“Nke a Bụ Ozi ọma M”—“Nke a Bụ Nzukọ nsọ M”
Nke a bụ ozi ọma nke Onye Nzọpụta, ma nke a bụ Nzukọ nsọ Ya (lee 3 Nifaị 27:21; Mozaya 26:22; 27:13). Ntụgwa ihe abụọ ahụ dị ike na nke na-ewete mgbanwe.
Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ntụ egbe bụ ihe kachasị dị ike n’ikwu egbe enwere. O nwere ike ịgbapụ ọtụtụ mkpụrụ agịrị, mana ọ dịghị ike n’ọrụ maka ọtụtụ ọrụ ngwuputa na ọrụ okporo ụzọ niile. Ọ dịghị ike nnọọ ịgbakasị nkume.
Na 1846 otu onye kemistị mba Italy akpọrọ Ascanio Sobrero mepụtara otu ihe na-eme egbe ekwuo ọhụrụ, nitroglycerin. Mmiri mmanụ nke a jiiri otu puku dị ike karịa ntụ egbe. Ọ nwere ike ịgbakasị nkume n’ụzọ dị mfe. Dị mwute, ejighị nitroglycerin n’aka. Ọ bụrụ ma gị wụpụ ya site n’ebe dị nta n’ogo, ọ ga-agba. Ọ bụrụ ma ya dịrị oke ọkụ, ọ ga-agba. Ọ bụrụ ma ya jụọ oke oyi, ọ ga-agba. Ọbụna edebe ya niime ụlọ jụrụ oyi, gbara itiri ma hapụ naanị ya, n’ikpeazụ ọ ga-agba. Ọtụtụ mba amachibidowo mbugharị ya, ma ọtụtụ machibidoro nrụpụta ya.
Na 1860 otu onye ọka sayensị mba Sweden akpọrọ Alfred Nobel malitere ịnwa ijikwata nitroglycerin. Mgbe afọ asaa nke mnwale gasịrị, o nwetere ebumnuche ya site n’ịmịbanye nitroglycerin niime ihe na-abachaghị uru a maara dị ka diatomaceous earth, ma ọ bụ kieselguhr. Kieselguhr bụ nkume nwere ọtụtụ urughuru oghere nke enwere ike ịgbari ịbụ ntụ mara mma. Mgbe agwakọtara ya na nitroglycerin, kieselguhr na-amịrị nitroglycerin ahụ, ma pọtọpọtọ na-apụta na ya ka e nwere ike ịkpụ dị ka “mkpịsị mkpịsị.” Niime ọdịdị nke a, nitroglycerin bụụrụ nke ejidere n’aka. E nwere ike chekwaa ya nke ọma, bugharịa ya, ma jiri ya na ntụ na-ekwu egbes na-adịghị nta. Nobel kpọrọ ntụgwa nke nitroglycerin na kieselguhr “dynamite.”
Dynamite gbanwere ụwa. O mekwara Nobel ọgaranya. Ewezuga ihe eji ejide ya n’aka, nitroglycerin dịịrị nnọọ oke njọ ịba uru n’ahịa, dị ka Ascanio Sobrero chọpụtara. N’onwe ya, dị ka m kwuru, kieselguhr bụ nke nwere uru ntakịrị. Mana ntụgwa ihe abụọ ahụ mere dynamite ji enwe mgbanwe na nke dị oke ọnụ ahịa.
N’ụzọ yiri nke a, ntụgwa nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a na-ewetere anyị uru dị ike na nke na-ewete mgbanwe. Ozi ọma zuru oke, mana nzukọ nsọ enyere ikikere sinachi ka achọrọ iji kwusaa ya, jikwaa ịdị ọcha ya, ma nye emume nsọ ya niile dị nsọ jiri ike na ikikere nke Onye Nzọpụta.
Tulee ntụgwa nke ozi ọma nke Onye Nzọpụta na Nzukọ nsọ Ya dị ka ehiwere site naka onye amụma Akwụkwọ nke Mọmọn Alma. Nzukọ nsọ ka ọ dị naka maka ikwusa “na-enweghị ihe ọzọ ewezuga nchegharị na okwukwe n’Onyenwe anyị, onye [ga-agbapụta] ndị ya.” Jiri ikikere nke Chineke, Nzukọ nsọ nwere oke na ọrụ maka inyefe emume nsọ nke baptizim “n’aha nke Onyenwe anyị, dị ka akaebe [nke ịbanye] niime ọgbụgba ndụ gị na ya [iji] jeere ya ozi ma debe iwu nsọ ya niile.” Ndị ahụ mere baptizim wekwasịrị n’onwe ha aha nke Jizọs Kraịst, sonye Nzukọ nsọ Ya, ma ekwere ha nkwa ike dị ukwuu site na mwụpụta nke Mmụọ.
Ndị mmadụ gbakọtara na Mmiri niile nke Mọmọn ịnụrụ ka Alma na-ekwusa ozi ọma. Agbanyeghị ha kwanyeere mmiri ndị ahụ ugwu ya na ọzara ndị gbara ya gburu gburu, Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị abụghị ebe ma ọ bụ ụlọ, ọbụghị ma ọ bụ ya taa. Nzukọ nsọ bụ nnọọ ndị mmadụ ọkpọrọ, ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, ekpokọtara ma hazie na ndokọ ehiwere sinachi nke na-enyere Onyenwe anyị aka mejupụta nzube Ya niile. Nzukọ nsọ bụ ngwa ọrụ anyị si na-amụ isi ọrụ nke Jizọs Kraịst niime atụmatụ nke Nna nke Eluigwe. Nzukọ nsọ na-enye ụzọ dị ssikikere maka ndị mmadụ n’otu n’otu isonye n’emume nsọ niile ma gbaa ndụ ebighị ebi ha na Chineke. Ị na-edebe ọgbụgba ndụ ndị ahụ na-akpọta anyị nso ruo Chineke, na-enye anyị ohere ruo nike Ya, ma gbanwee anyị ịghọ onye O bu n’obi anyị ịghọ.
Dị nnọọ ka dynamite na-enweghị nitroglycerin apụghị iche, Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta pụrụ iche naanị ma ewuo ya n’elu ozi ọma Ya. Ewezuga ozi ọma nke Onye Nzọpụta na ikike iji nye emume nsọ dị na ya, Nzukọ nsọ apụghị iche.
Ewezuga mmetụta njide n’aka nke kieselguhr, nitroglycerin nweburu uru belatara ebelata dị ka ihe na-ekwu egbe. Dị ka agụgụala gosiworo, ewezuga Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị, nghọta nke ụmụ mmadụ maka ozi ọma Ya bụkwa nke ejighị n’aka--na-agbagharị n’ozizi ma nọrọ n’okpuru ike mmetụta nke okpukperechi dị iche iche, omenaala niile, na fịlọsọfị niile. Njikọtaọnụ nke ike mmetụta ndị ahụ ka egosipụtaworo n’ọgbọ niile n’eduga ruo na nke ikpeazụ. Agbanyeghị na ekpughere ozi ọma ahụ na mbụ n’enweghị ntụpọ ya, ntapịa na ntinye n’ọrụ nke ozi ọma nwa obere nwa obere bịara were ọdịdị nke ịbụ chi nke na-enweghị ike niihi na onyonyo nwere ikike sinachi anọghị ya.
Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a na-enye ohere ruo ike nke Chineke niihi na O nyere ikike ma iji kuzie ozizi nke Kraịst ma iji nye emume nsọ niile na-azọpụta na nke na-ebuli elu. Onye Nzọpụta na-enwe oke agụụ ịgbaghara njọ anyị niile, nye anyị ohere inwete ike Ya, ma gbanwee anyị. Ọ tara ahụhụ maka mmehie anyị niile ma na-achọ ịgbaghara anyị site na ntaram ahụhụ nke anyị n’ụzọ ọzọ ga-enwete. Ọ na-achọ anyị ịdị nsọ ma zuo oke niime Ya.
Jizọs Kraịst nwere ike ime nke a. Ọ bịaghị nwee ọmịiko na nkịtị n’ebe ezughị oke anyị nọ ma tie mkpu ọmụma ikpe ebighị ebi anyị niihi mmehie anyị. Mba, Ọ gafere nke ahụ, gafee nke ahụ n’ụzọ na-enweghị atụ, ma weghachite Nzukọ nsọ Ya iji nwete ohere ruo n’ike Ya.
Isi ozi ọma nke Nzukọ nsọ na-akuzi bụ na Jizọs Kraịst buuru “mgbu anyị dị ka ibu arọ, ma buru mwute anyị.” Ọ “tụkwasiwo onwe ya ajọọ omume nke anyị niile.” Ọ “nagidere obe ahụ,” gbajie “agbụ niile nke ọnwụ,” rigoro n’eluigwe, ma … nọrọ ọdụ n’aka nri nke Chineke, ịnara site n’aka Nna oke ebere ya niile.” Onye Nzọpụta mere ihe nke a niile niihi na Ọ hụrụ Nna Ya naanya na Ọ hụrụ anyị naanya. Ọ kwuworịị ụgwọ ahụ na-enweghị atụ ka o wee “[kpọrọ] ndị ahụ niile nwere okwukwe na ya [ma kwuchite]” maka ha—maka anyị Ọ dịghị ihe ọzọ Jizọs Kraịst chọrọ karịa anyị ichegharị ma bịakwute Ya ka O nwee ike gbaghara anyị ma doo anyị nsọ. Niime ọchịchọ nke a, ike anaghị agwụ Ya ma naghị agbanwe agbanwe.
Ohere ruo n’ike ọgbụgba ndụ nke Chineke na ịhụnaanya ọgbụgba ndụ Ya bụ site na Nzukọ nsọ Ya. Ntụgwa ozi ọma nke Onye Nzọpụta na Nzukọ nsọ Ya na-agbanwe ndụ anyị. Ọ na-agbanwe ndị nne na nna m ukwu mụrụ nne m. Papa nnukwu m Oskar Andersson, rụrụ ọrụ n’ebe ụgbọ mmiri dị na Högmarsö, agwaetiti dị niime Stockholm archipelago. Nwunye ya, Albertina, na ụmụ ha biiri nala ndị Sweden. Otu ugboro n’sizu ụka abụọ ọbụla, na Satọde, Oskar kwọrọ ịgbọ mmiri ya laa ebe obibi maka ngwụcha izu ụka tupu ịlaghachi Högmarsö na mgbede Sọnde. Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ Högmarsö, ọ nụrụ ndị mgbasa ozi ọma abụọ si mba Amerịka na-ekwusa ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere. Oskar nwere mmetụta na ihe ya nuworo bụ eziokwu na-enweghị ntụpọ, ma ọńụ na-enweghị otu esi akọ ya juputara ya n’obi.
Mgbe ọzọ ọ lọghachiri ebe obibi, Oskar n’obi ụtọ gwara Albertina ihe niile gbasara ndị mgbasa ozi ọma ahụ. Ọ kọwara na ya kwere ihe ha kuziri. Ọ rịọrọ ya ịgụ pamfleetị ha nyeworo ya, ma ọ gwara ya na ya echeghị na nwa ọbụla ọzọ na-abịa ga-eme baptizim dị ka nwa ọhụrụ. Albertina were iwe nke ukwuu ma tufuo pamfleetị ndị ahụ nelu mkpomkpo unyi. Ọ dịghị ọtụtụ ihe ekwuru netiti ha tupu Oskar alaghachi n’ọrụ na mgbede Sọnde.
Ngwa ngwa ọ pụrụ, Albertina wereghachiri pamfleetị ndị ahụ. O jiri nlezianya tụnyere ya ozizi ha ya na nkuzi niile dị niime Baịbụl ya. Ọ tụrụ ya naanya ịmata na ihe ọ gụrụ bụ eziokwu. Mgbe ọzọ Oskar lọghachiri ebe obibi, ọ nwetere nnabata dị mma, dị ka kwa kọpị nke Akwụkwọ nke Mọmọn o jiri lọta. Albertina jiri ịnụ ọkụ n’obi na-agụ, ọzọkwa na-atụnyere ozizi ahụ nye nke dị niime Baịbụl ya. Dị ka Oskar, ọ matara eziokwu na-enweghị ntụpọ ma juputa nọńụ ọnụ na-apụghị ikwu.
Oskar, Albertina, na ụmụ ha kwagara Högmarsö ịnọ ndị otu Nzukọ nsọ dị ole ma ole nọ ebe ahụ nso. Otu izu mgbe Oskar na Albertina mesịrị baptizim na 1916, akpọrọ Oskar ịbụ onyeisi otu nọ na Högmarsö. Dị ka ọtụtụ ndị atọghatara atọghata, Oskar na Albertina gabigara nnyocha niihi okpukperechi ọhụrụ ha. Ndị ọrụ ugbo nọ n’obodo ahụ jụrụ ajụ iresị ha mmiri ara ehi, ya mere Oskar kwọrọ ụgbọ mmiri kufee fjord ụbọchị ọbụla ịzụ mmiri ara ehi site n’aka otu onye ọrụ ugbo na-anabata karịa.
Ma niime afọ ndị sochirinụ, otu Nzukọ nsọ na Högmarsö bawanyere, n’otu aka niihi ama dị ike na ọnụnụ ọkụ n’obi mgbasa ozi ọma nke Albertina. Mgbe otu ahụ bịara bụrụ ngalaba nta, akpọrọ Oskar dị ka onyeisi ngalaba nta.
Ndị otu nke ngalaba nta Högmarsö ahụ sọpụụrụ agwaetiti ahụ. Nke a bụ Mmiri nke Mọmọn ha. Nke a bụ mgbe ha nwetere mmata ihe nke Onye Mgbapụta ha.
Niime afọ niile, dị ka ha na-edebe ọgbụgba ndụ baptizim ha, Oskar na Albertina ka agbanwere site n’ike nke Jizọs Kraịst. Ha tụrụ anya ịgba ndụ ọzọ ma nata ngọzi niile nke tempụl ha. Ịnata ngọzi ndị ahụ, ha kwagara site n’ebe obibi ha na Sweden ruo na Obodo Salt Lake na 1949 kpamkpam. Oskar ejewo ozi dị ka onye ndu nke ndị otu na Högmarsö ruo afọ 33.
Ngwakọta nke nitroglycerin na kieselguhr mere dynamite abaa uru; ngwakọta nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst na Nzukọ nsọ Ya gafere ọnụ ahịa. Oskar na Albertina nụrụ gbasara ozi ọma eweghachitere niihi onye amụma nke Chineke akpọwo, nye ọrụ, ma ziga ndị mgbasa ozi ọma na Sweden. Site na ọrụ sinachi, ndị mgbasa ozi ọma kuziri ozizi nke Kraịst ma site n’ikike nke ọkwa nchụaja mee Oskar na Albertina baptizim. Dị ka ndị otu, Oskar na Albertina garaniihu na-amụ ihe, na-etolite, ma na-ejere ndị ọzọ ozi esepụghị aka. Ha bịara bụrụ Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a niihi na ha debere ọgbụgba ndụ ndị ha mere.
Onye Nzọpụta na-akpọ Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a dị ka “nzukọ nsọ m” niihi na O nyewo ya ikike iji mejuputa ebumnuuche Ya niile—ikwusa ozi ọma Ya, na-enye emume nsọ Ya niile na ọgbụgba ndụ Ya niile, ma na-eme ya ekwe omume maka ike Ya iji gbaghara ma doo anyị nsọ. Ewezuga Nzukọ nsọ Ya, enweghị ikike ọbụla, ọdịghị nkwusa ozi ọma nke eziokwu ndị ekpughere naha Ya, enweghị emume nsọ ma ọ bụ ọgbụgba ndụ ọbụla, enweghị ngosipụta nke ike nke iyi Chineke, enweghị mgbanwe ghọọ onye Chineke na-achọ anyị ịghọ, ma atụmatụ nke Chineke maka ụmụ Ya ka ejiri mee ihe efu. Nzukọ nsọ n’ọgbọ nke a dị oke mkpa nye atụmatụ Ya.
Ana m akpọku unu ịranye onwe unu n’uju karịa nye Onye Nzọpụta, ozi ọma Ya, na Nzukọ nsọ Ya. Dị ka unu na-eme otu a, unu ga-achọta na ngwakọta nke ozi ọma nke Onye Nzọpụta na Nzukọ nsọ Ya na-ewete ike niime ndụ unu. Ike nke a dị nnọọ ukwuu karịa dynamite. Ọ ga-agbakasị nkume niile nọchiri ụzọ gị, gbanwee gị ịghọ onye nketa oke niime alaeze nke Chineke. Ma ị ga-”ejupụta nʼọn̄ụ ahụ nke ọnụ na-apụghị ikwu ma jupụtakwa nʼebube.” Site n’aha nke Jizọs Kraịst, amen