Ejikọtara na Jizọs Kraịst: Ịghọ Nnu nke Ụwa
Dị ka anyị na-anọgide na njikọta nye Onyenwe anyị, ndụ anyị n’ụdị eke ga-egosị ihe Ya, ma anyị ga-aghọ nnu nke ụwa.
Onye Nzọpụtakuziri na mgbe a kpọbatara anyị n’ozi ọma dị ebighị ebi [Ya], na ọgbụgba ndụ nwere ọgbụgba ndụ dị ebighị ebi, ana agụnye [anyị] dị ka nnu nke ụwa.” Nnu bụ ihe eji akụrụngwa abụọ ejikọtara ọnụ mee. Anyị enweghị ike ịbụ nnu n’onwe anyị; ọ bụrụ na anyị ga-abụ nnu nke ụwa, anyị ahaghị ịbụ ndị ejikọtara ọnụ nye Onyenwe anyị, ma nke ahụ bụ ihe m na-ahụ dị ka mụ na ndị otu Nzukọ nsọ na-akpakọta na gburugburu ụwa—ana ahụ ndị otu Nzukọ nsọ kwesịrị ntụkwasị obi ejikọtara nye Onyenwe anyị, dị uchu na mbọ ha ijere ndị ọzọ ozi ma bụrụ nnu nke ụwa.
Nraranye unu na-adịghị ada mba bụ ọmụmaatụ dị mma. Ozi unu bụ ihe anabatara nke ọma ma na-enye obi ụtọ.
Ndị ntoroọbịa anyị egosịwo mgbam ume na nnukwu ịhụnaanya dị ịrịba ama. Ha ejiriwo oke mmasị nabata ọrụ nke agụgụala ezi na ụlọ, ma ojije ha mgbe na mgbe n’ụlọ nke Onyenwe anyị bụ ihe aka ebe nye nraranye ha. Ịdị njikere ha inyefe oge na ume ha n’ije ozi mishọn n’ofe gburugburu ụwa na-egosị okwukwe dị omimi na anọgide. Ọ bụghị naanị na ha na-esonye mana na-edu n’ụzọ ịghọ ndị na-eso ụzọ ejikọtara ọnụ na Jizọs Kraịst. Ozi ha na-enye ihe na olileanya, na-emetụta ndụ ana apụghị ịgụta ọnụ. Nye unu, ndị ntoroọbịa nke Nzukọ nsọ, anyị na-ekwuputa ekele si anyị n’obi maka ozi mkpakemmụọ unu. Unu abụghị nnọọ naanị ọdịniihu nke Nzukọ nsọ mana nke ya ugbua. Ma n’ezie unu bụ nnu nke ụwa!
A hụrụ m Onyenwe anyị Jizọs Kraịst naanya ma nwee mmetụta onye a gọziri agọzi site na ohere ije ozi n’akụkụ unu ndị nọ na Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị. Ịdị n’otu na ume anyị, gbakwasara ụkwụ na nkwekọrịta okwukwe anyị, na-amasi anyị obi ike na ọ bụghị naanị anyị so na njem nke a. N’igwe, anyị nwere ike na-agaaniihu iwu alaeze Chineke, gbaa mgbọrọgwụ n’ije ozi, inwe ịhụnaanya, na okwukwe na-adịghị ada mba.
Mgbe Jizọs Kraịst kuziri ihe n’akụkụ Oke osimiri nke Galilee, ọtụtụ mgbe O jiri akụrụngwa ụbọchị niile nke ndị na-ege ya ntị maara iji kwuo eziokwu niile nke ime mmụọ dị omimi. Otu n’ụdị akụrụngwa ahụ bụ nnu. Jizọs mara ọkwa, “[Unu] bụ nnu nke ụwa,” okwu ekwuru juputara na nghọta na ịdị mkpa, nke ka nke maka ndị nke oge Ya, ndị ghọtara uru dị iche iche nke nnu bara.
Akaọrụ nke nkọpụta nnu mgbe ochie na Algarve, na mpaghara ndịda ndịda nke ebe obibi na mba Portugal, ka amaraa puku kwuru puku afọ ndị gara aga ruo n’oge nke Roman Empire. N’ụzọ dị ịrịba ama, ụkpụrụ nke ndị ọrụ nnu jiri, a maara dị ka marnotos, agbanwewo obere kemgbe ahụ. Ndị ọrụaka ndị a dị uchu n’ọrụ tinyere usoro ọdịnaala niile, na-arụ ọrụ ha kpam kpam jiri aka, jigidesie ike ihe si n’aka ndị nna nna ochie rute ha nke na-anọgidewo kemgbe ọtụtụ narị afọ.
Usoro mgbe ochie nke a na-ewepụta ihe a kpọrọ “flower of salt.” Na-ịnabata nke ọma usoro gbagwojuru anya nke iwepụta flower of salt ahụ, ọ bụ ihe dị oke mkpa ịghọta agbata ebe ana anọ emepụta ya. Apịtị akụkụ oke osimiri nke Algarve na-ewete ọnọdụ ndị dabara adaba maka mmepụta nnu. Mmiri oke osimiri bụ ihe a na-awaba niime ọdọ mmiri na-adịghị omimi, nke a maara dị ka abadaba efere nnu, ebe ana ahapụ ya ịta mmiri n’okpuru oke anyanwụ. Dị ka mmiri ahụ na-ata, flower of salt ahụ na-aghọ kristal ndị dị nro n’elu mbadamba efere nnu ahụ. Kristal ndị ahụ na-adị ụcha nke ukwuu ma nwee ụdị pụrụ iche, kpọọ akpọọ ma dị mfe ịgbaji. Marnotos ahụ na-akpachapụ anya ekuputa kristal ahụ niile site n’elu mmiri ahụ na-eji ngwa ndị pụrụ iche, usoro nke chọrọ nnukwu nka na nkenke. Na Portugal, nnu nke a dị ezigbo mma ka-ana arụtụ aka dị ka “salt cream” niihi na eji nwayọọ ekuputa ya dị ka krim na-ekoli n’elu mmiri ara ehi. Nnu nke a dị nro na-adị mma n’obi niihi ịdị ọcha ya na ụtọ ya pụrụ iche, na-eme ya ngwa nri dị oke ọnụ na nka isi nri.
Dị nnọọ ka marnotos na-agba nnukwu mbọ iji hụ na ha kuputara ụdị nnu kachasị mma, otu ahụkwa ka anyị kwesịrị, dị ka ndị ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị, mgbe niile ga na-eme ihe anyị kachasị nwee ike nke ga-eme ka ịhụnaanya na ọmụmaatụ anyị bụrụ, dị ka o kwere omume, onyonyo na-enweghị ntụpọ nke Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst
N’ụwa mgbe ochie, nnu karịrị nnọọ ihe eji eme ka nri tọọ ụtọ—ọ bụ ihe eji echekwa ihe dị mkpa na akara nke ịdị ọcha na ọgbụgba ndụ. Ndị mmadụ maara na nnu dị oke mkpa maka ichekwa nri ma na-enye aka n’ụtọ. Ha ghọtakwara ọghọm dị egwu banyere nnu ịhapụ ihe o ji atọ nnunnu ma ọ bụ ụtọ ya, site na ịgwarụ agwarụ ma ọ bụ ịgwajụ agwajụ.
Dị ka nnu nwere ike itufu ihe o ji bụrụ nnu, anyị nwekwara ike itufu ike nke ime mmụọ dị mkpa ma ọ bụrụ na okwukwe anyị niime Jizọs Kraịst aghọọ ihe ejighị kpọrọ ihe. Anyị nwekwara ike dịrị otu ahụ n’elu ahụ, mana na-enweghị okwukwe ime ime siri ike, anyị na-etufu ike anyị ime mgbanwe n’ụwa ma wepụta ihe kachasị mma niime ndị ahụ nọ anyị nso.
Ya mere olee ka anyị ga-esi chanelụọ ume na mbọ anyị iji weta ihe dị iche ma bụrụ mgbanwe ahụ ndị ụwa chọrọ taa? Kedụ ka anyị ga-esi chekwaa ị bụ ndị na-eso ụzọ ma gaaniihu ị bụ mmetụta ziri ezi?
Okwu niile nke onye amụma anyị hụrụ naanya ka na-ehi ụda n’uche m: “Chineke chọrọ ka anyị rụkọta ọrụ ọnụ ma nyekọrịtara onye na ibe ya aka. Nke ahụ bụ ihe kpatara O si zipụ anyị n’ụwa niime ezi na ụlọ ma hazie anyị niime ngalaba ukwu na stek niile. Ya mere O ji na-arịọ anyị ije ozi ma lekọta ibe anyị. Ya mere O ji na-arịọ anyị ibi ndụ niime ụwa mana abụkwala nke ndị ụwa ahụ.”
Mgbe ndụ anyị juputara na ebumnuuche na ije ozi, anyị na-ezere ịjụ oyi nke ime mmụọ; n’aka nke ọzọ, mgbe anapụrụ ndụ anyị ebumnuuche sinachi, ijere ndị ọzọ ozi bara uru, na ohere ndị dị nsọ maka ịtụgharị uche na ime nnyochasị, anyị na-eji nwayọ nwayọ enwe ihe ịra ahụ n’ikuta ume site niihe omume nke onwe anyị na ọdịmma nke onwe anyị, na-ọghọm nke itufu ụtọ anyị. Ajụire nye nke a bụ ịganiihu isonye n’ije ozi—inwe ọnụnụ ọkọ n’isonye n’ọrụ ndị dị mma na ọdịmma nke onwe anyị na ọha ebe anyị bi niime ya.
Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, lee ụdị ngọzi anyị niile nwere taa isonye na Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst ma nwee ohere ije ozi na Nzukọ nsọ Ya. Ọnọdụ anyị nwere ike gbaa iche iche, mana anyị niile nwere ike ime ihe dị iche.
Cheta marnotos, ndị ọrụ nnu; ha na-eji ihe ndị dị mfe iji kuputa kristal ndị kachasị mma, nnu kachasị mma! Anyị onwe anyị kwa nwere ike ime ụmụ ihe dị mfe nke mere na, site na mbọ na-eguzogide nomume ndị dị nta na ndị bara uru, nwere ike mikpuo ịbụ ndị na-eso ụzọ anyị bụ na mkpebi nye Jizọs Kraịst. Lee ụzọ anọ dị mfe ma otu ọ dị omimi ndị anyị nwere ike iji gbaa mbọ iji bụrụ nnu nke ụwa:
-
Idobe ụlọ nke Onyenwe anyị n’etiti nke nraranye anyị. Ugbu tempụl niile dị nso karịa ka ha dịịrị na mbụ, ibute ụzọ dowe ife ofufe n’ụlọ nke Onyenwe anyị esepụghị aka ga-enyere anyị aka lekwasị anya n’ihe kachasị mkpa ma tụkwasị ndụ anyị ị nọ niime Kraịst. Niime tempụl, anyị na-ahụta isi nke okwukwe anyị na Jizọs Kraịst na obi nke nraranye anyị nye Ya.
-
Ịkpachara anya na-anọgide na mbọ anyị ịgba ndị ọzọ ume site n’ibikọta ndụ ozi ọma ọnụ. Anyị nwere ike ịgba ndị ezi na ụlọ anyị ume site na mbọ ndị na-adịgide ma na mkpachapụ anya iji weta ụkpụrụ niile nke ozi ọma niime ndụ anyị na n’ebe obibi anyị.
-
Ịdị na njikere ịnabata ọkpụkpọ oku na ije ozi niime Nzụkọ nsọ. Ije ozi niime ọgbakọ ndị nọ niime obodo anyị na-enye anyị ohere iji kwadoo otu onye na ibe ya ma tokọta uto ọnụ. Ebe ije ozi na-anaghị adịcha mfe mgbe niile ọ na-akwụ ụgwọ mgbe niile.
-
Ma n’ikpeazụ, iji ebumnuuche eji ngwa ọrụ mkparịta ụka digital niile eme ihe. Taa ngwa ọrụ mkparịta ụka digital niile na-enye anyị ohere ijikọta ọnụ dị ka otu na-emetụbeghị mbụ. Dị ka ọtụtụ niime unu, ana m eji ngwa ndị a ejikọ ọnụ mụ na ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị na nzukọ nsọ na mụ na ezi na ụlọ m na ndị enyi. Dị ka mụ na ha na-ejikọ ọnụ, ana m adị ha nso karịa; anyị nwere ike lekọta onye na ibe ya anya n’oge mkpa mgbe anyị na-enweghị ike iru aka na-anụ ahụ. Ngwa ọrụ ndị a na-enweghị mgbagha bụ ngọzi, ma otu ọ dị ngwa ọrụ ndị a kwa nwerekwara ike ịdọpụ anyị site n’omimi nke mmekọrịta ndị bara uru ma mesịa butere anyị ịbụ ndị adọbara na agwa ndị na-ala oge anyị n’iyi n’ihe omume ndị na-enwechaghị isi. Ịgbasi mbọ ike na-ịbụ nnu nke ụwa gụnyere ihe ndị ọzọ buru ibu karịa ịpịgharị reels akwụsịghị akwụsị nọ na six-inch screen.
Dị ka anyị na-edobe ụlọ nke Onyenwe anyị ị nọ n’isi ndụ anyị, na-akpachara anya agba ndị ọzọ ume site n’ibi ndụ ozi ọma, nabata ọkpụkpọ oku ije ozi, ma jiri ngwa ọrụ digital niile na ebumnuuche dị mma, anyị nwere ike chekwaa ike dị mkpa nke ime mmụọ anyị. Dị nnọọ ka nnu n’ụdị ya kachasị ọcha nwere ike kwalite ma chekwaa, otu ahụ kwa ka okwukwe anyị niime Jizọs Kraịst si eme mgbe enyere ya ọzụzụ ma chekwaa ya site na ntinye n’ọrụ anyị nye ozi na ịhụnaanya dị ka Kraịst.
Dị ka anyị na-anọgide na njikọta nye Onyenwe anyị, ndụ anyị n’ụdị eke ga-egosị ihe Ya, ma anyị ga-aghọ nnu nke ụwa. Niime mbọ nke a, ọ bụghị naanị na anyị na-emeba ndụ anyị mana na-agbakwa ndị ezi na ụlọ anyị na obodo ndị anyị bi ume. Ka anyị gbaa mbọ jigidesie ike njikọta nke a anyị na Onyenwe anyị, ma hapụ itufu ụtọ anyị mgbe ọbụla, ma bụrụ obere, ntakịrị crystal nke nnu Onyenwe anyị chọrọ ka anyị bụrụ. Site n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.