Ochie na Ezi Onye ọzụzụ atụrụ ọma nke Ọhụrụ, onye n’enweghị ngwa ọgụ niile nke ọbụla—na naanị ịnụ olu ahụ nke Ebe mgbaba site na Oke Ifufe a, Onyeisi Udo a, ezuola iziga ndị na-emegide ya sụọ ngọngọ n’ala azụ, na-achịkọta ha n’ọgba aghara ma mee ka ndị otu ahụ niile chọọ ka e kenyere ha ọrụ usekwu n’abalị ahụ.

Naanị ụbọchị ole na ole tupu mgbe ahụ, mgbe ọ batara niime obodo ahụ n’ebube, “obodo ahụ niile kpaliri,” akwụkwọ nsọ kwuru, n’ajụ, “Onye bụ onye a?” E nwere m ike iche na “Onye bụ onye ahụ?” bụ ajụjụ ndị agha ahụ ga na-ajụ ugbu a!

Aziza nye ajụjụ ahụ bụ ihe na-agaghị ahụ n’ụdịdị Ya, n’ihi na Aịzaya buru amụma ihe dị ka narị afọ asaa tupu mgbe ahụ na “o nweghị ụdị ma ọ bụ mma ile anya; ma mgbe anyị ga-ahụ ya ọdịghị mma ile anya nke ga-eme ka anyị chọọ ya.” N’ezie ọ dịghị niime ebe ndobe uwe Ya na-egbu maramara ma ọ bụ akụ na ụba, nke Ọ na-enweghị. Ọ pụghị ịbụ site n’ọzụzụ ndị ọkachamara ọ bụla n’ụlọ nzukọ dị n’ogbe ahụ n’ihi na anyị enweghị ihe ama ọ bụla na-egosi na o nwere mgbe ọ mụtara ihe n’otu niime ha, n’agbanyeghị na n’oge ọ bụ nwata Ọ nwere ike ịgbagha ndị odeakwụkwọ na ndị ọka iwu, jisiri ike were ozizi Ya tụọ ha naanya “dị ka onye nwere ikikere.”

Site na nkuzi ahụ niime tempụl ruo n’ịbanye niime Jerusalem nke mmeri na nke ikpeazụ a, n’ụzọ na-ezighị ezi, a na-edobe Jizọs n’ọnọdụ niile siri ike, nke na-abụkarị kwa aghụghọ bụ ndị ọ na-enwe mmeri mgbe niile—bu ndị anyị na-enweghị nkọwa maka ya ma e wezụga DNA Chineke.

Ma site n’akụkọ ihe mere eme ọtụtụ ndị emewo ka ọ dị mfe, ọbụna ileda onyonyo anyị nwere banyere Ya na ámá Ọ na-agba nke onye Ọ bụ. Ha ebelatawo ezi omume Ya ka ọbụrụ akọ, ikpe ziri ezi Ya ghọọ naanị iwe, ebere Ya dị ka ntụkwasị obi. Anyị a gaghị ada iwu nke nsụgharị niile nke Ya dị mfe nke na-eleghara anya nkuzi niile nke anyị achọghị. “Nkwubi omume ọma” a abụrụla eziokwu ọbụlagodị ihe gbasara agwá ọma Ya kacha akọwa Ya, Ịhụnaanya Ya.

Noge mgbasa ozi Ya n’ụwa Jizọs kuziri na ọ dị iwu-nsọ abụọ dị-ukwuu. A kuziri ha na ọgbakọ a ma a ga-akuzikwa ha ruo mgbe ebighị ebi: “Hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya [na] ị hụ onye-agbata-obi gị n’anya dị ka onwe gị.” Ọ bụrụ na anyị ga-eso Onye Nzọpụta n’ikwesị ntụkwasị obi niime iwu abụọ a dị oke mkpa na nke enweghị njikọ, anyị kwesịrị ijidesi ike ihe O kwuru n’ezie. Ma ihe O kwuru n’ezie bụ, “Ọ bụrụ na ụnụ hụrụ m naanya, debe iwu nsọ m niile” N’otu mgbede ahụ, Ọ sịrị anyị “Hụrịtanụ onye na ibe ya naanya; dị ka M siworo hụ unu naanya.”

Niime akwụkwọ nsọ niile nkebi ahịrịokwu niile ndị na-egosi ezi, ịhụnaanya yiri nke Kraịst— mgbe ụfọdụ a na-akpọ ọrụ ebere—dị oke mkpa.

Gịnị ka ha na-akọwa? Kedụ ka Jizọs si hụ naanya?

Nke mbụ, Ọ hụrụnaanya jiri “obi [Ya], ike, uche, na ume,” na-enye Ya ike ịgwọ ihe mgbu miri emi na ikwu eziokwu siri ike. Na nkenke, Ọ bụ onye nwere ike nyee amara ma kwechịrị na eziokwu n’otu oge ahụ. Ka Lehi kwuru na ngọzi onyere nwa ya nwoke Jekọb, “Mgbapụta na-abịa niime na site na Mesaịa dị Nsọ; n’ihi na o jupụtara na amara na eziokwu.” Ịhụnaanya Ya na-enye ohere mmakụ ịgba ume mgbe a chọrọ ya na iko ịlu mgbe a ga-eloda ya. Ya mere anyị na-agbalị ịhụ naanya—jiri obi anyị dum, ike, uche, and ume—n’ihi na otu a bụ otu o si hụ anyị naanya.

Ihe e ji mara nke abụọ nke ịhụnaanya Jizọs bụ nrube isi Ya nye okwu ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta, na-eme ka uche na omume Ya na nke Nna Ya nke Eluigwe na-adakọ mgbe niile.

Mgbe O rutere na Western Hemisphere na-esochi Mbilite n’ọnwụ Ya, Kraịst gwara ndị Nifaị: “Lee, A bụ m Jizọs Kraịst. … An̄ụwo m site n’iko ilu ahụ nke Nna nyeworo m, … niime nke m tara ahụhụ uche nke Nna … site na mmalite.”

Ọ na-akpali m mgbe niile na niime ọtụtụ ụzọ Ọ gaara esi kọwaa Onwe ya, Jizọs mere otu ahụ site na-ịkwupụta nrube isi Ya nye uche nke Nna—echefula na n’oge na-adịghị anya gara aga n’oge awa nke mkpa Ya kachasi mkpa, Ọkpara A Mụrụ Naanị Ya nwere mmetụta na a gbahapụrụ ya kpam kpam. Ịhụnaanya nke Kraịst—pụtara ihé n’ikwesị ntụkwasị obi zuru oke nye Chineke— nọgidere ma ga-anọgide, ọbụghị naanị n’ụbọchị ndị dị mfe na nke dị jụụ kama kwa site n’oge kasị njọ na nke kacha sie ike.

Jizọs bụụrụ “otu nwoke nke nwere mwute,” akwụkwọ nsọ niile kwuru. O nwere ahụmihe mwute, ike ọgwụgwụ, ndakpọ olileanya, na oke owu ọmụma. Niime oge niile ndị a, ịhụnaanya nke Jizọs adaghị, ma nke Nna Ya adaghị kwa. Jiri ezi ịhụnaanya tozuru oke—ụdị nke na-egosịpụta, na-enye ike,ma mmetụta—nke anyị agaghị ada.

Ya mere, ọ bụrụ na mgbe ụfọdụ ka ị na-agbalịsi ike, ka ọ na-adị ka ọ ga akacha esi ike enweta; ọ bụrụ, dị nnọọ ka ị na-agbalị ịrụ ọrụ na adịghị ike gị na adịghị ike gị, ị ga-ahụ onye ma ọ bụ ihe kpebisiri ike ịgba okwukwe gị aka; ọ bụrụ, ka ị na-arụsị ọrụ ike, gị ka na-enwe oge nke ụjọ na-ahụkpu gị, cheta na otu a ka ọdịrị maka ụfọdụ ndị ezi mmadụ n’oge ọbụla. Chetakwa na e nwere ike dị n’eluigwe na ala kpebisiri ike imegide ihe ọma ọ bụla ị na-agbalị ime.

Ya mere, site n’ụba na ogbenye, site na nkwanye ugwu onwe ya na nkatọ ọha, site na ihe dị nsọ nke Mweghachite ya na ihe ndị mmadụ na-apụghị izere ezere ga-abụ akụkụ nke ya, anyị na-aga n’ihu na-eguzobe ma na-anọnyere ezi Nzukọ nsọ nke Kraịst. Maka Gịnị? N’ihi na dị ka Onye Mgbapụta anyị, anyị na-abanye maka oge dum—anaghị ejedebe na ajụjụ mmeghe mbụ dị mkpirikpi ruo na ule ikpeazụ. Ihe ọńụ dị na nke a bụ na Onyeisi nkuzi ahụ nyere anyị azịza niile emepere emepe tupu ọmụmụ ihe amalite. Ọzọkwa, anyị nwere ọtụtụ ndị nkuzi na-echetara anyị aziza ndị ahụ na nkwụsị niile ugboro ugboro n’ụzọ. Mana n’ezie, ọ dịghị nke ọ bụla niime nke a ga-arụ ọrụ ọ bụrụ na anyị nọgide na-agaghi klass.

“Onye ka unu na-achọ?” Anyị na-eji obi anyị niile zaa, “Jizọs nke Nazareth.” Mgbe O kwuru, “A bụ m Ya,” anyị na-ehulata ikpere anyị ma jiri ire anyị na-ekwupụta na Ọ bụ Kraịst dị ndụ, na ọ bụ naanị Ya kpuchiri mmehie anyị niile, na Ọ nara ebu anyị ọbụna mgbe anyị chere na Ọ gbaghapụrụ anyị. Mgbe anyị guzoro n’ihu Ya ma hụ ọnya niile dị n’aka Ya, ụkwụ Ya, anyị ga-amalite ịghọta ihe ọ pụtara Ya ịburu mmehie anyị niile wee maara iru uju, irubere Nna Ya isi kpam kpam—n’ihi ịhụnaanya dị ọcha maka anyị. Ị Kọwara ndị ọzọ maka okwukwe, nchegharị, baptizim, onyinye nke Mmụọ Nsọ, na ịnata ngọzi anyị niile niime ụlọ nke Onyenwe anyị—ndị a bụ isi “ụkpụrụ na emume nsọ niile” nke na-egosi ịhụnaanya anyị na Chineke na onye agbata obi ma were ọńụ n’egosi ezi Nzukọ nsọ nke Kraịst.

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, A na m agba ama na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a bụ ụgbọ ala Chineke wepụtara maka mbuli elu anyị. Ozi ọma ọ na-akuzi bụ eziokwu, ma ọkwa nchụaja na-akwado ya abụghị nke mmadụ . A na m agba akaebe na Russell M. Nelson bụ onye amụma nke Chineke anyị, dị ka ndị bu Ya ụzọ bụụrụ ma ka ndị ga-anọchị Ya ga-abụ. Ma otu ụbọchị ntụziaka amụma ahụ ga-eduga ọgbọ ndị akwadoro ịhụ Onye-ozi nke Nzọpụta anyị ka ọ na-agbada dị ka “amụma … site n’ọwụwa anyanwụ,” ma anyị ga-eti mkpu, “Jizọs nke Nazareth.” Jiri ogwe aka mgbatị ha ruru mgbe ebighị ebi na ịhụnaanya nke enweghị atụ, Ọ ga aza, “A bụ m ya.” A na m ekwee nkwa n’ike nke onye ozi na ikikere nke aha nsọ Ya, ọbụna Jizọs Kraịst, amen.