Ọgbakọ Zuru ọha
Akwụkwọ nsọ ndị Dị nsọ—Ntọala niile nke Okwukwe
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


Akwụkwọ nsọ ndị Dị nsọ—Ntọala niile nke Okwukwe

Anyị apụghị ileda mkpa nke ọrụ akwụkwọ nsọ niile dị nsọ na-arụ ma na-ime mgbanwe niile ma ime ka anọgide kwesị ntụkwasị obi niime ozi ọma.

Nwunye m, Mary, na mụ na nso nso a hụrụ T-shirt esere foto nke otu akwụkwọ na ozi n’ihu ya nke agụrụ, “Akwụkwọ niile: Ngwa Mkpanaka Nsinambụ.”

T-shirt na-ekwu, “Akwụkwọ niile: Ngwa Mkpanaka Nsinambụ.”

E chere m banyere ozi nke a na-adọrọ mmasị na otu ngwa mkpanaka niile nke ụdị ọbụla siworo dịrị. Ịga niihu na-atụgharị uche, a matara m na ngwa ọbụla ma ọ bụ nke e jiri ọgụgụ isi akamere kwadebee enweghị ike a dị mkpa dị ka ma ọ bụ dị ịrịba ama dị ka odudu ime mmụọ nke na-abịa site na mkpughe sinachi.

Ma ọ bụ mkpanaka ma ọ bụ nke dijitaalụ, Baịbụl Nsọ na Akwụkwọ nke Mọmọn: Ama Ọzọ nke Jizọs Kraịst na-ewete odudu ime mmụọ na nkuzi site n’aka Jizọs Kraịst, Onye Nzọpụta nke ụwa. Anyị ji akwụkwọ ndị a kpọrọ ihe maka ọrụ ha dị omimi na-idekọta odudu nke Chineke nye ndị amụma mgbe gboo na ndị mmadụ na odudu ha na-ewete maka ndụ nke onwe anyị.

Mgbe ejikọtara ya na nkuzi niile nke ndị amụma dị ndụ, akwụkwọ nsọ ndị a dị nsọ na-ewete odudu nke ozizi niihi anyị niime ụwa nke taa. Akwụkwọ nsọ ndị a kachasị dị ike mgbe ha na-enye nkuzi, mgbazi olu, nkasi obi, na ngụgụobi nye ndị mmadụ na ezi na ụlọ niile ndị na-achọ odudu site naka Onyenwe anyị.

Akwụkwọ nsọ niile, ejikọtara ya na mkpate ime mmụọ sitere n’aka Mmụọ Nsọ, garaniihu ịbụ isi nsipụta nke na-eme ka mgbanwe nke ndị ahụ nwere obi ndị tiwara etiwa na mmụọ ndị dị nchegharị na ọchịchọ isoro Jizọs Kraịst. Akwụkwọ nsọ na-enye aka iwulite ntọala nke nwere ike ịnagide mbọ niile nke onye iro na-adị mgbe niile imebi okwukwe.

Ndị atọghatara ọhụrụ agọziwo ma bụrụ ọbara ndụ nke Nzukọ nsọ gburugburu agụgụala ya niile. Otu ọmụmaatụ dị m ezi oke ọnụ ahịa. Mgbe m bụ bishọp nta, ụmụnne nwanyị mgbasa ozi ọma abụọ dị ịtụnaanya naara akuziri ezi na ụlọ William Edward Mussman. Nna ha, ọka iwu dị ike, bụ onye ndụmọdụ izugbe nke otu nnukwu ụlọ ọrụ. Nwunye ọma ya, Janet, nọ na-enyere ezi na ụlọ ya aka na-agba mbọ ibi ndụ yiri Kraịst karịa.

Nwa ha nwoke na nke nwanyị pụrụ iche, ha abụọ gbara afọ mbido 20 ha, ka anakwaara akuziri. Ha anọ niile anatawo nkuzi niile ahụ ma naara abịa nzukọ nsọ. Ụmụnne nwanyị mgbasa ozi ọma ahụ ekwusiwo ike ịgụ Akwụkwọ nke Mọmọn na ikpe ekpere maka ama nke akwụkwọ nsọ ahụ dị nsọ. N’ụzọ dị ịrịba ama, ezi na ụlọ ahụ ji ekpere gụọ Akwụkwọ nke Mọmọn n’obere oge.

Ndị mgbasa ozi ọma stek, ha abụọ bụụrụ ndịisi Otu Enyemaka nke ngalaba ukwu, sooro ha gaa nzukọ oriri nsọ niile.

Dị ka ezi na ụlọ ahụ naara abịa baptizim nso, ha natara abọ agụmagụ ndị kwutọrọ Nzukọ nsọ. Nke a bụ tupu intanet, mana akụrụngwa ahụ juru igbe cardboard buru nnukwu ibu.

Ụmụnne nwanyị mgbasa ozi ahụ kpọkuru m dị ka bishọp gbara afọ 34 akpọrọ ọhụrụ inye aka zaa ajụjụ ndị a jụrụ. Mgbe anyị gbakọtara n’ọnụ ụlọ ezumiike ha, nnukwu igbe nke agụmagụ ndị kwụtọrọ Nzukọ nsọ nọ n’etiti ọnụ ụlọ ahụ. E jiworo m ekpere zute ọrụ nke a. N’oge ekpere mmepe ahụ, Mmụọ takanyeere m, “Ọ maraworịị na ọ bụ eziokwu.” Nke a dịịrị mkpa. Ụmụnne nwanyị ndị ahụ kwere na ndị otu ezi na ụlọ ahụ enweteworịị ama. Ha ejighị n’aka banyere nna ha.

Ngwa ngwa a gwara m ya na Mmụọ akpatewo m na ya enweworịị ama. “Nke ahụ ọ bụ eziokwu?” O bu ihe n’obi wee lee m anya ma kwuo na Mmụọ ahụ akwadowo eziokwu nke Akwụkwọ nke Mọmọn na Nzukọ nsọ nye ya.

Mgbe ahụ a jụrụ m ajụjụ ma ọ ga-adị mkpa inyochagharị agụmagụ ndị ahụ, ọ bụrụ na ha enwetewo nkwado nke ime mmụọ.

Nna ha zaghachiri na ọ gaghị adị mkpa. Ndị otu ezi na ụlọ ahụ kwekọrịtara na azịza ya.

Ọ sịrị na ya nwere otu ajụjụ dị ezi mkpa: Otu ihe kpatara ha jiri nata ọtụtụ agụmagụ na-emegide Nzukọ nsọ bụ na ha bụụrụ ndị otu okpukperechi ọzọ. Na mgbakwunye, o kwewo nnukwu nkwa inyere ha aka wuo ụlọ ụka ọhụrụ maka okpukperechi ahụ. Ọ gwara m na ụmụnne nwanyị mgbasa ozi ọma akuziworo ya banyere mkpa nke ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri, nke ọ nabatara n’obi ekele, mana ọ na-eche ma ọ ga-abụ ihe n’ezighị ezi imezu nkwa ahụ o kweworo mgbe gara aga. A masiri m ya obi ike na ịkwụ ụgwọ ahụ ga-abụ ihe ugwu na ihe kwesịrị ekwesị.

Ezi na ụlọ Mussman.

Ndị Mussman na nwa ha nwoke, nwunye nwa, na nwaada.

Ezi na ụlọ ahụ niile mere baptizim. Otu afọ agasịa ha a rachie dị ka ezi na ụlọ niime Tempụl Oakland California. Ohere ọma dịịrị m ịnọ ebe ahụ mgbe ahụ. Nwa ha nwoke gụzuru ụlọakwụkwọ iwu, paasịa Ule Bar California, ma ngwa ngwa jee ozi mishọn kwesịrị ntụkwasị obi na Japan. A hụwo m n’afọ ndị gara aga dị ka ndudugandu ndị sotere nọgideworo ikwesị ntụkwasị obi nye ozi ọma. Ohere ọma dịịrị m idu nrachi nke otu niime nwa nwa ha nwanyị.

Mgbanwe niile nke na-eme n’ụbọchị anyị pụkwara iche. Jun gara aga, Coach Andy Reid, onyeisi coach football nke Kansas City Chiefs, na m, nakwa ndị ọzọ na-anọchite okpukperechi anyị na okpukperechi ndị ọzọ, kwuru okwu na mmemme ọtụtụ okpukperechi na Riverside Church dị niime Obodo ukwu New York. Coach Reid kwusiri ike ohere nke ugboro abụọ na ịzaghachi oku niile na ohere niile, nke bụ ihe niile ozi ọma nke Jizọs Kraịst bụ maka ya. Ụtụtụ nke sotere, anyị na ndị nwunye anyị, Tammy Reid na Mary, anyị gara nzukọ oriri nsọ na Ngalaba ukwu Manhattan Second. Ọ bụ nzukọ ofufe ime mmụọ. E nwere ọtụtụ ndị atọghatara ọhụrụ nọ niime ọgbakọ ahụ. Ndị otu ise a ka mere baptizim, ndịikom anọ na otu nwa okoroọbịa nta, nọọrọ n’etiti ndị otu Ọkwa nchụaja nke Erọn naara ekesa oriri nsọ. Obi dị m ụtọ ịkọwa na ụdị nnubata nke ndị otu ọhụrụ na-eme gburugburu Nzukọ nsọ.

Obi dị anyị ekele maka mbawanye ahụrụ anya niime ndị ahụ na-azaghachi nye oku niile dị nsọ, gbanwee ndụ ha, ma nabata ohere isoro Jizọs Kraịst. Ha na-abanye ụzọ ọgbụgba ndụ site n’okwukwe, nchegharị, baptizim, na Emume nnabata dị ka akuziri niime Baịbụl Nsọ na Akwụkwọ nke Mọmọn.

Anyị apụghị ileda mkpa nke ọrụ akwụkwọ nsọ niile dị nsọ na-arụ ma na-ime mgbanwe niile ma ime ka anọgide kwesị ntụkwasị obi niime ozi ọma. Ndị amụma mgbe gboo akọwara niime Akwụkwọ nke Mọmọn maara banyere ozi nke Jizọs Kraịst ma kuzie ozi ọma Ya. Akwụkwọ nke Mọmọn na-enyere anyị aka bịaruo Chineke nso dị ka anyị na-amụ, na-aghọta, ma na-etinye n’ọrụ nkuzi ya niile. Onye amụma Joseph Smith kuziri na “nwoke [ma ọ bụ nwanyị] ga-abịaru Chineke nso karịa site na-isoro ụkpụrụ niile [nke akwụkwọ ahụ] karịa site n’akwụkwọ nke ọbụla ọzọ.”

Ịji mata na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ okwu nke Chineke, anyị ga-agụ ya, tulee ya, ma kpee ekpere banyere ya ma emesịa mee ihe dị ka ụkpụrụ ya niile siri dị. Onye amụma Moronaị kwere nkwa na Chineke ga-ekpughe eziokwu nke akwụkwọ ahụ nye anyị dị ka anyị na-ekpe ekpere n’ezi obi, jiri ezigbo ebumnuuche, nakwa okwukwe niime Kraịst. Ị na-amụ ihe na Akwụkwọ nke Mọmọn dị mkpa maka mgbanwe na-anọgide.

Dị ka anyị na-atụle mmekọrịta dị n’etiti Baịbụl na Akwụkwọ nke Mọmọn dị ka ngwa mkpanaka, mmadụ nwere ike jụọ ajụjụ. Kedụ uru na mmeju i chere na akwụkwọ abụọ ga-abụ ọ bụrụ ma Onyenwe anyị maa ọkwa na a ga-ejikọta ha ọnụ ma “bụrụzie otu n’aka gị”? Nke ahụ bụ ihe Onyenwe anyị mara ọkwa gbasara “osisi nke Juda,” Baịbụl, na “osisi nke Joseph,” Akwụkwọ nke Mọmọn.

Niime ọtụtụ ihe dị ịrịba ama, Akwụkwọ nke Mọmọn na-ewete isi ozizi nke na-emelite ma wulite nelu nke Baịbụl. Ozizi nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst bụ ọmụmaatụ dị omimi.

Baịbụl na-ewete nkọwapụta ziri ezi nke ije ozi nke Jizọs Kraịst, gụnyere ọnwụ na Mbilite n’ọnwụ Ya. Akwụkwọ nke Mọmọn kacha doo anya n’ihe banyere Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst, ihe ndị amụma kọwara nke ọma tupu ọnwụ Ya.

Isi nke Alma Isi nke 42 na-egosi uru nke ozizi nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.

Ọ na-agụ: “Ndụ a pụrụ ịnwụ anwụ bụ oge mnwale inyere mmadụ aka ichegharị ma jeere Chineke ozi—Ọdịda ahụ wetara ọnwụ nke arụ na nke mmụọ nye mmadụ niile—Mgbapụta na-abịa site na nchegharị—Chineke n’Onwe Ya na-achụ aja mgbaghara mmehie niile nke ụwa—Ebere bụ maka ndị chegharịrị—Ndị ọzọ niile nọ n’okpuru ikpe ziri ezi nke Chineke—Ebere na-abịa niihi Aja mgbaghara mmehie ahụ—Naanị ndị nwere ezigbo nchegharị ka a ga-azọpụta.

Onyeisi Russell M. Nelson ekwuwo: “Ana m ekwe nkwa na dị ka ị na-eji ekpere amụ Akwụkwọ nke Mọmọn ụbọchị niile, ị ga-eme mkpebi ndị ka mma karịa—ụbọchị niile.” O kwekwara nkwa na ọ bụrụ na “gị mikpuo onwe gị niime Akwụkwọ nke Mọmọn, i nwere ike gbochie onwe gị megide ihe ọjọọ niile nke ụbọchị.”

Dị ka m kwuru, obi tọrọ m ụtọ nihi echiche ahụ nke ngwa mkpanaka nsinambụ—akwụkwọ. Kosiladị, a matara m uru dị ịtụnanya nke intanet niime ụwa taa. Otu ngwa mkpanaka oge ugbu a pụrụ iwete ozi nke amara na mbụ na-ejuputa nnukwu ọba akwụkwọ. Obi dị anyị ekele ibi ndụ n’ụdị oge dị ka nke a. Obi dị m ekele karịsịa na ọ na-ekwe akwụkwọ ndị dị nsọ na akụrụngwa Nzukọ nsọ ịdị adị n’ikuku. Intanet bụ ngwa dị ike eji amụ ozi ọma. Taa, ọtụtụ mmadụ na-ekesa akwụkwọ nsọ ha na ndị enyi jiri teknụzụ. App Akwụkwọ nke Mọmọn, na-ịmaatụ, bụ ụzọ dị ịtụnaanya iji gosi ndị enyi Akwụkwọ nke Mọmọn ma nwere ike dị mfe ikesa n’ụzọ ndị nkịtị na eke ebe ọbụla i nwere ike ịnọ.

App nke Akwụkwọ nke Mọmọn

Ebe intanet na-ewete ọtụtụ ngọzi, dị mwute, dị ka agụmagụ edere ede ahụ kwutoro Nzukọ nsọ nke m kọwara na mbụ, ejiwokwa ya ji kepụta obi abụọ ma zọgide okwukwe ụkwụ niime ụkpụrụ ozi ọma ndị dị oke ọnụ ahịa. O nwere ike bụrụ akụkụ nke “ihe ọjọọ niile nke ụbọchị” nke Onyeisi Nelson kwuru.

Onye iro na ndị na-enyere ya aka, na-ịma ama ma ọ bụ amaghị ama, ekepụtawo niime intanet ihe dị nha dị ka igbe ahụ juputara n’akụrụngwa edere ede kwutọrọ Nzukọ nsọ nke m kọwara na mbụ, nke ebụn’obi bụ ịdọpụ uche gị site n’eziokwu nke Chineke.

Okwu ahụ ekwulitere iji mepụta obi abụọ nọtụtụ afọ gara aga eyiworịị ibe ha n’ụzọ pụrụ iche. Nke a karịsịrị ịbụ eziokwu mgbe ị tụnyere ụbọchị anyị ya na ndị 1960, mgbe m gbara afọ 20 n’ụma m.

Akwụkwọ nsọ na-akuziri anyị iji ikpe ikpe ma mara ihe n’ihe niile. E nwere ike jiri intanet n’ụzọ dị mma ma ọ bụ n’ụzọ na-ebibi.

Ma ndị otu nọteere anya ma ndị ahụ na-amụ ozi ọma ọhụrụ kwesịrị ịkpachara anya banyere ihe ha na-elele. Anabatakwala akụrụngwa ndị n’enweghị ezi omume, na-adịghị ekwu eziokwu, ma ọ bụ dị ajọọ omume. Ọ bụrụ ma gị mee ya, ihe ndị nọ ya niime nwere ike idu gị baa n’ụzọ nke na-ebibi okwukwe ma mebie ọganiihu ebighị ebi gị. E nwere ike rụọ gị ọrụ n’ahụ n’ụzọ dị mma ma ọ bụ n’ụzọ dị njọ. Chọọ ezi omume ma zere olulu rabbit intanet gbara ojii ya na ịchọgharị ihe na-ewe iwe na intanetị. Mejuputa ndụ gị jiri echiche dị mma, dị ezi omume; nwee obi ụtọ; nwee ańụrị mana zere ịda aparị. E nwere ọdịiche. Ọnụọgụgụ edide nke okwukwe ọnụọgụgụ iri na atọ bụ odudu dị ịtụnaanya. Karịa ihe niile, mikpuo onwe gị nwayọ nwayọ niime Akwụkwọ nke Mọmọn, nke na-adọta Mmụọ ahụ niime ndụ gị ma nyere gị aka mata eziokwu site na mmejọ.

Ndụmọdụ m nye ndị ahụ nụzọ ọbụla adapụwo site n’ụzọ ọgbụgba ndụ bụ ịlaghachi n’akwụkwọ nsọ niile dị nsọ, odudu nke amụma, imezu ọrụ okpukperechi niile n’ebe obibi, na egwu nke okwukwe. Mkpụrụ obi niile dị oke ọnụ ahịa nye Onyenwe anyị. Anyị chọrọ gị! Onyenwe anyị chọrọ gị, ma ị chọkwara Ya! A ga-anabata gị mgbe niile. N’oge ọtụtụ afọ m niile nke ije ozi Nzukọ nsọ, ndị mmadụ dị ịtụnaanya lọghachiri n’ụzọ ọgbụgba ndụ ma emesịa jee ozi ma gọzie ndị niile ha hụrụ naanya ma ọ bụ ndị ha zutere amasịwo m.

Akwụkwọ nsọ niile dị nsọ na ndị amụma dị ndụ bụ nnuku ụzọ Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya si eme atụmatụ obi ụtọ Ya dị adị nye ụmụ Ya niile.

Ana m agba akaebe m siri ike nke ịdị nsọ nke Jizọs Kraịst na nsiridị nke Aja mgbaghara mmehie Ya, n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Lee 2 Timoti 3:16.

  2. Lee Kwusaa Ozi ọma M: Odudu iji Kwusaa Ozi ọma nke Jizọs Kraịstt (2023), 28; lee kwa 2 Nifaị 2:7; 3 Nifaị 12:19; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:37; Ezra Taft Benson, “Nnukwu Mgbanwe nke Obi,” Ensign, Oct. 1989, 2–5.

  3. Ụmụnne nwanyị Beverly Bridge na Cheryl Morgan bụụrụ ụmụnne nwanyị ndị mgbasa ozi ọma ahụ.

  4. Nwa ha nwoke, William E. Mussman III, agụsiwo na Stanford ma nọ na-aga ụlọakwụkwọ iwu dị na Mahadum California, niime San Francisco. Nwanne ya nwanyị, Ann C. Mussman, nọ na-agụ akwụkwọ na Mahadum Stanford.

  5. Ụmụnne nwanyị Eleanor Mehr na Nwanne nwanyị Louise Johnson bụụrụ ndị mgbasa ozi ọma stek ahụ.

  6. The New York Latter-day Saint Professional Association (NYLDSPA) kwanyeere Reverend A. R. Bernard na Coach Andrew “Andy” W ugwu. Reid dị na historic interdenominational Riverside Church niime Manhattan. Ndị ndu Nzukọ nsọ sitere n’okpukperechi anyị na ọtụtụ okpukperechi ndị ọzọ nọkwaara ebe ahụ, gụnyere honoree Rabbi Joseph Potasnik mbụ.

  7. Lee Tad Walch, “How Andy Reid’s Beliefs in Jesus Christ and a Second Chance for Michael Vick Guide the Kansas City Chiefs,” Deseret News, July 3, 2024, deseret.com.

  8. Ihe gafere 198,000 nke ndị atọghatara ọhụrụ ka emeworo baptizim site na Jenụwarị 1, 2024, ruo Ọgọst 30, 2024 (information provided by the Missionary Department).

  9. Kwusaa Ozi ọma M isi nke 5 na-akọwa ihe kpatara Akwụkwọ nke Mọmọn ji bụrụ isi nkume nke okpukperechi anyị.

  10. Ndubata nke Akwụkwọ nke Mọmọn.

  11. Onye amụma Joseph Smith gbara ama na mmadụ ga-agaru Chineke nso site n’isoro ụkpụrụ ndị akuziri niime Akwụkwọ nke Mọmọn karịa site n’akwụkwọ ọbụla ọzọ (lee ndubata nke Akwụkwọ nke Mọmọn).

  12. Lee Moronaị 10:4.

  13. Lee Izikel 37:15–17; lee kwa 2 Nifaị 3:12.

  14. Mkpụrụokwu ahụ Aja mgbaghara mmehie, nke Jizọs Kraịst ka ekwuru naanị otu ugboro niime Testament Ọhụrụ (lee Ndị Rom 5:11). Niime Akwụkwọ nke Mọmọn, mkpụrụokwu ahụ Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst ka arụtụrụ aka ugboro 24. 2 Nifaị 2:10 na-akọwa obi ụtọ nke agbakwunyere site na Aja mgbaghara mmehie (lee kwa index nke Akwụkwọ nke Mọmọn, “Jizọs Kraịst, Aja mgbaghara mmehie site na”).

  15. Russell M. Nelson, “Akwụkwọ nke Mọmọn: Gịnị Ka Ndụ Gị Ga-adị Ka Ya Ma ewezuga Ya?,” Liahona, Nov. 2017, 62–63.

  16. Naanị chee otu e siri gọzie anyị izu ụka niile dị ka anyị na-amụ ihe site na Bịanụ, Soro M n’ikuku.

  17. Ụfọdụ niime okwu ndị ahụ abụghị eziokwu ma ọlị. Ụfọdụ na-ewepụ eziokwu site n’isiokwu. Ụfọdụ na-ekwuchitere okwu ọha ndị na-adabaghị ma na Baịbụl ma na Akwụkwọ nke Mọmọn. Ụfọdụ na-ekwu nke na Onyenwe anyị enyebeghị mkpughe ọbụla.

  18. Doomscrolling is the act of habitually and obsessively searching for negative or depressing news on social media or news feeds (see Merriam-Webster.com Dictionary, “doomscroll”).

  19. Nzukọ nsọ ahụbigawo uto dị ịrịba ama na ọnụọgụgụ ndị na-abịa abịa bawanyere na afọ nso nso ndị a. Percent ndị na-ahapụ Nzukọ nsọ dị obere karịa n’oge gara aga, mana anyị chọrọ ndị otu ọbụla.