Ụbọchị ndị Agaghị Echefu Ma ọlị
Emume ndị ọbịaniihu ga-arọpụtara ndị otù Nzukọ nsọ ebe niile ọtụtụ ohere iji kesaa ozi obi ụtọ nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst.
Ndubata
Ezi ụmụnne m ndị nwoke na nwanyị, agụgụala nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a n’ọgbọ nke a jupụtara na nhụmiihe si n’igwe nke na-egosipụta otu Onyenwe anyị si na-edu Nzukọ nsọ Ya. Enwere otu afọ iri nime agụgụala anyị, kosiladị, nke karịsịrị ịdị elu karịa nke ọ bụla—ọ bụ afọ iri bidoro na 1820 ruo 1830. Nke bidoro na nhụmiihe Onye amụma Joseph Smith n’ebe Ọdọ osisi Dị Nsọ n’oge spring nke 1820, mgbe ọ hụrụ Chineke Nna na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, ma gaaniihu tutu ruo Epre 6, 1830, afọ iri ahụ enweghị nke yiri ya.
Tulee emume ndị a dị ịtụnaanya! Onye amụma nta nke ahụ kwụkọrịtara okwu ya na mmụọ ozi Moronaị, tụgharịa epekele ọla edo niile, ma bipụta Akwụkwọ nke Mọmọn! Ọ bụ ngwa ọrụ e si n’aka ya weghachite Ọkwa nchụaja nke Erọn na Melkizedek, ma emesịa ọ haziri Nzukọ nsọ! Oliver Cowdery kọwara oge ahụ ọfụma: “Ụbọchị ndị ahụ bụ ndị agaghị echefu ma ọlị.” Emume ndị dị ebube na-agakwa niihu na-eme ruo n’ụbọchị taa.
Ka m jiri obisike tụọ arọ na n’afọ nke a, anyị amalitewo afọ iri nke nwere ike ịbụ nke kacha ịtụnnanya karịa nke ọbụla sotere afọ iri nke isimbụ ahụ nke na-enweghi atụ kemgbe ihe fọrọ ntakịrị ka ọ ruo afọ narị abụọ gara aga.
Afọ iri nke Anyị
Ka m kọwa. Bido na 2024, ruo na 2034, anyị ga-ahụ ihe emume ndị ga-ebute ohere pụrụ iche iji jee ozi, jikọta ịdị n’otu anyị na ndị otù na ndị enyi, na iji mee ka ọtụtụ ndị mata maka Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a karịa otu emebeghi na mbụ.
Anyị ka hụrụ ike nke emume agụgụala n’oge ahụ anyị na ọtụtụ iri nde kwuru iri nde mmadụ mere emume ncheta ụbọchị ọmụmụ nke afọ 100 nke Onyeisi Russell M. Nelson.
Mgbe a na-akọ akụkọ banyere ụbọchị ọmụmụ Onyeisi Nelson, Newsweek dere isiokwu nke kwuru, “Onyeisi Okpukperechi Ụwa Kacha Mee Okenye Agbawo afọ 100.” Ha emesịa depụta ndị ndu okpukperechi 10 kacha mee okenye—ebe Onyeisi Nelson nọ n’isi ndepụta ahụ gụnyere Pope Francis na Dalai Lama.
Nkwupụta nke a sitere na New York Times gosiri mmụọ nke otu ụwa jiri kọọ ya: “Niime oge ndị [United States] na-eme ntuli aka onyeisi ala nke kpateworo nnyọcha si na mkpụrụ obi banyere ịka nka na odudu, afọ Maazi. Nelsọn gbara na-eme ka a mara na, opekampe na nzukọ nsọ ya, emume ncheta afọ gbara ọnụọgụgụ dị atọ achọchaghị oke ngosipụta nchegbu onwe. Ọ kabụkwa onye ama ama n’etiti ndị otù nzukọ nsọ, ndị na-ahụ onyeisi ha na-abụghị naanị dị ka onyeisi kama dị ka ‘onye amụma, ọhụ ụzọ, na onye mkpughe.’”
Obi ihe inye ekele na emume ncheta ọmụmụ Onyeisi Nelson nyere anyị ohere ime ka ụwa mata onye amụma nke Chineke bụ, mmemme nke a na-aghaghị echefu ma ọlị.
Na mbido oge spring nke a, otu plaza emezigharị ọhụrụ n’Ogige Tempụl—nke gosipụtara flag mba ụwa na-anọchite mba ụwa ebe anabatara Nzukọ nsọ—ka ekpughere. Ama ịbata plaza ahụ nwere akpụrụ akpụ granite ji okwu amụma ndị a: “Ma ọ ga-eru n’ụbọchị ikpeazụ niile, mgbe a ga-ewulite ugwu ukwu nke ụlọ Onyenwe anyị n’elu ugwu ukwu niile, ma a ga-ebulite ya elu karịa ụgwụ nta niile, ma mba niile ga-ekwobakwute ya.”
N’ezie, emume ndị dị egwu nke ga-eme n’oge afọ iri na-abịa abịa gụnyere otu mmezu na amụma Aịzaya nke a na-abịa na mmezu.
Tulee ọtụtụ tempụl ndị a ga-emepe ma doo nsọ nke atụrụ atụmatụ ime na afọ iri na-abịa niihu, ọbụnadị tempụl ruru 164 ndị enwere ike ịrụ ma ndị a ọzọ na-abịa niihu. Cheegodi ọtụtụ iri nde kwuru iri nde nime unu na ndị enyi unu ga aga ijee nime ụlọ nke Onyenwe anyị. Nke ga-abụ isi akara ihe ndịa bụ ndogharị nsọ nke Tempụl Salt Lake ya na emume niile na-eso ya. Ndịa n’ezie ga-abụ ụbọchị ndị agaghị echefu ma ọlị.
Afọ 2030 ga-ewete ohere zuru ụwa iji mee emume ncheta narị afọ abụọ nke nhazi Nzukọ nsọ. Na-agbanyeghị na ọ dị ọsịsọ ikwu otu Nzukọ nsọ ga-esi echeta ntọala nke a, kama ọ ga-enyerịrị ohere ịkpọku ndị ezi na ụlọ, ndị enyi, ndị ọrụ ibe, na ndị ọbịa pụrụ iche ị “bịa ma hụ” ma ị kacha ghọta mmetụta ahụ dị ike ọ nwere na ndụ nke ndị otù Nzukọ nsọ.
Na 2034, puku kwuru puku ndị isi, ndị ọbịa, na ndị egwuruegwu si mba niile nke ụwa ga-asọbata na Obodo ukwu Salt Lake, bụ ebe aga eme Ịsọmkpi Olumpik nke Oge Winter. N’ezie enweghi ihe na-egosipụta ịdị n’otu zuru ụwa karịa nke ahụ nọ niime Egwuruegwu Olumpik. Anya ụwa niile ga-anọ na Nzukọ nsọ na ndị otù ya, wee na-ewepụta ọtụtụ ohere iji nye aka, jee ozi, ma kesaa ozi obi ụtọ site na mmeso obi ebere—nke a ga-abụ emume a na-agaghị echefu ma ọlị.
Emume ndị ọbịaniihu ndịa ga-arọpụtara ndị otù Nzukọ nsọ ebe niile ohere iji kesaa ozi obi ụtọ nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst jiri okwu na omume, afọ iri a na-agaghị echefu ma ọlị.
Ozi Obi ụtọ
Nime otu ọgbakọ izuụka ole n’ole tupu mmemme ụbọchị ọmụmụ ya, Onyeisi Nelson kọwara ịhe kpatara o jiri nwee mmasị maka nkebiokwu ahụ “ozi obi ụtọ.” N’elu elu, o kwuru, nkebiokwu ahụ na-arụtụ aka n’ọńụ na n’ańụrị. Mana “ozi obi ụtọ” nwere ihe ọ pụtara karịrị nke ahụ. Ọ kọwara na nkebiokwu ahụ pụtara site na mkpụrụokwu Ndị Greek akpọrọ euangelion, nke pụtara “ozi ahụ dị mma” ma ọ bụ “oziọma.” Ańụrị na ọńụ na ndụ a ma na nke na-esote ka ejikọtara mgbe niile ya na ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Yamere nkebiokwu ahụ “ozi obi ụtọ” kọwara ihe abụọ nke a n’ụzọ dị ịtụnaanya.
“Mmadụ [ma nwanyị] dị, ka ha wee nwee ọn̄ụ.” Nna nke Eluigwe arọpụtawo atụmatụ nke ańụrị ahụ nke na-ebute ọńụ site na ngọzi Ya niile. Ndịa gụnyere ibi nihu Ya ebighị ebi dị ka ezi na ụlọ. Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst bụ isi ntọala atụmatụ nke Chineke iji gbapụta anyị. I nata ndụ ebighị ebi, anyị garịrị a bịakwute Kraịst. Dịka anyị na-eme otu a “ma nyere ndị ọzọ aka ime otu a, anyị na-esonye n’ọrụ Chineke nke nzọpụta na mbuli elu.”
Ozi nke a dị nime ozi obi ụtọ nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst bụ ozi kachasị mkpa n’elu ụwa. Ma ebe ahụ ka ndị ntorobịa nta na nke ukwu nke Nzukọ nsọ ga-abata.
Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa
Ugbua ebe afọ iri nke a nabịa abịa nwere ike jupụta na ụbọchị agaghị echefu ma ọlị maka onye otù ọbụla, nke a kacha bụrụ eziokwu maka ununwa ndị ndudugandu na-etolite etolite. Unu nọ n’ụwa ugbua nihi ahọọrọ unu ị nọ ebe a ugbua. Unu nwere ume na ikikere iji bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst n’ụzọ a na-ahụtụbeghi mbụ.
Onyeisi George Q. Cannon kụziri, “Chineke echekwawo ọtụtụ mmụọ maka ọgbọ nke a ndị nwere ume na mkpebi obi izute ụwa na ike niile nke ọnye ọjọọ ahụ [ma iji] … wulite Zayọn nke Chineke anyị na-atụghị egwu maka ndapụta niile.”
Maka nke ahụ, ọ masịrị m ikwuuru unu ndị ndudugandu na-etolite etolite, ịkpọku unu ka unu chee otu obi uto afọ iri nabịa abịa, nke a na-agaghị echefu ma ọlị ga-adịrị maka unu. Ọ masịrị m inye unu mkpụrụokwu ndụmọdụ na mgbam ume ole n’ole nke nwere ike inye unu ike n’oge afọ iri nke a na-abịa abịa.
Dị ka ọtụtụ nime unu, enwere m ekwentịamamịhe nke, n’otu oge ma na-agwaghị ya agwa, na-adọpụta foto ndị na-egosi ihe m nọọrọ na-eme otu ụbọchị. Ọ na-abụkarị m ihe ịtụnanya ịhụ otu ọtụtụ ihe ndị gbanweworo maka mụ na ezi na ụlọ m na ntakịrị afọ ndịa gara aga.
Cheegodi foto ndị ekwentị gị ga-ebupụtara gị afọ iri taa na-abịa abịa! Ị nwere ike ịhụ onwe gị dị ka ị na-agụcha na sekọndịrị ma ọbụ mahadum, dị ka ị na-anata onyinye dị nsọ gị, dị ka ị na-eje mishọn, na-agba agbamakwụkwọ, ma na-amụ nwa mbụ gị. Maka gị onwe gị, nke a ga-abụ afọ iri ị na-agaghị echefu ma ọlị. Mana ọ ga-amụba ugboro abụọ ma ọ bụrụ na ịgbalịsiri ike ị bụ ìhè nke ụwa maka otu ozi obi ụtọ nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst jiri mụbaa ma melite nabụghị nanị ndụ gị makwa nke ndị a bụ ndị ezi na ụlọ unu, ndị enyi, ndị na-eso gị na soshial media.
Ị nwere ike na-eche otu isi enwe ike ime nke a.
Ndị amụma Chineke akụziworo anyị na a na-eme nke site n’ụzọ anọ dị mfe, nke akpọrọ oke n’ọrụ esinigwe họpụta: nke mbụ, na-agbasi mbọ ike ibi ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraist; nke abụọ, na-elekọta ndị ọzọ nọ na mkpa; nke atọ, na-akpọku mmadụ niile ịnata ozi ọma ahụ; ma nke anọ, na ijikọta ezi na ụlọ niile ọnụ maka ebighị ebi. N’ụzọ dị ịtụnannya, nke ọbụla nime ha ka enwere ịme n’ụzọ niile dị nkịtị ma n’ụzọ niile dị mfe.
Ọrụ ndị Esi N’igwe Họpụta
A na m ekwe gị nkwa na afọ iri nke a ga-abụ nke a na-agaghị echefu ma ọlị maka gị ma ọ bụrụ na ịnabata ọrụ anọ ndịa esi n’igwe họpụta. Ka anyị tulee ihe ndịa nwere ike ịpụta.
Nke mbụ, ibi oziọma nke Jizọs Kraịst. Mụọ okwu nille nke ndị amụma, ma mụta ịhụ Nna unu nke Eluigwe naanya. Chigharịa obi unu ebe Ọ nọ, ma gbalịa ije n’ụzọ Ya. Kulite nihi “ọgbụgba ndụ obisike” nke Okenye Ulisses Soares kọwaworo. Obisike nke a na-abịa site na-igba ndụ isoro Jizọs Kraịst, wee mata na Onye Nzọpụta ahụ ga-emesịa gba gị ume ma kwado gị.
Ka ndị enyi gị hụ ọńụ ị na enwete dị ka ị na-ebi ndụ ozi ọma, ma ị ga-abụ ozi nke ozi ọma ahụ nke kachasị ha natawọrọrịị.
Nke abụọ, setịpụta aka ọmịiko iji mee nlekọta maka ndị ahụ nọ na mkpa. Ndudugandu unu na-adịkarị echeta ndị ihe na-adịghị agachara nke ọma. Mgbe ọbụla ihe ọdachị mere ma ndị otù Nzukọ nsọ awụbata ịnye aka kpochapụ irighiri ihe ma kasie ndị mkpagbu obi, ọ naadị nnọ ka ọtụtụ ndị yị uwe edere “Helping Hands” bụ ndị ntọrọbịa nta na ndị nọ afọ iri abụọ na uma ha. Ọ nọ na agwa unu “i burịta onwe anyị ibu arọ” ma “kasie ha obi bụ ndị chọrọ nkasi obi.” Site na ịme otua anyị “emezuo iwu nke Kraịst.”
Evan, otu nwata nwoke ka nọ afọ Praịmarị, kpebiri ijiri ezumike oge summer ya bido kpọkọtawa ihe niile eji eme ose oji na jelly sandwich ruo na inye onyinye nrị ndị ọ chekwara. Ọ hụrụ ọrụ nke a na website ndị JustServe. Evan nta nke a akpọkuo ndị klass ya niile isoro wete ihe gafere iko jelly 700! Ka ndị ahụ ị na-ejere ozi mara na nchegbu ịnwere maka ha gbara mgbọrọgwụ niime ịhụnaanya gị nke Chineke Na ọchịchọ ịnwere imeso ndị agbataobi agwa dị ka onwe gị.
Nke atọ, kpọkuo ndị niile ịnata oziọma ahụ. N’afọ nke a, anyị mehere mishọn 36 ọhụrụ gburugburu ụwa iji nabata ndị niile nwere mmasị ije ozi mgbasa ozi ọma nke uju. N’oge mgbe ọtụtụ ntorobịa na-ahapụ ihe emume nke okpukerechi, nke a bụ ihe ịtụnaanya ma na-ekwu otu ịdị ebube ọgbụgba ama unu sịrị dị. Ma ị na eje ozi mgbasa ozi ọma nke uju ma ọ bụghị, biko mata maka nnukwu ikike ịnwere iji metụta ndị enyị gị dị ka ị na-ahụ ha naanya, na-ekesara ha, ma na-akpọku ha ị nyocha ozi ọma nke Jizọs Kraịst.
Nke anọ, ijịkọta ndị ezi na ụlọ ọnụ maka ebighị ebi. Dị ka m na-aga eleta tempụl gburugburu ụwa, ọ na m atụ m naanya ịhụ igwe ndị ntoroọbịa nta na-eche n’ebe baptizim ma ndị ntorọbịa toro eto ọnụọgụgụ ha na-amụba na-eje ozi dị ka ndị ọrụ emume nsọ. Na nso nso a, otu igwe ndị ntoroọbịa karịrị 600 si na Scotland na Ireland gaa njem ruo na Preston England Tempụl, wee mee emume nsọ gafere 4,000, ọtụtụ nime ha bụ ndị nna nna ha ha nwụrụ anwụ! A na m agba gị ume ka isonye na agụgụala ezi na ụlọ, tinye oge na tempụl, ma jiri mkpachapụ anya kwado onwe gị ịbụ ụdị nwike ma ọ bụ nwanyị ahụ dị njikere ịlụ onye nsiso ahụ tozukwara oke na tempụl. Wulite usoro nime ndụ gị ugbua iji mee ka tempụl bụrụ otu akụkụ mgbe niile nke ndụ gị.
Nchịkọta
Ezi ụmụnnem ndị nwoke na nwanyị, ndị enyi nta m, enwere ike ịnwe ọtụtụ ihe isiike maka onye ọbụla niime anyị n’ụbọchị ndị na-abịa abịa. Nagbanyeghi, dị ka anyị na-abata n’afọ iri nke a jupụtara na emume ahụtụbeghi mbụ, ka anyị kesaa ozi obi ụtọ ahụ site n’emume dị mfe nke ibi ndụ, ịlekọta, ịkpọku na ịjikọta. Dịka anyị na-eme nke a, Onyenwe anyị ga-agọzi anyị jiri nhụmihe nke a na-agaghị echefu ma ọlị.
A na m agba aka ebe na ndị ahụ ga-abịakwute Onyenwe anyị jiri obi dị ọcha na uche ziri ezi, ndị ahụ nwere aha nke Onye Nzọpụta n’elu igbigbereọnụ ha ma Mmụọ Nsọ ahụ nime mkpụrụ obi ha, ndị ahụ na-eje njem ebube nke okwukwe a, ga-achọta na nwete nhụmihe selestịal bara ụba ma nata aka ebe na Chineke na-anụ unu, mara unu, ma hụ unu naanya. Unu ga-enwete nhụmihe nke ụbọchị ndị agaghị echefu ma ọlị. Na aha nke Jizọs Kraịst, amen.